Ụlọ anyị nọ n'okpuru mmiri kemgbe idemmiri a malitere - Ndị bi n'Ogbaru

Aha onyonyo, Idemmiri a egbuola otu onye n'Aguleri

Ngalaba na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata n'Anambra steeti nke a na-akpọ 'State Emergency Management Agency' na bekee, ekwuola na ọdachi idemmiri mere na steeti ahụ n'afọ a yitere ụdị nke mere na 2012.

Ọnụ na-ekwuru ndị SEMA Anambra bụ Nwonye Chinyelu kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwentị n'ụtụtụ Mọnde a.

"Ọ bụ eziokwu na e nwere mpaghara ndị idemmiri na-enye nsogbu kwa afọ ọbụla, mpaghara dịka Ogbaru, Ayamelum, Anambra East, Anambra West, na Ihiala, mana nke afọ a dị nnọọ nnukwu njọ. O yitere ụdị nke mere na 2012" Chinyelu kwuru.

Ide mmiri

Ide mmiri 2012

Ide mmiri 2012

Ebe foto si, Reuters

N'afọ 2012 nnukwu odachị ide mmiri nke ahụtụbeghị ụdị ya mere na Naịjirịa nke chụpụrụ ihe ruru nde mmadụ abụọ na ọkara na be ha.

Ọdachi a metụtara steeti 30 n'ime steeti 36 dị na Naịjirịa, ma gbuo mmadụ 363.

Steeti ọdachi a kacha bie aka ọjọọ bụ Adamawa, Taraba, Plateau, na Benue.

Idei mmiri a malitere n'ọnwa Julaị ma megide ruo mmalite ọnwa Ọkụtoba.

Onyeisiala Naịjirịa n'oge ahụ bụ Goodluck Jonathan wepụtara ijeri naịra 17.6 iji kesaara steeti niile ya bụ ọdachi idemmiri metụtara maka enyemaka.

Idemmiri a egbuola otu onye n'Aguleri

Idemmiri na-emetụta akụkọ Anambra dị icheiche ugbua dịka akụnụba ndị mmadụ na-ala n'iyi.
Nkọwa foto, Idemmiri na-emetụta akụkọ Anambra dị icheiche ugbua dịka akụnụba ndị mmadụ na-ala n'iyi.

Idemmiri edulala otu onye mmụọ ma chụpụ ọtụtụ n’ụlọ ha n’Otu-Aguleri nke Anambra steeti.

Onyeisi otu ndị obodo ahụ bụ Nnamdi Ikeli-Adimorah kọwaara BBC Igbo n’ụbọchị Sọnde na ya bụ ihe mere n’ezie dịka o kwuru “Ndị obodo anyị nọ n’akwa arịrị ugbua. Ọrụ ubi ndị mmadụ, ngwo ngwo nakwa akụnụba ọtụtụ emebisiela n’ime idemmiri ndị a.”

Ikeli-Adimorah kwuru na ha na-agba mbọ ịgbapụta ọtụtụ ndị mmadụ ebe abụ dịka o kwuru na onyeisi okpuruọchịchị ha bụ Anselem Nevive nọ n’ihu mmiri ahụ na-azọpụta ndị mmadụ na ngwo ngwo ha.

Ọ gara n’ihu kwuo “Nevive nakwa ndị isi obodo ndị ọzọ na-ahazị ụlọ ebe mgbapụta ugbua nke bụ na n’ụbọchị Mọnde, ndị na-agba ọsọ ndị ndụ ga-enweike nweta ebe ha ga-anọtụ nwa mgbenta n’ime ụlọọgwụ General Hospital Umueri.”

Ọnọdụ idemmiri dị n'akụkụ ahịa Otuocha, Anambra steeti
Nkọwa foto, Ọnọdụ idemmiri dị n'akụkụ ahịa Otuocha, Anambra steeti
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ gbatagbata n’Anambra steeti nke Anambra State Emergency Management Agency (Sema) bụ Nwonye Chinyere gwara BBC Igbo na Sọnde na ọ bụ eziokwu na otu onye nwụrụ dịka ọ kwara na ha-agba mbọ idajuu mkpa mkpa idemmiri na-akpata n’akụkụ Anambra steeti dị icheiche ugbua, ọkachasị n’okpuruọchịchị Anambra West, Anambra East na Ogbaru.

