Etu ịkpụ ụzụ ga-esi mee ka nwaanyị gbasie ike ma maa ezigbo mma - Sandra Okeke

Aha onyonyo, Women fitness: Ịkpụ ụzụ agaghị egbochi nwaanyị ịma mma
Etu ịkpụ ụzụ ga-esi mee ka nwaanyị gbasie ike ma maa ezigbo mma - Sandra Okeke

Sandra Okeke bụ onye na-akpụ ụzụ ma na-atụzi aka etu e si emegharị ahụ akọwaala ihe mere o jiri banye n'ọrụ ịkpụ ụzụ dịka nwaanyị.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Okeke sị na ọ bụ ka ahụ gbasie ya ike dịka nwaanyị mere o jiri gbasoo atụmatụ a.

Ọ sị na ebumnobi ya na mbụ abụghị ịna-akpụ ụzụ kama na ọ bụ enyi ya nwaanyị dọbatara ya n'ime nke a.

Okeke sị na kamgbe afọ 2017 ọ malitere ya na ihe dị iche dị zi n'ahụ ya; na ahụ gbasiri ya ike, makwuo mma.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ụmụnwoke ka ọ dịịrị ịkpụ ụzụ kama na ụmụnwaanyị kwesịkwara ị na-akpụ ụzụ.

“Ụfọdụ ndị mmadụ ma na Naịjirịa nakwa mba ndị ọzọ cheere na ọ bụ naanị ụmụ nwoke ka ọ dịịrị ịkpụ ụzụ mana ọ bụghị eziokwu” ka o kwuru.

Ọ sị na mmadụ ịsi ike abụghị ihe ọjọọ kama ha chọọ ịme ya, ha siri n’ụzọ ziri ezi mee ya.

Ọ dụrụ ndị mmadụ ndụmọdụ sị ha megharịa ahụ nke ọma ma rie nri zuruoke iji nweta ụdịrị ahụ ha chọrọ.

Kirie ihe ndị o kwuru n’uju ebe a.

Nwaanyị na-akpụ ụzụ

Ebe foto si, Sandra Okeke