Nnamdi Kanu agwala ndị ọkaiwu ya ka ha gaa n'ihu wepụ ikpe ya n'ụlọikpe kachasị

Ebe foto si, Reuters
Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Indigenous People of Biafra, Ipob, agwala ndị ọkaiwu ya ka ha gaa n'ihu wepụ ikpe ya na gọọmentị etiti n'ụlọikpe ekpechaa ọ gwụ.
Ifeanyi Ejiofor, otu n'ime ndị ọkaiwu Kanu, kwuru nke a ụnyaahụ bụ Mọndemgbe ọ gachara ileta Kanu n'ụlọmkpọrọ ndị DSS.
Ejiofor, onye dere nke a n'akara Twitter ya sị, "Agara m ịhụ onye ndu taa n'ụlọọrụ ndị DSS dị n'Abuja, ịkọrọ ya mpụtara ụlọikpe mkpegharị nwere n'isi ya ụbọchị Fraịde maka ijitukwu ya n'ụlọmkpọrọ.
Onyendu egbughị oge n'inye anyị ikike ịga n'ụlọikpe kachasị inweta ikpenkwụmọtọ ka a tọhapụ ya."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nnamdi Kanu ga-aga n'ihu nọrọ n'ụlọ nga DSS - Ụlọikpe Mkpegharị
Ụlọikpe mkpegharị nke Abuja anabatala mkpesa ‘stay of execution’ nke gọọmentị etiti Naịjirịa buteere ha ka Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) gaa n’ihu nọrọ n’ụlọ nga DSS.
Na mpụtara ikpe a e kpere n’ehihe ụbọchị Fraịdee bụ ụbọchị 28 nke ọnwa Ọktoba, ọkaikpe Haruna Tsanammi nyere iwu ka e wegara ụlọikpe kachasị mpụtara ikpe ahụ ngwa ngwa tupu abalị asaa agacha.
Nke a pụtara na Kanu ga-aga n’ihu n’ịnọ n’ụlọ nga ndị ngabala uweojii Naịjirịa pụrụiche bụ Department of State Services (DSS) ruo mgbe ụlọikpe kachasị nụchara mpụtara ikpe a dịka ọkaikpe Tsanammi siri nye n’iwu taa bụ Fraịdee.
Cheta na ụlọikpe mkpegharị a n’ụbọchị 13 nke ọnwa Ọktoba nyere kwu ka a tọhapụ Nnamdi Kanu ma kụchapụ ebubo 15 niile gọọmentị etiti Naịjirịa boro ya nke gụnyere ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata nkụsa ọchịchị Naịjirịa.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị ọkaikpe atọ kpere ikpe a n’Ụlọikpe mkpegharị n’ụbọchị ahụ kwuru na gọọmentị etiti Naịjirịa enweghị ikike ibo Kanu ebobo ndị ahụ maọbụ maa ya ikpe n’ihi na usoro ha si ‘tọrọ’ si na mba Kenya lọghachịte ezighi ezi ma daa iwu Naịjirịa nakwa iwu mba ụwa.
Ha kwukwara na ebubo ndị gọọmentị etiti Naịjirịa boro Kanu ekwepụtaghị oge Kanu dara iwu, ebe ọ nọ daa iwu nakwa udịrị iwu ndị ha sị ọ dara tupu e si n’ụzọ ezighi ezi ‘tọrọ ya’ lọghachite Naịjirịa.
Mana igbaghaa mpụtara ikpe a, gọọmentị Naịjirịa mere mkpesa ‘stay of execution’ nke rịọrọ ka a ghara ịtọhapụ Kanu ruo mgbe ha bugachara ikpe ha gaa ụlọikpe kachasị.
Ọkaikpe Tsanammi kwukwara na mkpesa ndị ọkaiwu Kanu mere zubere igbochi nke a ezighi ezi.
Ọ gara n’ihu nabata mkpesa gọọmentị ka a gaa n’ihu jichie Kanu ruo mgbe ụlọikpe mkpegharị nụchara mkpesa gọọmentị etiti nwere banyere mpụtara ikpe ya n’ụlọikpe mkpegharị.
Otu n'ime ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor zipụtara ozi n'ehihe Friadee ma kwuo na ha natara ozi ikpe a n'ehihe a nke a bụ na o danyere na ntụnye n'akụkụ ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Maxwell Opara
Cheta na e kpere ikpe mkpesa 'stay of execution' a n'ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị 24 nke ọnwa Ọktoba.
Ọtụtụ mmadụ jụrụ ihe kpatara ikpe Mazi Nnamdi Kanu na gọọmentị Naịjirịa ji bụrụ n'ụlọikpe mkpegharị kama ịdị n'ụlọikpe kachasị bụ ebe ha che e kwesịrị ibuga ikpe mgbagha ahụ.
Ndị mmadụ chebu na gọọmentị etiti ewepụla ya bụ okwu n'ụlọikpe kachasị, ebe ọ bụ na ụlọikpe mkpegharị kụchapụrụ ebubo niile gọọmentị boro Kanu.
Mana otu n'ime ndị ọkaiwu Kanu bụ Maxwell Opara kọwaara BBC Igbo na ikpe nke ahụ bụ nke a na-akpọ 'stay of execution'.
Ọ kọwara na ọ bụ n'ụlọikpe ebe a nọ nye mkpebi nke mbụ ka a ga-anọkwa tulee okwu gbasara 'stay of execution'.
Gịnị bụ 'stay of execution'?

