Buhari kpaa agwa ka nna ma tọhapụ Nnamdi Kanu – Ndị omeiwu Southeast

Ndị ụlọ nnọchiteanya n'ụlọomeiwu nta Naịjirịa si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ arịọla Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ tọhapụ Nnamdi Kanu.
Akwụkwọ nke omeiwu Tobi Okechukwu tinyere aka na ya sị ka Buhari kpaa agwa dị ka onye nna ọ bụ ma hapụ Kanu.
Ndị otu a gbakwasịrị ụkwụ n’iwu ụlọikpe mkpegharị nyere bụ nke kachapụrụ ebubo niile gọọmentị Naịjirị boro Kanu.
N’otu aka ahụ ha gbakwasịkwara ụkwụ n’ihe gọọmentị etiti kwuru na ha ga-esi ụzọ ọzọ leba anya ikpe ahụ anya.
Ha kwuru na ọgbaghara dị na mpaghara Naịjirịa dị iche iche gụnyere Ọwụwa Anyanwụ, na ntọhapụ Kanu ugbua ka eme ka obodo dajụọ.
Ha kwuru na ikpe a ụlọikpe nyere bụ ohere dịịrị gọọmentị etiti iji gboo nsogbu banyere okwu Nnamdi Kanu.
Ihe anyị rịọrọ Buhari ọ jụ inye anyị, ụlọikpe enyela anyị ya - Mbazulike Amaechi

Otu okenye Igbo ọnụ na-eru n'okwu ma bụrụkwa onye bubu minista na-ahụ maka njem ụgbọelu egosipụtala obi ụtọ ya na mkpebi ụlọikpe ,kpegharị nyere ka a tọhapụ Nnamdi Kanu ka ọlawa n'ikpe metụtara iyi ndụ egwu.
N'ụbọchị Tọzde, Ụlọikpe Mkpegharị nọ n'Abuja nyere ntuziaka ka a tọhapụ Nnamdi Kanu si na ikpe amaghị ya n'ikpe ebubo iyi ndụ egwu nke Gọọmentị Naijiria wetara megide ya.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụlọikpe ahụ nke Jummia Hannatu Sankeey nọ n'isi ya, kụchapụrụ ebubo nile ndị gọọmentị Naịjirịa boro Nnamdi Kanu, si na ụzọ ha si kpụlata ya megidere iwu Naijiria na nke mbaụwa.
Na mkparịtaụka BBC Igbo na Mbazulike nwere n'ekwentị taa bụ Fraide, o kwuru sị na mkpebi " gosiri na ndị mmadụ nwekwara ike ịtuwasi n'ụlọikpe Naijiria".
O kwuru sị: "Ihe anyị na-eche bụ ka anyị mara ihe gọọmentị n'onwe ha ga-emekwa."
"Mana ụlọikpe ndị Naijiria ekwuola. Ndị ọkaikpe atọ gbakọtara aka kwuo.
"Ọ bụ ihe aṅụrị maka na ọ bụ ihe obodo na-achọ. O juru ndị Naijiria afọ na ụlọikpe nwere ike kwụụ ọtọ kwuo ezi okwu."
Mbazulike Ọ gara n'ihu kwuo na ụlọikpe enyela ndị Ọwụịwa Anyanwụ ọchịchọ ha rịọburu Buhari banyere Kanu.
"Anyị jeburu rịọ Onyeisiala ka ọ hapụ Nnamdi Kanu, ka anyị kwuo ekpe ya bụ ikpe n'ala,
Ọ sị na ọ bụ ụlọikpe ka ya mma. Ụlọikpe ekwuola ugbua , ka anyị mara ihe ọ ga-eme."
Cheta na dịka ụlọikpe nyere mkpebi ya, Ọkaiwu Gọọmentị etiti bụ Malami kwuru na ya bụ okwu ebibeghị, na ha na-enyocha mkpebi ahụ iji mara ụkwụ ọzọ ha ga-azọpụ.
Mmeri Nnamdi Kanu bụ mmeri ndị Igbo na ndị nile a na-akpagbu- Ohaneze

