'Ị ga n'ihu jichie Kanu gosiri na Buhari ejighị Igbo kpọrọ ihe'

Ebe foto si, Ikenga Ugochinyere/Getty images
Ọnụ na-ekwuru otụ jikọrọ ndị pati na-anoghị na gọọmentị bụ Ikenga Ugochinyere ekwuola na nkwechiri Onyeisiala Mohammadu Buhari kwechiri, jụ ịtọhapụ Nnamdi Kanu na-egosi na o nweghị ihe o ji ndị Igbo kpọrọ.
N’ozi o wepụtara ụbọchị Fraide, Ugochukwunyere kwuru na ọ tara ọjị anya ị ga n'ihu jide kanu na-agbanyeghị na ụlọikpe atọ ekwuola ka atọhapụ ya.
Ugochinyere sịrị,“Eji m obi mwute ele etu Gọọmenti Etiti si jide Kanu na-agbanyeghị mkpebi ụlọikpe atọ nyerela ka a tọhapụ ya.
“ Ihe ihe na-egosi bụ na Onyeisiala Buhari na-akpo ndị Igbo ndị iberirbe.”
“ Ọ bụ ihe ịtụnanya na Onyeisiala na-akwado ihe ndị ụlọọru ya na ngalaba gọọmentị na-eme na-agbanyeghị na o kwuru na ọ bụ ụlọikpe ga-ekwu ihe ga-eme n’okwu Nnamdi Kanu.”
“ Agwa gọọmentị bụ ihe ịrụnye Igbo ọkachasị ndị eze ọdịnala nakwa ndị isi ụka ndị garala rịọ ya ugborougboro kama ọ gbaa isi akwara sị na ọ bụ ụlọikpe ga-ekpe ya bụ okwu.”

Ebe foto si, Ikenga Ugochinyere
Ugochukwu nyere kwuru na “akpọmasị” a nakwa akwanyeghị Ugwu a naghị akwanyere ndị Igbo gaa n’ihu na ọ ga-eme ka ndị Igbo malite inye ọsịsa n’ụzọ ga-egosi iwe ha.
Ihe anọ mere Gọọmentị Etiti agaghị ahapụ Nnamdi Kanu fịam - Malami

Ebe foto si, Reuters
Ọkaiwu ukwu Naijiria bụ Abubakar Malami ekwuola na ịgbaso iwu na usoro iwu so na ihe mere na Gọọmentị Naijirịa achọghị ịtọhapụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu, na agbanyeghị na Ụlọikpe Mkpeghari gbadoro ụkwụ na usoro 'ntọọrọ a tọrọ ya' na mba Kenya dara iwu ma nye ntuziaka ka a tọhapụ ya.
Na mkparịtaụka Malami na ụlọntaakụkọ Vanguard nwere ụbọchị Tọzde, Malami kwuru na 'ntọrọ e si Kenya tọọrọ Kanu' akagbughị ịda iwu niile nke Gọọmentị Naijiria boro ya.
Ọ rụtụrụ aka n'ihe anọ mere o ji kwuo ihe o kwuru: "N'ikpebi ma a ga-atọhapụ ya maọbụ na-agaghị atọhapụ ya bụ nke mbụ: ị ga-ele anya na usoro iwu. Nke abụọ: Ị ga-ele anya n'ọdịmma ọha nakwa ọdịmma Naijria; Nke atọ, ị ga-ele anya n'ọnọdụ nchekwa. Nke anọ: Ị ga-ele anya na mmekọrịta mba na mba."
N'okwu ịgbaso usoro iwu, Malami kwuru na okwu ahụ bụ okwu onye a hapụrụ lka ozi n'ụlọ na-abịa ụlọikpe, ọ gbapụ ọsọ, gbaga mba ọzọ nke ọ sị pụtara na ikpe ịgbapụ ọsọ n'elu ebubo mpụ na-eche ya.

N'okwu nchekwa, Malami kwuru na Kanu bụ onye na-azara ọnụ ya maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị, ịkpalite ndị mmadụ mewe tigbuo-zọgbuo, igbu ọchụ na imebi ikike ndị ọrụ obodo nke okwu bụ mpụ metụtara nchekwa obodo.
N'okwu mmekọrịta mba na mba ọzọ, o kwuru na Kanu bụ onye nọ na mba ọzọ, na-emegide ala ọzọ bụ ala nna ya. "Ya mere, i soro ụzọ iwu gosiri na e nwere ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị, igbu mmadụ, ịgba ọsọ na ihe ndị ọzọ, na imeriri n'otu n'ime ha, gosiri na otu okwu ab ughị okwu a ga-akwụ na ya were kpebie ma a ga-atọhapụ gị maọbụ na agaghị atọhapụ gị."
Cheta...

Cheta na nsonso a, Ụlọikpe Mkpegharị gbadoro ụkwụ na ntọrọ a tọọ Kanu na mba Kenya dara iwu, ma nye iwu ka a tọhapụ Nnamdi Kanu n'akwụkwọ nke Gọọmenti Etiti gbara ya maka ebub metụtara iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị.
Ụlọikpe ahụ kwuru na ntọrọ atọrọ Kanu megidere iwu Naijiria na nke mba ụwa.
Ngwangwa ụlọikpe ahụ nyere iwu ahụ, Gọọmentị Etiti gara gbagharịa akwụkwọ n'Ụlọikpe Kachasị sị ka ọ kagbuo mkpebi Ụlọike Mkpegharị.
Dịka nke ahụ na-eme, Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abịa nyekwara Gọọmentị iwu ka ha kwụọ Kanụ ego dị nde 500 (N500m) maka ntọrọ e si Kenya tọrọ ya ma mekpaa ya ahụ ma nye ha iwu ka ha kpọhachi ya Kenya ebe ha si kpụlata ya.
Kanu, bụ onye ndu Ipob, otu ehiwere n'afọ 2012 nke na-achọ ka e kewapụta mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ ochie na Naijiria, mee ya mba kwụrụ onwe ya nke a kpọrọ, Biafra.











