Anambra Flooding: Etu ụmụaka enwe-nne 40 si tọ n'ụlọelu 'orphanage' ha n'ihi oke idemmiri

Aha onyonyo, Anambra Flooding:Ụmụaka 40 anyị tọọrọ n'ụlọelu- Onyeisi Madonna Angels Orphanage
Madonna Angels Orphanage

Ebe foto si, Madonna Angels Orphanage

Agụụ, ụkọ mmiri ọṅụṅụ na oyi ji ụmụaka enwe-nne-enwe-nna ruru 40 na ndị na-elekọta ha mmadụ 30 tọrọ na 'Madonna Angels Orphanage dị n'Atani dị n'Okpuru Ọchịchị, Ogbaru, Anambara steeti dịka idemmiri gbara ha gburugburu kemgbe otu izuụka idemmiri wakporo ebe ahụ.

Onyeisi ụlọ nlekọta ụmụaka enweghị nne na nna bụ Rev Sr. Austina Uyanne, etiela mkpu maka egwu ọrịa ịtụ ụmụaka ndị a na ndị na-elekọta ha, dịka oke mmiri ozizo na-aga n'ihu na mpaghara ahụ.

Oke mmiri ozuzo butere idemmiri wakporo ọtụtụ ebe gụnyere Okpuru Ọchịchị Ọgbaru nakwa Ayamelum n'Anambra steeti, mebie ọtụtụ ugbo, ebe obibi, ụlọakwụkwọ nakwa ụlọọrụ na nsonso a.

Rev Sr Uyanne

N' ụbọchịụka a, ihe karịrị mmadụ 40 nwụrụ dịka ụgbọmmiri ha ji eme njem kpuru, n'obodo Umunankwo dịkwa n'otu Okpuru Ọchịchị ahụ.

N'ihi oke idemmiri a, ọtụtụ ndị mmadụ jizi ụgbọmmiri aga n'ebe e jibu ụgbọala aga.

Gburugburu Madonna Angels Orphanage

Ebe foto si, Madonna Angels Orphanage

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Rev Sr Uyanne kwuru na mmiri otito abanyela ụmi ezigbo mmiri ha nwere, mee ka inweta mmiri ọṅụṅụ, ebe idemmiri ahụ mere ka ọpụpụ na mbata sie ike ịzụta ihe oriri, dịka ọ na-atụ egwu na ụmụaka ndị a nwere ike ịbanye na mmiri na tụmadị o rie ha.

Ọ sị," Mmiri si na River Niger na-abata, anyị enweghị ike ịga zụta ihe. Anyị enwezịghị ezigbo mmiri."

Sista onye kwuru na ha nwere mkpa nri, mmiri ọnụnụ na-akwa mgbuchi oyi nakwa ọgwụ gara n'ihu tụọ arịrị, " Amaghị m ebe m ga-akpọ ụmụaka 40 aga."

Jiri anya gị hụrụ n'ihe onyonyo a: