Stanley Okorie: Lee otiegwu Nollywood tiri ‘Happy Mumu’, ‘I go chop your dollar’

Aha onyonyo, Stanley Okorie

Ngalaba ejije Naịjirịa a na-akpọ Nollywood bụ otu ngalaba e ji eme ọnụ n’akụkụ ụwa niile.

Nollywood emepụtala ọtụtụ ejije mara mma ụwa na-anụ aha ya, mana e nwere ọtụtụ ihe na-eme ka ejije Nollywood bụrụ ọkaibe.

Egwu so n’otu n’ime ihe ndị na-eme ejije ka ọ tọwanye ụtọ.

Stanley Okorie bụ onye na-etipụta ọtụtụ egwu ndị ahụ na-eme ejije Nollywood ka ọ bụrụ sọ mma.

Egwu ndị o tirila na Nollywood gụnyere: 'Happy Mumu', 'I go chop your dollar'(nke ụfọdụ chere na ọ bụ Nkem Owoh tiri), 'Share the national moi moi', na ọtụtụ ndị ọzọ.

Ọ bụkwa Stanley Okorie tiri efere egwu a kpọrọ ‘Goodness of God’, nke wuru ewu nke ukwuu oge ọ pụtara.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Stanley Okorie kwuru na egwu tinyere ya na nsogbu, maka na nna ya akwadoghị ya.

“Nna m bụ ọkammụta, o kweghị chaachaa ka m tie egwu.”

“Ya mere o ji sị m ejikwala aha ya eti egwu.”

Onyinye iti egwu m bụ ‘Agwụ’

Stanley Okorie

Stanley Okorie kwenyere na ọ bụ ‘Agwụ’ na-enye ya onyinye a.

N’omenala Igbo, Agwụ bụ mmụọ nke e kwenyere na ọ na-enye onyinye dị icheiche, ma na-akpọkwa mmadụ oku n’ụzọ dị iche iche.

Stanley Okorie kwuru sị, “Agwụ abụghị ihe ọjọọ, ọ bụghị arụsị,” .

“Agwụ bụ onyinye amara, onye ọbụla nwere agwụ nke ya. Agwụ nke m bụ egwu.”

Stanley Okorie kwuru na iti egwu maka ejije Nollywood na-enye ego, mana ọtụtụ ihe kwesịrị ịkawanye mma.

N’ọdị nso a, gọọmentị Naịjirịa na-ebo na ọ bụ ejije Nollywood na-eme ihe ọjọọ ji arị elu na Naịjirịa.

Mana Stanley Okorie kwuru na nke a abụghị eziokwu.

“Ọ bụ ihe dị n’obodo ka ejije na-ebupụta. Ụta adịrịghị Nollywood. Ụta dịịrị ndị ọchịchị.”

“Ọ bụrụ na ha chịa nke ọma, mee ihe ha kwesịrị ime, obodo ga-adị mma.”

Ndị mere akụkọ bụ Chukwunaeme Obiejesi na Vining Ogu.