Ebe foto si, Thinkstock
Ọ bụrụ na otu ụlọikpe kpebie ikpe, mana otu n'ime ndị ikpe ahụ gbasara enweghị afọojuju maka mkpebi ahụ, onye ahụ nwere ikike iwere ya bụ okwu gaa n'ụlọikpe ogoogo ya karịrị ụlọikpe nyere mkpebi ahụ.
Mgbe nke a mee, onye ahụ ga-ewega akwụkwọ n'ụlọikpe nyere mkpebi ahụ na-arịọ ha ka ha nye iwu ka a kwụsịgodu mkpebi ahụ ha nyeburu, ruo mgbe ụlọikpe ogoogo ya ka ga-ekpebi ya bụ ikpe.
Ọ bụ nke a ka a na-akpọ 'stay of execution'.
Dịka ọkaiwu Maxwell Opara si kọwaa, "ọ bụ n'ụlọikpe nyere mkpebi nke mbụ ka a ga-anọkwa kpebie ihe gbasara 'stay of execution'."
"Ọ bụ ya mere ikpe Nnamdi Kanu nke taa ji bụrụ n'ụlọikpe mkpegharị ọ bụghị ụlọikpe kachasị."
Mana ọkaiwu Maxwell kwuru na gọọmentị etiti na ndị ọkaiwu ha ma ụma achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jigide Mazi Nnamdi Kanu na mkpọrọ.
O kwuru na mkpesa gọọmentị etiti wegara n'ụlọikpe kachasị gbasara ikpe Nnamdi Kanu ezubeghị oke, n'ihi na ha enwetabeghị akara njirimara gosiri na mkpesa ha ezuola oke.
"Iwu kwuru na mkpesa gị ga-ezuriri oke n'ụlọikpe kachasị tupu itinye akwụkwọ maka 'stay of execution. Ma ọ bụghị otu a, oge ka ị na-egbu," Maxwell Opara kọwara.
Etu ndị eze ọdịnala Umuahia si wuchie n'ụlọikpe ịkwado Nnamdi Kanu

Ndị eze ọdịnala si n'obodo dị icheiche na mpaghara Umuahia bịara n'ozuzu oke n'ụlọikpe mkpegharị n'ụbọchị Mọnde ahụ iji gosi nkwado ha maka nwa ha nwoke bụ Mazi Nnamdi Kanu, onye gọọmentị etiti na-ebo ebubo iyi ndụ egwu na ihe ndị ọzọ.
Ndị eze a dị isii n'ọnụọgụgụ kwuru na ha na-arịọ ka gọọmentị rube isi na mkpebi nke ụlọikpe mkpegharị nyere, ma tọhapụ Mazi kanu ka ọ laa.
Ha gụnyere Eze Innocent Nwaigwe - onye bụ odeakwụkwọ otu ndị eze n'okpuru ọchịchị Umuahia North; Eze Eddy Ibeabuchi - bụbu onyeisi otu ndị eze n'Umuahia North; Eze Iheanyichukwu Ezigbo - onyeisi ndị eze Ibeku; Eze Nnamdi Ofoegbu - onyeisi ndị eze na mpaghara Ohuhu; Eze Ben Oriaku - nke okpuruọchịchị Ikwuano; na Eze Philip Ajomiwe - bụbu onyeisi ndị eze na mpaghara Umuahia North.

