Ọtụtụ ndị a ma ama na-etigharị egwu m na-anataghị m ikike - Madam Ladder

Aha onyonyo, Ọtụtụ ndị a ma ama na-etigharị egwu m na-anataghị m ikike - Madam Ladder
Ọtụtụ ndị a ma ama na-etigharị egwu m na-anataghị m ikike - Madam Ladder

Otiegwu ụka bụ Agnes Iroh a ma dịka ‘Madam Ladder’ akọwarala BBC Igbo ọtụtụ ihe banyere ndụ ya nke ọha amaghị maka ya.

Na mkparịtaụka a, Iroh kọwara etu ụfọdụ ndị ọkachasị ndị otiegwu a ma ama sị ewere ma na-etighari egwu ya dịka ụzọ ha si akpata ego mana ha anaghị anata ikike n’aka ya tupu ha e mee nke a.

O ji ndị otiegwu abụọ bụ Olamide Gbenga Adedeji, onye a ma dịka 'Olamide', nakwa Tim Godfrey nye ọmụma atụ.

Dịka o si kwuo, Olamide tinyere olu ya bụ Madam Ladder n'egwu nke ya onwe ya bụ Olamide, na-anataghị ya ikike ọbụla, ebe Tim Godfrey gụgharịrị egwu ya a kpọrọ 'nara ekele', na-anataghị ya ikike.

Otiegwu Agnes Iroh

Olamide na Tim Godfrey ekwughị ihe ọbụla

BBC Igbo gbara mbọ ịnụ n'ọnụ ndị otiegwu abụọ a bụ Olamide Gbenga Adedeji, nakwa Tim Godfrey, mana ọ mịtaghị mkpụrụ.

Ha abụọ azaghị ekwentị ha maọbụ zaghachi ozi anyị zigaara ha n'ekwentị, na whatsapp nakwa 'email'.

Naịjirịa nwere iwu a kpọrọ 'Copyright Act' nke e wepụtara n'afọ 2004. Iwu a gbochiri onye ọzọ imegharị maọbụ rụgharịa ihe ọbụla mmadụ chepụtara n'onwe ya dịka akwụkwọ e dere ede, abụ, ihe eserese, ihe ejije onyonyo, maọbụ egwu akụpụtara akụpụta.

Iwu a hibekwara ngalaba a kpọrọ 'Nigerian Copyrights Commission' bụ ndị ọ dị n'aka ịhụ na mmadụ ọzọ ewereghị egwu, maọbụ ejije, maọbụ eserese onye ọzọ, megharịa ya ma were ya na-akpara ego.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Anyị abanyeghị iti egwu naanị iji kpata ego

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Oriaku Agnes Iroh (Madam Ladder) kwuru na oge ha malitere iti egwu, "ọ bụghị maka ego ka anyị ji banye ya".

"Ihe na-anụ anyị ọkụ n'obi bụ ito Chineke, na ime ka ndị mmadụ chegharịa sowe Chineke," ka o kwuru.

Ọ kọwara etu njem ya n’ọrụ iti egwu siri malite ma kọwapụta ụfọdụ ihe ndị cheere ya aka mgba mgbe ọ malitere ya bụ ọrụ.

Iroh kọwara etu ihe siri gbanwe n’ụwa ugbua nakwa etu mgbanwe a siri metụta atụmatụ iti egwu ya nakwa ihe ndị ọzọ na ndụ ya.

O jikwa olu ya na-atọ ka mmanụ aṅụ gụọ ụfọdụ egwu ya a ma ama nakwa ndị o kwuru na-amasị ndị nso nso ya.

Na nchịkọta, ọ dụkwara ndị ntorobịa ndụmọdụ ka ha dị ụchụ n’ọrụ ha ugbua n’ihi na ime nke a ga-ahụ na ọrụ aka ha mịpụtara mkpụrụ ma ọ bụghị taa, ọ ga-eme n’oge na-adịghị anya.