Nnamdi Kanu news: Ọkaikpe sị ka gọọmentị kpọghachị ya mba Kenya

Ebe foto si, Reuters
Ọkaikpe Evelyn Anyadike nke ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia enyela Nnamdi Kanu, onyendu Indigenous People of Biafra (Ipob) mmeri n'ikpe dị n'etiti ya na Gọọmentị Naịjirịa.
Nke a bụ ikpe ekpere na Wenezde 26 Ọktoba, 2022, banyere akwụkwọ Kanu gbara Gọọmentị Naịjirịa akwụkwọ maka etu ha jiri nwuchie ya ma si na mba Kenya kpụlata ya na Naịjirịa n'ọnwa Juun afọ 2021.
Kanu gbara akwụkwọ sị ka ụlọikpe kwuo na ihe a gọọmentị mere 'megidere iwu ikike dịịrị onye nakwa mmekọrịta mba na ibe ha' nke otu United Nation.
Ọkaikpe Anyadike sị na gọọmentị etiti dara iwu maka inwuchi Kanu n'ike na mba Kenya, ịta ya ahụhụ nakwa ịkpọlata ya na Naịjirịa n'ụzọ na-ezighi ezi.
Ọkaikpe a nyere iwu ka gọọmentị kwụọ Kanu ego dị nde narị naịra ise (N500M) dịka ego iti aka n'obi maka agwa ha kpasoro ya.
Ọ gakwara n'ihu kwado ikpe ahụ ụlọikpe mkpegharị kpere n'Abuja na 13 Ọktoba 2022 bụ nke kachapụrụ ebubo e boro Kanu ma sị ka a tọhapụ ya.
Ọ sị ka Gọọmentị Naịjirịa kpọghachi Kanu na mba Kenya bụ ebe ha si kpọlata ya n'ike na Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Okaikpe Evelyn Anyadike wuchiri n'ụlọikpe a n'ihe dịka elekere 09:30 nke ụtụtụ, ebe ndị ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor na ndị ọzọ nọbu na-eche ya.
Ejimakor gbara akwụkwọ a n'aha Kanu gwara BBC Igbo na ikpe a na ọ bụ taa ka a ga-achabi ikpe banyere akwụkwọ 'extraordinary rendition' Kanu gbara Gọọmentị etiti.

Ejimakor sị na ọkaikpe Evelyn Anyadike anụchaala mkpesa ha nke ikpeazụ nakwa nzaghachị gọọmentị banyere akwụkwọ a n'ụbọchị anọ nke Ọktoba, 2022.
"Ụlọikpe anụchaala mkpesa anyị akpọrọ 'final hearing', taa ka a ga-ekpebi ikpe banyere nke a."
Ndị ọkaiwu na-anọchite anya Gọomentị Naịjirịa abịaghị n'ụlọikpe nke taa.

Ekwentị maọbụ kọmputa gị nwereike igbochi gị ịhụ ozi a