Ha yicha uwe ndị eze ha ma nọrọ n'ụlọikpe dịka ikpe na-aga n'ihu.
Ikpe nke taa bụ nke gọọmentị etiti ji ayọ ụlọikpe mkpegharị ka ha nye iwu ka akwụsịgodu mkpebi nke ha nyeburu gbasara ịkụchapụ ebubo niile a na-ebo Mazi Kanu, ma tọhapụ ya ka ọ laa.
Ihe ndị dị mkpa banyere ikpe mkpesa 'stay of execution' a

Ọkaipe ji ikpe Nnamdi Kanu na Gọọmentị etiti n'ụlọikpe kachasị dị n'Abuja yigharịrị ụbọchị ọ ga-achabi ikpe ahụ.
Ọkaikpe Haruna Simon Tsammeni kwuru nke a mgbe ọ nụchara mkpesa gọọmentị mere megide Nnamdi nakwa nzaghachị ndị ọkaiwu Kanu nyere n'ụlọikpe ahụ.
O kwughi kpọmkwem ụbọchị ọ ga-achabi ikpe ahụ mana ọ sị na ọ ga-eme ka ndị ọkaiwu gọọmentị nakwa ndị nke Mazi Kanu mata ụbọchị ọ ga-abụ.
Ihe ọkaiwu gọọmentị gwara ụlọikpe
Ọkaiwu gọọmentị etiti ekwuola na ihe mere gọọmentị jiri jụụ ịtọhapụ Nnamdi Kanu bụ maka na o nwere ike ịgba ọsọ.
Ọkaiwu David Kaswe kwuru ya n'ụlọikpe dịka ha na-arịọ ka ụlọikpe kachasị kagbuo iwu ụlọikpe mkpegharị nyere sị ka a tọhapụ Kanu.
Nzaghachị ọkaiwu Kanu nyere
Mana ndị ọkaiwu Kanu bụ Mike Ozekhome sị ka ụlọikpe kachasị kachapụ atụmatụ a.
Ọ gara n'ihu kwuo na ihe mere gọọmentị ji gbaa akwụkwọ a bụ iji mezuo ihe turu n'ọnụ "na ha enweghi ike ịtọhapụ Kanu".
Ozekhome sị na ntọhapụ Kanu ga-ewete udo na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, kama ọ gbaghara dịka gọọmentị etiti si ebo ebubo.
Ọ sị na iwu ụlọikpe kachasị megidere itinye ọnụ n'ihe a kpọrọ 'stay of execution' banyere ikpe ime mpụ a kpọrọ 'criminal case'.
Ọ kwuru na ahụ adịghị Nnamdi Kanu nakwa ọ naghị enwete ezi nlekọta ahụike na mkpọrọ ọ nọ.
N'okwu banyere ịgba ọsọ, Ozekhome sị na Kanu agbaghị ọsọ kama na ọ bụ ndịagha Naịjirịa wakporo ụlọ ya dị n'Umuahia n'afọ 2017 ma gbuo ihe ruru mmadụ iri abụọ na asatọ.

N'ụbọchị ahụ ọkaikpe ji ikpe dị n'etiti Nnamdi Kanu, onyendu Indigenous People of Biafra (Ipob) na gọọmentị agbatịala ikpe gbatịrị oge ikpe ahụ ruo elekere 12 nke ehihie.
Ọ sị na o mere nke a iji nye ohere ka ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu na nke Gọomentị hazie nghọtahie dị n’akwụkwọ ha gbara onwe ha nke ọma.
Ndị ọkaiwu gọọmentị sị na ha gbara ndị ọkaiwu Kanu akwụkwọ n'izu gara aga mana ndị ọkaiwu Kanu zaghachịrị akwụkwọ ahụ n’ụbọchị Fraịde.
N’otu aka ahụ n’ụtụtụ Mọnde ahụ bụ ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba, ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu gbakwara akwụkwọ ọzọ ma tinye aha ndịagha Naịjirịa n’akwụkwọ ahụ.
Nke a mere ndị ọkaiwu gọọmentị jiri sị ka e buga ikpe ahụ n’ụbọchị ọzọ ka ha nweeike mee nyocha ha nke ọma.
Ọkaikpe a jụrụ ajụ ma nwee ha awa ole na ole iji eme nke a ma lọghachị n’ụlọikpe n’elekere iri na abụọ nke ehihie taa.
Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu, gụnyere Mike Ozekhome, Ifeanyi Ejiofor na ndị ọzọ ebe ọkaiwu gọọmentị bụ David Kaswe na ndị ọzọ.
Na-agbanyeghi na ikpe ahụ dị n’aka ụlọikpe kachasị mana ebe a na-ekpe ya bụ n’ụlọikpe mkpegharị dị n’Abuja.

