Ọ bụ eziokwu na mmadụ 80 nọ n’ime ụgbọmmiri ahụ kpuru n’Ogbaru?

Ụgbọmmiri kpuru ekpu

Ebe foto si, OU Travel and Tours

Kamgbe akụkọ ụgbọmmiri kpuru n’obodo Umunankwo dị n’Okpuruọchịchị Ogbaru Anambra Steetị, akụkọ mmadụ ole nọ n’ime ya na ndị nwụrụ anwụ ka na-agba ndị mmadụ gharịị.

Ụfọdụ ụlọọrụ ntaakụkọ na-ekwu na ndị ọrụ gbata gbata 'NEMA' sị na ụgbọmmiri ahụ bu mmadụ karịrị iri asatọ, ebe ahụla ozu mmadụ iri ma na-achọ ihe karịrị iri asaa achọ.

Mana mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Onyeisiocha Okpuruọchịchị Ogbaru bụ Paschal Aniegbunam, ọ sị na ọnụọgụgụ ahụ bụ asị ọcha.

Ọ sị na ọ gara ebe ihe a mere ma zute onye na-akwọ ụgbọmmiri ahụ nakwa ezinaụlọ ndị ihe a metụtara, na ha kọọrọ ya etu ihe si mee.

“Onye kwọ ụgbọmmiri ahụ gwara m na ndị o bu n’ụgbọ ruru ihe dịka iri anọ na abụọ na ha akarịghị iri ise maka na o dochaghị ya anya mmadụ ole kpọmkwem.

“Ngwa ngwa ụgbọ a kpụrụ ndị nọ nso ebe ahụ gbalịrị ma zọpụta mmadụ ruru iri atọ”

Aniegbunam sị na ọ dịka agụpụtachaala ndị nwụrụ anwụ maka na a hụla ozu ruru mmadụ iri.

Ọ gara n’ihu kwuo na onye kwọ ụgbọmmiri ahụ abụghị na na-akwọbu ya na mbụ, na ọ bụ nwanne ya nwoke.

“Ndị ahụ rịọrọ ya sị ka o buru ha n’ụgbọ kwọwee maka na nwoke na-akwọbu ụgbọ ahụ anọghị nso.

“O rughi nkeji atọ ha malitere njem, injin ụgbọmmiri ha emebie n’etiti mmiri mere ụgbọ ha jiri kpuo”.

'Mmiri riri nwunye m na ụmụ m atọ n'Ọgbaru'

Ụlọ ndị mmadụ idemmiri riri n'Ogbaru

Ebe foto si, OU Travel and Tours

Nkọwa foto, Ụlọ ndị mmadụ idemmiri riri n'Ogbaru

Dịka ọtụtụ ezinaụlọ na-akwa arịrị maka ụmụ ha na ụmụnne ha so n’ọgbụmmiri a kpuru n’ụbọchị Fraịde.

Otu nwoke tara ikikereze maka ọnwụ ụmụaka ya atọ na nwunye ya bụ ndị so n’ọdachi ahụ.

Nwoke a bụ Benard Achonu bụ onye Isiala Mbano mana ya na ezinaụlọ ya bi n’obodo Mputu Anambra Steetị

Ọ gwara onye ntaakụkọ Anambra Broadcasting Service na ụmụaka ya atọ ahụ dị n’agbata afọ abụọ ruo isii.

Ndị ezinaụlọ ha so n'ụgbọmmiri kpuru ekpu

Ebe foto si, ABS, AWka

Nkọwa foto, Ụmụnwoke ndị ezinaụlọ ha so n'ụgbọmmiri ahụ kpuru ekpu

Ọtụtụ ezinụlọ ndị ọzọ nke a metụtara gwara arịrị ma sị na ọ kachasị na ndị nne na ụmụaka.

Onye ọkwọ ụgbọmmiri ahụ bụ Desmond Amaugo gwara onye ntaakụkọ na o bu mmadụ karịrị iri anọ n’ụgbọmmiri ahụ na o rughi mmadụ iri asatọ dịka akụkọ sị na-ekwu.

