Effects of Flooding:Otoro, akpịrịkpa na ọrịa ndị ọzọ nwere ike ịbakwute gị n'ihi oke idemmiri

Idemmiri

Oke idemmiri wara n'ọtụtụ obodo na mpaghara dị icheiche na Naijria, taa isi ọtụtụ mmadụ ma mebie akụnaụba na ewumewu e ji akwalite obodo.

Mana ị ma n'okwu ahụ ebeghị, ndị ọkachamara ahụike na-ekwu na dịka idemmiri ka dọ n'ọtụtụ ebe ugbua, o nwere ike ibute nsogbu ahụike dị icheiche gụnyere ọrịa na-esi na mmiri, ọrịa akpụkpọ ahụ nakwa ọrịa metụtara uche.

Dịka Gọọmentị Etiti si gbaa n'ama, mmadụ 612 nwụrụ, ebe mmadụ dị 3,219,780 gbara ọsọ ndụ n'ihi oke idemmiri metụtara steeti 33.

N' ịzụụka olemole gara aga, mmiri kpara mkpamkpa n'Okpuru Ọchịchị Ọgbaru, Ayamelum nakwa Anambra-East, Anambra-West dị na Anambra steeti weghara ọtụtụ obodo, ebe ndị mmadụ gbaghara ụlọ ha gbaa ọsọ ndụ.

Lee ụfọdụ ọrịa ndị nwere ike izute gị ma ịkpachapụghị anya n'ihi oke idemmiri dịka Dkta na-ahụ maka ahụike ọha bụ Sivie Maduka nke ụlọọgwu 'University of Port-Harcourt Teaching Hospital' si kwuo:

Afọ ọsịsa (Diarrhea)

Afọ ọsịsa so na nsogbu na-egbu ọtụtụ ụmụaka

Ebe foto si, Getty Images

Afọ ọsịsa so na nsogbu idemmiri nwere ike ịkpalite n'ebe ọ wara.

Dkta Maduka kwuru na idemmiri nwere ike ịba n'olulu nsị na mmamiri bupụta ihe dị n'ime ya bubaa n'ebe e si enweta ezigbo mmiri.

Idemmiri tochie ebe niile, agaghị enwezi mmiri nke ọṅụṅụ maọbụ nke e ji esi nri.

Dịka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ CDC si kọwaa, ọrịa kachasị apụta ma oke idemmiri mee bụ ọrịa afọ dịka ọnyụnyụ na ọgbụgbọ nke na-esi na ịṅụ mmiri adịghị ọcha.

Otoro (Cholera)

Ndị gbara ọsọ n'ihi idemmiri

Otoro bụ ọrịa afọ ọsịsa nke nje a kpọrọ 'vibrio cholerae' na-ebute.

Dịka Dkta Maduka siri kọwaa, “Otoro bụ ọrịa na-enye nnukwu nsogbu ya mere e ji agbasa ozi maka ya.”

Otoro na afọ ọsịsa na-agbagwoju ọtụtụ ndị mmadụ anya n'ihi na ha amaghị nke bụ nke.

Ihe dị iche na afọ ọsịsọ na otoro, dịka Dkta Madụka si kwuo, bụ na afọ ọsịsa bụ "mmadụ ịnyụ nsị gbara mmiri karịa ugboro anọ maọbụ karịa, mana otoro bụ ọnyụnyụ nke ihe na-ebute ya bụ nje vibrio cholerae' nke nsị a na-anyụ na-adịka mmiri osikapa".

Akịrịkpa

Akpịrịkpa

Mmiri ide metụ ahụ mmadụ maọbụ ọnya dị mmadụ n'ahụ, o nwere ike ibute nsogbu n'akpụkpọ ahụ gụnyere akịrịkpa na ọkọ.

Ọrịa okuku ume

Ọrịa okukuume

Oke idemmiri nwere ike ịchụpụta nsị na atịtị ndị ọzọ nke nwere ike ịbanye n'ikuku kpọọ nkụ, o nwere ike ibute ọrịa ọwara e ji eku ume, ọkachasị n'ụmụaka.

Nsogbu 'ganrene'

Agwọ n'ụlọ mposi

Ebe foto si, Geoff Jacobs

Oke idemmiri nwereike ịchụpụta ọtụtụ anụmanụ na-ebi na mmiri gunyere ndị na-ata ata dịka azụ, agwọ na agụiyi n'elu ala.

Dkta Maduka si kwuo, "ajọ agwọ mmiri nwere ike ịta mmadụ bute nsogbu n'akwara maọbụ 'gangrene' n'akụkụ ahụ ebe ọ tara gị, ebe nsi maọbụ nje (fungi) ahụ nwere ike ịgbasa n'akụkụ ahụ ndị ọzọ."

'Gangrene' bụ ọnwụ maọbụ mmebi akụkụ ahụ mmadụ n'ihe mmerụ ahụ maọbụ nje.

Ọrịa erịghị ihe kwesịrị (malnutrition)

Ụmụaka na-eri nri

Agụụ na-eso mwakpo idemmiri nke nwere ike ibute ọrịa marasmus, kwashiọkor nakwa "malnutrition'.

Dịka idemmiri wara, nsogbu agụụ na-awa ọtụtụ ndị bi na mpaghara ebe ọ wakporo agba.

Mmiri mebiri ugbo ọtụtụ ndị mmadụ, ọtụtụ mmiri ka toro n'ụlọ ha nakwa okporoụzọ ha si aga ahịa maọbụ ọdọahịa.

Ọrịa iba

Ndị mmadụ na-awanye ụkwụ n'idemmiri

Idemmiri dọọ ogologo oge ọ na-enye ohere ka anwụta mụbaa nke nwere ike ibute ọrịa ịba.

'Hepatitis A'

Dokita Maduka kwuru na mmadụ nwekwara ike bute ọrịa 'Hepatitis A'.

'Hepatitis A' bụ ọrịa na-eme ka umeju mmadụ zaa azaa (inflamation of the liver).

A na-ebute ọrịa a site na mmiri maọbụ nri fọtọrọ afọtọ nke onye bu ọrịa ahụ metụrụ aka.

Ọrịa uche

Ọdachi idemmiri nwere ike ibutere mmadụ oke echiche, obi nkoropụ na mmụọ ida mba na ụdị ọrịa uche ndị ọzọ.

Okpo

Okpo

Ebe foto si, Science Photo Library

Ndị ide mmiri wakporo nwere ike inwe nsogbu okpo n'ihi ịṅụ mmiri maọbụ iri nri okpo dị na ya.

Dkta Maduka dụrụ ọdụ ka e nye ndị nwere nsogbu a ọkachasị ụmụaka ọgwụ okpo etu dọkịta siri nye ntuziaka.

Etu Ị kwesịrị iji chekwaa onwe gị

  • Si n'ebe mmiri toro pụọ gaa n'ebe ala kpọrọ nkụ
  • Kpọtụrụ ndị ọdachi metụtara, kasie ha obi.
  • Anụla mmiri ide n'ihi na ọ bụ ụzọ a ka e si ebute ọtụtụ ọrịa na-esi na mmiri