Ihe ndị mmadụ tụrụ anya n'ikpe nke ụbọchị ahụ

Cheta na ụlọikpe mkpeghari kwuru na etu gọọmentị Naịjirịa si ga tọrọ Mazi Nnamdi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya n'ike na Naịjirịa adabaghị adaba n'iwu Naịjirịa nakwa nke mba ụwa.
N'ihi nke a, ndị ọkaikpe nke ụlọikpe mkpegharị kpebiri na ebubo niile gọọmentị boro Kanu achịtaghị aja, mkpọchi a kpọchiri ya n'ụlọ mkpọrọ ekwesịghị ekwesị.
Otu ihe a na-atụzi anya ya bụ na gọọmentị etiti na ndị ọkaiwu ha ga-eweta ihe akaebe ha ga-egosi ụlọikpe kachasị iji kwuo na mkpebi nke ụlọikpe mkpegharị adabaghị adaba.
Nke abụọ, Onyeisi ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami ekwubuola na naanị ihe ụlọikpe mkpegharị kpebiri n'ụbọchị Ọktoba 13 bụ okwu gbasara etu e si kpụlata Mazi Kanu na Naịjirịa, ọ bụghị ihe gbasara ebubo ndị e boro ya.
Malami kwuru na ebubo e boro Kanu bụ ihe dịwara kamgbe afọ 2017, tupu Kanu agbaa ọsọ pụọ na Naịjirịa.
Ya mere, Malami na-ekwu na Kanu ka kwesịrị ịnọ na mkpọrọ ruo mgbe a ga-ekpebi ikpe ebubo ndị ahụ e jibu maka ya malite ikpe ya ikpe na 2017.
A na-atụ anya na ụlọikpe kachasị ga-etinye okwu a ọnụ ma kpebie ma ihe Malami kwuru ọ dabara adaba.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Nke atọ, ndị ọkaiwu Mazi Nnamdi Kanu bụ Mike Ozekhome (SAN), na Ifeanyi Ejiofor, na-ekwu na ọ bụrụgodu na gọọmentị etiti chọrọ iwega okwu ahụ n'ụlọikpe kachasị, ha kwesịrị ibu ụzọ rube isi na mkpebi nke ụlọikpe mkpegharị.
Nke a pụtara na ha kweịsịrí ịtọhapụgodu Mazi Kanu dịka ụlọikpe mkpegharị si nye iwu, tupu ha ewegazie mkpesa nke ha n'ụlọikpe kachasị.
Ọ bụrụ na ndị ọkaikpe n'ụlọikpe kachasị kwenye n'ihe ndị ọkaiwu Mazi Kanu na-ekwu, ọ pụtara na ha ga-enye gọọmentị Naịjirịa nakwa ndị nchekwa DSS iwu ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu, tupu e kwuwe ihe ọbụla ọzọ gbasara okwu a.
O dobeghị anya ma ụlọikpe kachasị a ga-ekpebi ikpe a echi. Etu ụdị okwu si adị na mbụ bụ na a ga-ewepụta otu ụbọchị nke ndị wetara okwu ga-eji nye mkpesa nakwa ọsịsa ha, mana mkpebi ikpe ga-abụ n'ụbọchị ọzọ.
BBC Igbo ga-anọ kwụrụ chịm n'ụlọikpe kachasị iwetara gị etu ihe niile ga-esi gaa.
Etu Ụlọikpe mkpegharị si kụpụ ebubo 15 gọọmentị boro Nnamdi Kanu

Ụlọikpe mkpegharị nke Abuja akụchapụla ebubo ndị fọrọ n’ebubo ndị gọọmentị Naịjirịa nwere n’isi Nnamdi Kanu bụ onyendu otu the Indigenous People of Biafra (Ipob).
N’ikpe a ekpere n’ụbọchị Tọọzde bụ ụbọchị 13 nke ọnwa Ọktoba, 2023 nke ọkaikpe Jummia Hannatu Sankeey nọ n'isi ya, ya ndị ọkaikpe abụọ ọzọ kwuru na nwụchị Nnamdi Kanu na mba Kenya na mkpọghachịte ya na Naịjirịa megidere iwu.
Ndị ọkaikpe ahụ nyere iwu ka a tọhapụ Kanu dịka ha kwusiri ike na nnwuchi ya megidere iwu.
Cheta na gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Kanu n’afọ 2021 na mba Kenya ma bọkwasị ya ebubo 15 nke gụnyere ebubo ịkpa nkata ikposa ọchịchị Naịjirịa.









