Etu ndị ojiegbe si mee mwakpo n'Ọwụwa Anyanwụ na ngwụcha izuụka

Ebe foto si, Getty/Screenshot
Akụkọ na-ekwu na ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ yi uwe ndịagha ma wakpoo ndị uweojii n’obodo Umuna dị n’okporoụzọ si Owere gawa Okigwe n’ụbọchị Ụka.
Nke a mere mgbe ndị uweojii a nọ n’ọrụ nyocha ụgbọala ndị njem n’okporoụzọ ahụ.
Ndị ojiegbe a jikwa ụgbaọala ọkwụ ọtọ ekele eze ‘hilux’ wuchie ebe ahụ ma malite ịgba ndị uweojii egbe.
Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na ndị ojiegbe a gburu ndị uweojii abụọ.
N’okwu ya “ndị ojiegbe yi uwe ndịagha Naịjirịa wuchie n’okporoụzọ Umuna ebe ndị uweojii na-enyocha ụgbọala ndị njem ma gbaa ha egbe.
“Ha gbagburu ndị uweojii abụọ ma merụọ otu onye ọzọ ahụ”
Dịka ọ dị ugbua, e bugala nke merụrụ ahụ n’ụlọọgwu maka ọgwụgwọ ebe ozu mmadụ abụọ ahụ ka tọgbọ n’akụkụ ọhịa.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Michael Abattam azabeghi okwu ọbụla mwakpo a dị ka ọ jụrụ ịza ekwentị ya.
Ndị oji egbe na-apụrụ ndị uweojii egbe ma gbuo onye mba Chaịna n’Ebonyi Steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akụkọ ọzọ bụ na ndị ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ wakporo ndị ọrụ nchekwa n’obodo Izzi Ebonyi Steeti ma na-apụ ha egbe, gbuokwa onye Chaịna.
Onyeisi okpuruọchịchị Izzi bụ Steve Emenike sị na ndị uweojii ahụ na-eche onye Chaịna ahụ nche mgbe ndị ojiegbe wuchiri n’ụlọ ya dị n’Otammu n’ụbọchị Ụka.
“Ndị a na-apụrụ ndị uweojii na-ache nwoke Chaịna ahụ nche egbe AK47 ha ma gaa n’ụlọ nwoke a dị n’Otammu ma gbagbuo ya”.
Emenike gara n’ihu kwuo na nwoke Chaịna ahụ na-arụ ọrụ n’ụlọọrụ ngwupụta ọnatarachi a kpọrọ ‘Boko Mining Ltd’ dị n’Otammu Izzi nke Ebonyi Steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Ebonyi bụ Chris Anyanwu sị na nke a bụ eziokwu, kama na o nwetechabeghi ozi banyere ya n’uju.
Ọkụ a gbara Okpuruọchịchị Ezza North
Ndị ojiegbe nọọrụ n’isi ụtụtụ Mọnde 10 Ọktoba, 2022 gbaa isiụlọọrụ Okpuruọchịchị Ezza North dị n’Ebonyi Steetị ọkụ.
Ndị ntaakụkọ News Agency Nigeria mere ka a mata na ndị a mebikwara ọtụtụ ngwaọrụ ruru ọtụtụ nde naịra.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Chris Anyanwu sị na nke a mere n’ezie kama na nyocha ka na-aga n’ihu ugbua.
N’otu aka ahụ Onyeisioche Okpuruọchịchị Ezza North bụ Ogodo Ali Nomeh sị na ndị a wuchiri ma ha na ndị ọrụ nchekwa malite ịkpakọrịta egbe.
Ọ sị na o nweghi onye e merụrụ ahụ kama na ọ bụ naanị isiụlọọrụ ha ndị a gbara ọkụ.
E gburu mmadụ abụọ ma gbaa ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Inyi, Enugu Steeti

Ebe foto si, Others
Ndị ekperima ji egbe amaghị ndị ha bụ egbuola mmadụ abụọ ma gbakwa ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Inyi dị n'Okpuruọchịchị Oji River dị n'Enugu steeti.
Akụkọ na-akọ na ndị ahụ gbara ebe ahụ ọkụ dị mmadụ isii jiri ụgbọala abụọ.
Ha sị na ndị ahụ kwara mgbe ebe ahụ nke mere na ha kwụrụ ozu mmadụ abụọ ebe ahụ mgbe ndị oji egbe ahụ pụwara.
Onye obodo ahụ bụ Ọzọ McGinger Ibeneme kwuru na " a ma m otu n'ime ndị ahụ ha e gburu. Onye ahụ abụghị onye uweojii ebe onye nke ọzọ bụ onye uweojii".
Akụkọ ọzọ na-ekwu na ndị ahụ sị ndị mmadụ na-aga n'ụzọ ha atụla egwu, ha gawa maka na ọ bụghị ha ka ha na-achọ.
Ndị nọ n'ihe onyonyo BBC hụrụ na-ekwu na ọ dịka ọ bụ egbe ndị uweojii ka ndị ahụ chọtara.

Ebe foto si, McGinger Ibeneme
Cheta na ndị ojiegbe gbukwara onye uweojii na Oji River Izu gara aga, buru egbe ya.
N'otu mgbe ahụ, ha tọọrọ otu nwaamadị ebe ahụ mechaa hapụ ya n'ime abali.
Okpuruọchịchị Oji River na-anụ ụda ya nsonso a n'aka ndị ekperima ojiegbe kemgbe amalitere ịchụ ha ọzọ n'Anambra steeti.
Oji River dị n'Enugu Steeti nwere okeala ha na Anambra steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Enugu Steeti bụ Daniel Ndukwa azaghị ekwentị ya maka ịkọwa ka ya bụ ihe siri metuta ndị uweojii na steeti ahụ.









