Unknown Gunmen Attack: Etu ndị oji egbe si gbagbuo onye ntuzi aka okporoụzọ n'Ekwulobia

Onye ntuziaka okporoụzọ nọ n'ọrụ n'Anambra Steeti

Ndị oji egbe amabeghi ndị ha bụ agbagbuola otu onye na-atụzi aka okporoụzọ bụ Anambra State Road Traffic Management Agency (ARTMA) n'Umuchu Ekwulobia dị n'Anambra Steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na nsogbu butere ogbugbu nwoke ahụ malitere n'ụtụtụ Tuzde 8, Febụwarị, 2022.

Aha onyonyo, Etu ogbugbu onye okada si bute ọgbaaghara n'Igboukwu, Ekwulobia, Oko

Ọ sị na ndị uweojii nụrụ kepukepu na ndị oji egbe na-akpa ike na gburugburu Ekwulobia na Umunze, nke mere kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ ji zịpụ ndị uweojii ebe ahụ.

O kwuru na tupu ha erute ebe ahụ, na ndị oji egbe hụrụ otu onye uweojii nọ nsọ ebe ahụ ma chọrọ ịnapụ ya egbe ya.

Ikenga sị na onye uweojii ahụ gbasuru ndị ahụ egbe nke mere ha jiri rie mbọ mbọ ọsọ.

Ndị ntuziaka okporoụzọ n'Anambra Steeti

Ebe foto si, ARTMA

Ọ sị dịka ndị oji egbe a na-agba ọsọ na ha malitere ịgba egbe aghara aghara ebe ahụ.

Mgbe ha rutere n'okporoụzọ Umuchu na Ekwulobia, mgbọ egbe ha tụrụ ma gbuo onye ntuziaka okporoụzọ ngalaba Anambra State Traffic Management Agency nọ n'ọrụ ebe ahụ.

Ikenga sị na nchekwa alọghachịla na gburugburu ebe ahụ ugbua.

Ọ sị ka onye ọbụla malitekwa ịga mkpa ya ma sị na nyocha ka na-aga n'ihu ịnwụchị ndị kpara arụ a.

Kedụ ndị bụ ARTMA?

Anambra State Road Traffic Management Agency (ARTMA) bụ ngalaba gọọmentị Anambra hiwere bụ ndị ga-enye aka ịhụ na njem ụgbọala na-aga siriri werere.

Ọrụ ndị bụ ịhụ na a gaghị enwe kpachikpachi okporoụzọ na steetị ahụ.

Ha na-atụziri ndị ọkwọ ụgbọala aka ebe ha kwersịrị ịga nakwa mgbe ha kwesịrị iji aga, ọkachasị ebe ọtụtụ ụzọ zutere onwe ha bụ 'junction maọbụ roundabout' na Bekee.

Ngalaba anaghị ebu ngwa ọgụ arụ ọrụ mana ị daa iwu ha nwereike ijide ụgbọala gị ma kpụpụ gị n'aka gọọmentị.

I ma maka etu nchekwa dị n'Anambra steeti?

Ọtụtụ ọgbaghara na okwu mwakpoo n'aka ndị omekome adapụtala n'akụkụ Ekwulobia na Ihiala nke Anambra steeti na nso nso a dịka ndị ọrụ nchekwa na-agba mbọ idajuu ọgbaghara ndị a.

Ọwụwa anyawụ Naịjirịa danyere n'ọnọdụ nchekwa dị ọjọọ n'afọ 2021 nke gụnyere mwakpo na ntọrọ ndị mmadụ, ụlọọrụ ndị uweojii, ụlọọrụ ngalaba na-ahazi ntulika bụ Independent National Electoral Commission (Inec), ụfọdụ ụlọ mkpọrọ na ebe ndị ọzọ.

Gọọmentị Naịjirịa gbara isi akwara na okwu ịwaghachịte udo na nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyawụ Naịjirịa.