 O kwuru “Mkpamkpa a na-akpa n’ebe ndị a emetụtala ihe ruru mmadụ 650,000 dịka nnyocha anyị n’izu a nke kwụsịrị n’ụbọchị Fraide si gosi.”

Ọ gara n’ihu kwuo “ihe ruru mmadụ 500,000 abụrụla ndị na-enweghị ebe obibi n’ihe ọnọdụ idemmiri a”

Ọ kọwara na dịka ha mechara nnyocha nakwa ngagharị n’okpuruọchịchị ebe idemmiri a na-emetụta na ugbua, ha na gọọmentị ejikọọla aka ọnụ hibe ụlọ ebe mgbapụta nye ndị na-agba ọsọ ndụ ha n’ihi idemmiri a.

Ọtụtụ ndị bi n’obodo ndị nọ nso mmiri n’Anambra steeti ji akwa arịrị gbaa emume ụbọchị ncheta nnwereonwe Naịjirịa nke afọ a.

Cheta na n'ụbọchị Satọdee, akụkọ si n’akụkụ Otuocha nke Anambra kwuru na idemmiri kụsarasị ụlọ ndị mmadụ n’akụkụ be ha nakwa ụlọahịa ha.

Na nso nso, ozi ụlọọrụ gbata gbata nke Naịjirịa bụ National Emergency Management Agency (Nema) nakwa ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ mmiri nke ihu eligwe na Naịjịrịa bụ Nigeria Hydrological Services Agency (NIHSA) kwuru na idemmiri ga-emetụta akụkụ Naịjirịa dị icheiche n’ụzọ ọjọọ.

Ọnọdụ idemmiri dị n'akụkụ ahịa Otuocha, Anambra steeti
Nkọwa foto, Ọnọdụ idemmiri dị n'akụkụ ahịa Otuocha, Anambra steeti
Skip Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị and continue readingAkụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ozi ha kọwara na mba agbataobi Naịjirịa bụ mba Kameruun ga-agbapee ọgba aja mmiri etu ha sị eme kwa afọ bụ ọgba aja mmiri nke Lagdo dam.

Ha kwuru na nke a ga-eme ka idemmiri ka nkụ n’akụkụ steeti ndị nọ Kameruun nso.

Ha kpọpụtara aha Anambra steeti nakwa Adamawa, Taraba, Benue, Niger, Nasarawa, Kebbi, Kogi, Niger Delta, Edo, Delta, Krọsụ Rịva, Rịvas steeti na Bayelsa steeti dịka ha rịọrọ gọọmentị ndị steeti ahụ ka ha kee nkwụcha ma hibe usoro gbapụta nye ndị bi ebe ahụ.

Ndị ahịa nọ n’ahịa Otuocha mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo garuru ebe ahụ kọwara na o meela izuụka ise kemgbe idemmiri malitere ịnyụ ha ikpakwụ n’akụkụ ahịa ahụ niile.

Ụfọdụ n’ime ha e jirila maka ụjọ ize ndụ ha gbapụ ma buru ngwa ahịa ha ga n’akụkụ ụzọ.

Ọnọdụ idemmiri n'akụkụ Anambra steeti
Nkọwa foto, Ọnọdụ idemmiri n'akụkụ Anambra steeti

Ndị bi ebe ahụ kọwakwara na ahịa, ụlọọrụ, ụlọụka nakwa be ndị mmadụ n’akụkụ mpaghara atọ dị n’ime okpuruọchịchị Anambra West bụ Umueze Anam, Iyiora Anam, Umuoba Anam emechiela dịka oke mmiri tojuru ebe niile.

Otu nwaamadị aha ya bụ Samuel Nwabunwanne onye ji ụgbọmmiri ‘speed boat’ agbapụta ndị mmadụ gwara BBC Igbo na gọọmenti kwesịrị ibubata ọtụtụ ụgbọmmiri iji gbapụta ndị mmadụ tupu ihe ọdachị ezute ha.

