Ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe n'Aba maka Nnamdi Kanu

Ngagharịiwe maka Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Twitter

Ọtụtụ mmadụ pụtara n'igwe n'ụbọchị Fraịde, abalị anọ nke ọnwa Nọvemba, n'Aba, Abia Steeti, ime ngagharịiwe maka Mazi Nnamdi Kanu onye nọ na mkpọrọ.

Nke a na-abịa dịka ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Mike Ozekhome (SAN) na IfeanyiEjiofor, wepụrụ akwụkwọ mkpesa n'ụlọikpe kachasị bụ 'Supreme Court' gbasara etu gọọmentị si jụ ịtọhapụ ya n'agbanyeghị na ụlọikpe mkpegharị akụchapụla ebubo niile gọọmentị na-ebo ya.

Ndị na-eme ngagharịiwe a pụtara n'okporoụzọ Aba/Port-Harcourt, buruchaa akwụkwọ ebe ha dere ihe bụ iwe ha ma na-agụ egwu otito maka Kanu.

Ha kwuru na ebe ọ bụ na ụlọikpe ekwuola na njide gọọmentị Naịjirịa jidere Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjiria megidere iwu, gọọmentị kwesịrị irube isi na mkpebi ụlọikpe ma tọhapụ Kanu.

Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob, ma bụrụkwa onye gọọmentị Naịjirịa ji eji ugbua maka ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata iji chụtuo ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa.

Mkpebi ụlọikpe dị icheiche gbasara Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu

N'ụbọchị 13 nke ọnwa Ọktoba 2022 ka ụlọikpe mkpeghaị dị n'Abuja kụchapụrụ ebubo iri na ise nke gọọmentị Naịjirịa boro Nnamdi Kanu.

Ụlọikpe ahụ kwuru na gọọmentị agbasoghị usoro ziri ezi iji jide Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa.

Nke a pụtara n'ebubo ọbụla ha na-ebo ya achịtaghị aja maka na mmadụ agaghị arụkwasị ihe ọbụla n'elu ihe efu.

Mana ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami kwuru na ha ga-ewepụ mkpesa n'ụlọikpe kachasị iji gbaghaa ntọhapụ ụlọikpe mkpegharị tọhapụrụ Kanu.

Ọzọkwa, n'ụbọchị 26 nke ọnwa Ọktoba, ụlọikpe dị n'Umuahia nyere mkpebi banyere mkpesa Kanu wetara megide Gọọmentị Naịjirịa maka etu ha jiri nwuchie ya na mba Kenya ma kpụlata ya na Naịjirịa n'ọnwa Juun afọ 2021.

Ọkaikpe kpere ikpe ahụ bụ Evelyn Anyadike kwuru ka gọọmentị kpọghachi Kanu na mba Kenya ebe ha nọ jide ya, ma kwụọ ya nde naịra narị ise (N500m) iji tie ya aka n'obi.

Chetakwa na ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor agbabuola gọọmentị akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia gbasara etu ndị agha Naịjirịa si wakpo ụlọ Mazi Nnamdi Kanu n'afọ 2017, nke mkpatara o ji gbaa ọsọ ndụ pụọ na Naịjirịa.

Okaikpe Benson Anya onye kpebiri ikpe ahụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2022 kwuru na gọọmentị megidere ikike dịịrị Nnamdi Kanu, ma nye iwu ka a kwụọ ya otu ijeri naịra iji kasie ya obi.

Nnamdi Kanu na otu IPOB

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nnamdi Kanu hibere ma bụrụ onye ndu otu a ma dịka Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012.

Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ Biafra.

Nke a abụghị ihe ọhụrụ; n'afọ 1967 mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kewapụrụ ma kpọọ onwe ha Biafra, nke butere nnukwu agha a lụrụ ihe ruru ọnwa iri atọ.

Agha ahụ tara isi ihe karịrị mmadụ nde abụọ, mana oge ya bụ agha kwụsịrị na 1970, Naịjirịa meriri Biafra nke pụtara na mpaghara ahụ ka bụkwa Naịjirịa ruo ugbua.

Mana n'afọ 2009, Nnamdi Kanu malitere iji ụlọ mgbasaozi Redio Biafra nke dị na London na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa, ma na-akpọ oku nkewapụ Biafra.

Gọọmentị Naịjirịa mechara jichie Kanu n'afọ 2015, ma kpụpụ ya ụlọikpe n'ebubo na ọ chọrọ ịkwatu ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjiria.

A tọhapụrụ ya nwa mgbe nta n'afọ 2017, mana ọ gbapụrụ na Naịjirịa dịka ndị agha wakporo ụlọ ya dị n'Afaraukwu, Umuahia, Abia Steeti.

N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.

N'ọnwa June 2021, gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ụlọikpe.

Ya bụ ikpe ka na-aga n'ihu ugbua.