Flooding in Anambra: Etu Idemmiri ka si na-akpa ikpe n'Ogbaru Anambra Steeti.
Idemmiri ka na-akpa ike na mpaghara Ogbaru nakwa ebe ndị ọzọ dị n’Anambra Steetị kamgbe ịzuụka ole ma ole ọ malitere.
BBC Igbo gagharịrị n’ụfọdụ obodo dị n’Okpuruọchịchị Ogbaru ịmata etu ọnọdụ si dị banyere idemmiri ahụ.
Onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na mmiri etojuola ọtụtụ ụlọ obibi, ụlọahịa, ụlọakwụkwọ, ọrụ ugbo nakwa okporoụzọ.
Ọ chọpụtakwara na idemmiri eriela ụfọdụ ebe ndị e ji mere ọdọ ndị gbara ọsọ ndụ a kpọrọ IDP camp.
Nke a gụnyere; Ụlọụka Anglikan dị n’Iyiowa-Udekpe na Ụlọakwụkwọ Central School Udekpe.

Ebe ndị ọzọ Idemmiri riri bụ Federal Polytechnic dị n’Atani, Comprehensive Healthcare dị n’Atani nakwa ụlọakwụkwọ Sekọndịrị dị n’Atani.
Idemmiri a metụtara steetị ndị dịka Kogi, Nasarawa, Benue, Taraba na ebe ndị ọzọ.
Gọọmentị etiti kwuru na o gbuola mmadụ ruru narị ise ma mebie ụlọ ruru puku iri anọ na ise na Naịjirịa.
Idemmiri a malitere n’ihi oke mmiri ozuzo nakwa ịgbape mba Kameruun gbapere ‘Lagdo Dam’ bụ mmiri na-enye ọkụ latrik ike jikọrọ ọnụ.
Ngalaba na-ahụ maka ihu eluigwe na Naịjirịa bụNigerian Meteorological Agency (NiMet) sị na idemmiri ka ga-akpa ike.