N'otu aka ahụ, Otu Ohaneze Ndigbo egosipụtala obi ụtọ ha na mkpebi nke Ụlọikpe.
Ọhaneze kwuru na mmeri Kanu n'ụlọikpe ga-ewelite Naijiria n'anya mba ụwa dịak o wetara oke ọṅụ na mpaghara dị iche iche na Naijiria.
Onyeisi Ohaneze bụ George Obiozor bụ onye kwụpụtara nke a n'akwụkwọ mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonna binyere aka ma wepụta n'ụbọchị Fraide.
Ọ sịrị," Mkpebi a ga-ebulite etu ụwa sị ahụ Naijiria."
"Ọ bụ ihe ọma mere ọchịchị onyekwuoucheya na Naijiria ma bụụ ihe na-egosi na mma dị n'ihu."
" Nnamdi Kanu na-egosi mkpagbu na mmegbu megide ndị Igbo. N'otu aka ahụ otu nile a na-emegbu emegbu na Naijiria."
Ọ gara n'ihu kwuo na o teela Obiozor kwuwere na nnjichi Gọọmentị jichiri Kanu bụ ikuku ọjọọ enweghị onye ọ dị mma n'ahụ dịka o butere nsogbu 'nọrọn'ụlọ' ụbọchị Monde ọbụla, mmanye nke ndị ojiegbe na-amanye ndị mmadụ isonye nakwa ogbochi okporoụzọ e tinyechara n' akụkụ dị iche n'Ọwụwa Anyanwụ na ne kwur nde ngwaahịa emebielerela n'ihi obi adịghị mma metụtara okwu Kanu.
O Ọ kọwara na ọ bụ obi adịghị mma maka ọnọdụ ndị a mere ka mkpebi ụlọikpe tọọ ndị mmadụ ụtọ nke ukwuu.
Ụlọikpe sị Kanu na ịkpe amaghị ya, ọ bụghị ya lawa - Malami

Ebe foto si, Malami/BBC
Ọkaiwu Ukwu Naijiria bụ Abubakar Malami ekwuola na mkpebi ụlọikpe mkpeghari nyere nke sị na ikpe amaghị onyendu otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụ Nnamdi Kanu, apụtaghị ya lawa be ya.
N'ụbọchị Tọzde, abalị 13, nke ọnwa Oktoba, Ụlọikpe Mkpegharị nọ n'Abuja nyere ntuziaka ka a tọhapụ Nnamdi Kanu si na ikpe amaghị ya n'ikpe ebubo iyi ndụ egwu nke Gọọmentị Naijiria wetara megide ya.
Ụlọikpe a gara n'ihu kwuo na ntọọ a e si mba Kenya tọọrọ Kanu lọta megidere iwu Naijiria na nke mba ụwa.
Ụlọikpe ahụ nke Jummia Hannatu Sankeey nọ n'isi ya, kụchapụrụ ebubo asaa fọrọ n’ebubo ndị gọọmentị Naịjirịa boro Nnamdi Kanu.
Mana na ịsa mkpebi ụlọikpe ahụ, Malami kwuru na ụlọrụ ya ga-enyocha mkpebi ahụ mara etu ha ga-esi eso ya.
Malami, kwuru na okwu metụtara ikpe Nnamdi Kanu malitere tupu e si Kenya kpọlata ya.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Umar Gwandu zipụtara, ọ sị
" Ka o doo ewu na ọkụkọ anya, na a sị Kanu na ikpe amaghị ya mana ọ bụghị ya lawa."
“Mkpebi a nke ụlọikpe mkpegharị metụtara nanị ihe gbasara ịkpọlata ya."
“Ọ dị mkpa na o were ọha ndị mmadụ anya na ekpebeghị okwu ndị dị tupu Kanu agbaa ọsọ."