Nwabunwanne kwuru “N’ihi ụjọ, ọtụtụ ndị mmadụ kwụ n’ahịrị na-arịọ m ka m buru ha pụọ n’ime mmiri tujuru ebe niile nke mere na m na-ebuzi ibu karịrị ihe ehibere ụgbọ mmiri m ibu.”

Onye ntaakụkọ anyị ji anya ya hụ ọnọdụ ihe ebe ahụ dịka ọ kọwara na ya bụ ibu agafeela etu o kwesịrị.

Ọnọdụ idemmiri dị n'akụkụ ahịa Otuocha, Anambra steeti
Nkọwa foto, Ọnọdụ idemmiri dị n'akụkụ ahịa Otuocha, Anambra steeti

O kwukwara na ndị nọ n’ime ụgbọmmiri mgbapụta ahụ eyighi ihe eji echekwa ndụ na mmiri nke Bekee na-akpọ ‘life jacket’ nke gụnyere ọtụtụ ndị okenye na-agba ọsọ ndụ ha.

Ụfọdụ ndị ọzọ bi ebe ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị okwu kpọkuru gọọmentị na-rịọ ka a gbatara ha ọsọ enyemeaka ngwa ngwa.

Gọvanọ Chukwuma Soludo onye gara njem nleta n’Obosi n’ụbọchị Fraịdee kwuru n’anya gọọmentị nọ nso ihe na-eme n’akụkụ ebe ndị ahụ dịka o kwukwara na a na-atụ anya na okpuruọchịchị ọzọ nwereike isonye na ndị idemmiri na-anyụ ikpakwu ugbua.

O kwuru “Ihe karịrị narị kwuru narị ndị mmadụ a bụrụla ndị na-enweghị ebe ha ga-ebi ugbua dịka nke metụtara obodo ruru 13.”

“Anyị na ndị ụlọọrụ gbata gbata nke Nema na-arụkọ ịhụ na e hibere ụlọ mgbapụta nye ndị na-agba ọsọ ndụ ha n’aka idemmiri ndị a.”

Ihe Gọọmentị Anambra merela

Onye ntaakụkọ BBC Igbo n’Anambra steeti kwuru na gọọmenti steeti ahụ zipụtara ozi na redịo ugboro ugboro kemgbe izu ole m ole ma rịọ ndị bi ebe ahụ ka ha gbapụ ma gaa ebe mmiri agaghị emetụta ha.

Agbenyeghị na gọọmenti Anambra kwuru ha ehibela ụlọ mgbapụta nye ndị na-agba ọsọ ndụ ha n’aka idemmiri a ndị bi nso ahịa Otuocha kọwara n'ụbọchị Satọdee na enwebeghị nke ha hụrụ.

BBC Igbo garukwara ụlọ ebe ehibeburu n’afọ gara aga maka atụmatụ mgbapụta a bụ ụlọkakwụkwọ 'Joseph Catholic school' mana enweghị ndị a hụrụ ebe ahụ.

BBC Igbo enwebeghị ike nata ozi ịgbaama gosiri na e hibela ụlọ mgbapụta ndị a n’ezịe dịka kọmịshịna mgbasaozi azabeghị ozi e zitere ya ruo ugbua.

Ndị mmadụ na-erezi ngwa ahịa ha n'elu mmiri
Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-erezi ngwa ahịa ha n'elu mmiri

Idemmiri na Naijirịa

Ụlọọrụ Nema kwuru n'ọnwa Sepụtemba na ihe ruru mmadụ 300 a laala mmụọ n'aka idemmiri n'afọ a ebe ihe ruru mmadụ 100 enweghịzị ebe obibi n'ihe nsogbu idemmiri na-akpatara ha n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche.

Ozi si n'aka onyeisi ụlọọrụ a bụ Mustapha Habib Ahmed gbara ama na mgbape ọgba aja nke mmiri mba Kameruun bụ Lagdo dam bụ ihe nọ n'isi mkpa mkpa a na-akpa ugbua.