Gọvanọ Ugwuanyi agaala n'okporoụzọ Ugwogo-Opi Nsukka ebe ndị ntọrị na-akpa ike

Ifeanyi Ugwuanyi

Ebe foto si, Gọọmentị Enugwu

Gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi akpọrọla ndị isi ọrụ nchekwa dị icheiche gaa n'okporoụzọ Ugwogo-Opi Nsukka, ebe ndị ekperima na-eyi ndị mmadụ egwu oge niile.

Nke a na-abịa dịka ndị ekperima wakporo okporoụzọ ahụ n'ụtụtụ taa bụ Tọzde, Ọktoba 27, 2022, ma tọrọ ọtụtụ mmadụ.

Ndị so Gọvanọ Ugwuanyị na njem a gụnyere Umar Musa, bụ onyeisi ngalaba 82 Division nke ndị agha Naịjirịa; Onyeisi ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Ahmed Ammani; Onyeisi ndị DSS nke Enugwu bụ H.M Daluwa; na ndị ọzọ.

Ọchịagha Umar Musa gwara ndị ntaakụkọ na ha na-ekwe nkwa na ha ga-emekpa ndị ekperima ahụ na-eyi ndị mmadụ egwu ahụ n'oge adịghị anya.

"Anyị ga-abanye n'ime ọhịa niile ebe ha na-ezo ma chụpụta ha. Anyị ga-ahụ na okporoụzọ a agaghị abụzi ebe egwu nye ndị njem," Umar Musa kwuru.

"Anyị ga-akpụpụtarịrị ndị ekperima a ma nye ha ụgwọịọrụ dịịrị ha."

"Anyị nọ ebe a, anyị ma na ndị bi na steeti a bụ udo, mana oge ụfọdụ, ndị omekome na-esepụta isi."

UGọvanọ Ugwuanyị na ndị isi ọrụ nchekwa n'Enugwu steeti nwere ọgbakọ n'isi ụlọọrụ ndị agha 82 'Division' n'ụbọchị Tọzde, tupu ha agaa njem na mpaghara Ugwogo-Opi ịga mata etu ihe si kwụrụ ebe ahụ.

Etu ndị ekperima si wakpoo ma tọrọ ọtụtụmmadụ n'ụzọ Opi Nsụkka taa

Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi

Ebe foto si, Gọọmentị Enugwu

Ndị ekperima bu egbe wakporo ndị njem n'okporoụzọ Ugwogo-Opi Nsukka, n'Enugwu steeti n'ụtụtụ taa bụ Tọzde, Ọktoba 27, 2022.

Ndị bi na mpaghara ahụ gwara BBC Igbo na ya bụ mwakpo malitere n'ebe elekere asatọ nke ụtụtụ.

"Ndị ekperima a kwagidere mgbọ ruo ihe karịrị otu awa nke tinyere ndị njem n'ụzọ ahụ n'ọnọdụ oke n'ọsọ ngwere n'ọsọ," otu onye aha ya bụ Mazi Uche Odoh kwuru.

"Anyị amaghị kpọmkwem mmadụ ole ha tọọrọ na mwakpo a, mana ha dị ọtụtụ."

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Daniel Ndukwe azaghị oku nakwa ozi BBC Igbo zigaara ya maka akụkọ a.

Onye ọzọ kwa na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya kwuru na ndị agha na ndị uwe ojii mechara bịa ebe ahụ, ha na ndị ekperima ahụ akwakọrịta mgbọ tupu ha agbaa ọsọ.

Mwakpo kwa mgbe kwa mgbe n'okporoụzọ Ugwogo-Opi

Ndị ekperima

N'ụbọchị 23 nke Ọktoba 2023, akụkọ pụtara na ndị ekperima wakpokwara okporoụzọ a ma tọrọ ụfọdụ ndị njem, nke gụnyere ụfọdụ ụmụakwụkwọ Mahadum Naịjirịa nke Nsukka.

Akụkọ a kwuru na ụmụakwụkwọ ahụ na-alaghachi n'ụlọakwụkwọ ha dịka ndị nkuzi ASUU gbachara arụkwaghị m.

Mana n'ụbọchị 26 nke Ọktoba ka ndị uweojii Enugwu wepụtara akwụkwọ ozi ma kwuo na ha anwụchiela ụfọdụ ndị ekperima na-awakpo ndị mmadụ na mpaghara ahụ.

Daniel Ndukwe kwuru n'ime akwụkwọ ozi ahụ na ha nwụchiri mmadụ atọ n'Ọktoba 20, dịka ha nwetara ozi na ndị ahụ na-eyi ndị mmadụ egwu.

O kwuru na ha napụtara ndị ekperima ahụ ego dị puku naịra 650 bụ nke ha naara otu onye ha tọọrọ.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ha nwuchikwara mmadụ isii ndị ekperima n'ụbọchị 16 nke Ọktoba, napụta ha otu egbe, otu egbe adịgboroja, na ego dị puku naịra 500.

Ndukwe kwere nkwa na ndị uweojii na-agbalị ike ha ichekwa ndụ na akụnụba ndị mmadụ na steeti Enugwu.