Lee ọnọdụ ogige ndị idemmiri chụpụrụ n'ụlọ ha n'Anambra Steeti
Ndị gbara ọsọ ndụ n'ihu idemmiri n'Anambra arụọla ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka. BBC Igbo mere n'otu n'ime ogige ndị a dị na Crowther Memorial Primary School, Onitsha ịchọpụta etu ọnọdụ ndị a dị.
Ha kwuru na nsogbu ha gụnyere; enweghi akwa ndina dị mma nakwa nke zuru oke na ụfọdụ ha na-edina n'ala ụkpọrọ, ọzọ bụ agụụ maka na nri oriri anaghị ezu oke. Ha kọwakwara na ọnọdụ ahụike ha ezuchaghị oke maka idemmiri mekpara ha ahụ.

Otu onye nlekọta ahụike n'ogige ahụ bụ gwara BBC Igbo na ọtụtụ n'ime nwere ọrịa ebe n'ihi anwụnta na-ata ha, ọrịa oyi nakwa ndị ọzọ. Ọ gara n'ihu kwuo na ha na-agba mbọ inyocha ahụike ndị a ma nye ha ọgwụgwọ.
Cheta na idemmiri a malitere ịkpa ike n'izuụka ole na ole gara aga n'ihi mmiri ozuzu nakwa mgbape mba Kameruun gbapere ‘Lagdo Dam’ bụ ebe mmiri na-enye ọkụ latrik ike jikọrọ ọnụ.
Nke a metụtara steetị dịka Anambra, Kogi, Adamawa, Nasarawa, Benue, Taraba na ndị ọzọ. O gbuola mmadụ ruru mmadụ narị ise ma mebie ụlọ karịrị puku iri anọ na ise na Naịjirịa gbaa gburugburu.
Kirie n'uju ihe anyị chọpụtara n'ogige ahụ;