Ọ sị na ụgbọmmiri ya na-ebu ihe ruru mmadụ iri itoolu mana o bujughi ndị mmadụ dịka ụbọchị ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị o bu kachasị na ndị nne nakwa ụmụaka.

Onye ntaakụkọ ahụ gara n’ihu kwuo na a gụpụtala ihe ruru ozu mmadụ iri site na mmiri ebe a ka na-achọ ndị ọzọ achọ.

Onyeisiala Muhammadu Buhari akwaala arịrị maka ndị nwụrụ na mmiri Ogbaru

Buhari na Ihe mberede mere n'ọgbarụ

Onyeisiala Muhammadu Buhari akwaala arịrị maka ndị nwụrụ n'ụgbọmmiri ya a n'Ogbaru.

N'ozi ya ụbọchị Sọnde, Buhari nyere iwu ka ndị ọrụ gbatagbata niile jiri ọsọ jiri ije gawa ebe ya bụ mkpamkpa kpara maka inye aka.

Ọ nyekwara iwu ka ndị ọrụ na-ahụ maka ọdịmma ndị njem ugbommiri nyochaa usoro njem ha hiwere ịhụ na ụdịri ihe a emeghị ọzọ.

Onyeisiala sị na ya bụ ihe wutere ya nke ukwuu ma nyekwa iwu ka ndị ọrụ gbatagbata gbaa mbọ hụ na-agụpụtachara ndị niile a na-achọ achọ.

N'ozi onye ozi ya bụ Garba Shehu tinyere aka, Buharị sị, "A na ma arịọ chukwu maka mkpuruobi ndị niile nwụru anwụ nakwa ọdị mma ndị fọrọ ndụ nakwa ezinaụlọ ha".

Kedụ etu ọdachi a si mee?

Ụgbọmmiri kpuru ekpu

Ọdachi a mere mgbe ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ maka ike idemmiri na-akpa n'obodo ebe ha bi.

Injin ụgbọmmiri bu mmadụ karịrị iri anọ mebiri n'etiti mmiri dịka ha si Ossomala na-aga Ogbakuba

Ebilimmiri buru ụgbọ ahụ ga kụọ ya n'akwammiri Umunankwo mgbe mmiri ahụ rigoro elu nke ukwuu nke mere ụgbọmmiri ahụ jiri kpuo.

Ndị na-agba mbọ ịzọpụta ndị mmiri riri

Ebe foto si, ABS, Awka

Nkọwa foto, Ndị na-agba mbọ ịzọpụta ndị mmiri riri

Peter Ezebe bụ ọdeakwụkwọ 'OgbaruDevelopment Union' sị na " mụ na nwanne anyị nwoke na-anya ya bụ ụgbọ kpara na-ekwentị taa. Ọ sị na ahụ dị ya. Ọtụtụ mmadụ pụtara mana a ka na-achọ ọtụtụ achọ".

Ọ sị na ọtụtụ ndị nọ na ya bụ ụgbọmmiri bụ ndị Ogwu Aniocha gbagara ọsọndụ n'Ossomala.

Ọ sị na afọ ole na ole gara aga na ndị Ogwu Aniocha gbara ọsọ ndụ maka mkpamkpa ndị ekperima kpachara n'obodo ha.

Kedụ ihe gọọmentị Anambra kwuru?

Gọvanọ Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Soludo TV

Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Steeti ahụ etiela ezinaụlọ ndị nke a metụtara aka n’obi ma zipu ndị ọrụ gbata gbata n’ogogi ahụ.

N'ozi si n'aka odeakwụkwọ gọọmentị bụ Christian Aburime, Solude sị na ọdachi a bụ ihe nwute ma sị na gọọmentị ezigala ihe enyemaka n'ebe ndị ọzọ idemmiri na-akpa ike na steeti ahụ.

Cheta na idemmiri na-akpakaarị ike n'ọtụtụ ebe gụnyere okpuruọchịchị Ogbaru n'Anambra Steeti kwa afọ.

Nke afọ a malitere n'ihe dịka ọtụ ọnwa gara aga ebe idemmiri emebiela ọtụtụ ụlọ, ọrụ ugbo nakwa ụlọahịa.