Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’akwụkwọ ikpe ahụ nyere Nnamdi Kanu mmeri

Ikpe Nnamdi Kanu

Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu agbaala n’anwụ akwụkwọ ikpe ahụ nke ụlọikpe mkpegharị jiri nye Kanu mmeri.

Ọkaikpe Oludotun Adefope-Okojie kachapụrụ ebubo niile gọọmentị Naịjirịa boro Kanu ma sị na etu e siri si na mba Kenya kpọlata ye megidere iwu mbaụwa.

Mkpebi a pụtara na o nweghi ụlọikpe ọbụla na Naịjirịa nwere ike ikpe Nnamdi Kanu ikpe banyere ebubo ndị ahụ e boro ya tupu a kpọlata ya na Naịjirịa.

E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ agbakwụnyere n’ikpe ahụ ị ga-ahụta ebe a n’uju.

Ihe ji nkịta ọnwụ n'ịtọhapụ Nnmadi Kanu
Nnamdi Kanu na ọkaiwu ya

Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu, onye ndu Indigenous People of Biafra (IPOB) akọwaala etu obi dị Kanu maka mmeri ụlọikpe mkpegharị nyere ya n’ụbọchị 13 Ọktoba, 2022.

O kwuru nke a mgbe ọ na-akọwala njem nleta ha mere n’ụbọchị Mọnde ileta Kanu n’ụlọmkpọrọ ndị Department of State Service (DSS) dị n’Abuja.

Ejiofor sị na obi dị Kanu ụtọ mgbe ha ziri ya ozi maka mmeri ahụ ụlọikpe nyere ya.

“Obi jupụtara onye ndu Nnamdi Kanu n’aṅụrị mgbe m gwara na ụlọikpe akachapụla ebubo niile dị n’isi ya.

“Amaghị etu m ga-esi kọwaa ụdịrị obi ụtọ o nwere maka ozi ahụ, Mụ na ya bụrụ abụ mmeri n’ụlọmkpọrọ.

“Kanu nwere olileanya mana na-atụ anya isi n’ụlọmkpọrọ a pụọ na-egbughi oge.”

Ejiofor gara n’ihu kwuo na Kanu sị kelere ndị nkwado ya n’ụwa niile gbaa gburu gburu maka ekpere ọma ha na-ekpere ya.

Kedụ ihe ji nkịta ọnwụ n’ịtọhapụ Kanu?

Ifeanyi Ejiofor, ọkaiwu Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor

Ọkaiwu Ejiofor kwuru na ha natala akwụkwọ ikpe ahụ nyere Kanu mmeri n’ụbọchị Mọnde 17 Ọktoba 2022.

Ọ sị na ha ewere akwụkwọ ahụ ziga n’ụlọọrụ ọkaiwu gọọmentị etiti nakwa ndị ọrụ nchekwa DSS ka wee ike gụọ ya ma tọhapụ Kanu dịka ụlọikpe si nye iwu.

Ejiofor kwuru na ha na-atụ na ntọhapụ Kanu malite n’ụbọchị Tuzde 18 Ọktoba 2022 ma kwuo na gọọmentị enweghi ihe ọzọ ha nwereike ime karịa ịtọhapụ ya.

Ọ gara n’ihu kwuo na ikpe a ụlọịkpe mkpegharị nyere karịrị ihe a kpọrọ ‘aquittal’ bụ nke gọọmentị gbakwasịrị ụkwụ.

“Ikpe a kwuru na o nweghi ụlọikpe ọbụla nwere ike ikpe Kanu ikpe banyere ebubo niile ndị ahụ akachapụrụ n’ihi ya.

“Gọọmentị enweghi ike ime ihe ọzọ karịa ịtọhapụ Kanu, ọ bụrụ na ha emeghi nke a, anyị ga-ama ihe ọzọ iji hụụ na ha rubereisi n’ikpe a.”

Ejiofor gwara Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o rubeisi n’iwu a ebe ọ sị na ọ chọghị itinye aka n’ihe banyere ikpe Kanu.

Ihe gọọmentị Naịjirịa kwuru

Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu Naịjirịa

Ebe foto si, Abubakar Malami

Ọkaiwu ukwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami kwuru na mkpebi ụlọikpe mkpegharị nyere nke sị na ikpe amaghị Kanu apụtaghị ka ọ lawa.

Malami kwuru na ụlọọrụ ya ga-enyocha mkpebi ahụ mara etu ha ga-esi eso ya.

N'otu aka ahụ, ọgbakọ Gọọmentị etiti na-ahụ maka nchekwa bụ ‘National Security Council’ kwadoro Malami kwuru sị na okwu Nnamdi Kanu ebibeghị.

Cheta na ụbọchị Tọzde 13 Ọktoba, 2022 ka ụlọikpe mkpegharị nọ n'Abuja kachapụrụ ebubo niile nke Gọọmentị Naijiria boro Kanu.