Abuja Terror Alert: Etu ụjọ si jiri ndị mmadụ n'Abuja taa dịka Amerịka gbara ama mwakpo ndị oyi ndụ egwu

Jabi Lake Mall na US

Ebe foto si, Jabi Lake Mall/US MIssion

Egwu abaala ọtụtụ ndị bi n'Abuja, isiobodo Naijiria ahụ dịka gọọmentị mba Amerịka malitere ịkpọpụ ndị ọrụ ha ụfọdụ bi n'Abuja, n'ihi egwu mwakpo ndị oyindụegwu.

Nke a na-eso ama ha gbaburu n'izu gara aga na a ga-enwe mwakpo ebe ọbụla a na-enwe igwe mmadụ dịka ụlọụka, ọma ahịa, ọdọụgbọala nakwa ụlọọrụ nnochiteanya ndị mba ọzọ n'Abuja.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Mana Gọọmentị Etiti gọrọ agọ si na o nweghị ihe na-eme.

Ihe onyonyo fegharịrị gosiri ụgbọala ndị nnochiteanya n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja dịka ha na-eme njem isi Naijiria fepụ.

Nke na-eso akụkọ wuru ewu na ndị agha mba Amerịka na ụfọdụ ndị ọrụ uweojii nzuzo Naijiria a kpọrọ Department of State Services (DSS) wakporo otu ogige obibi dị na Lugbe, Abuja,a kpọrọ, 'Trademore Estate'.

A sị na otu onye a na-enyo na ọ bụ otu na ndị isi otu oyindụegwu ISWAP bi 'Trademore Estate' na-arụrụ otu ahụ ogbunigwe.

A nwuchie mmadụ abụọ n'ụlọ ya ma burukwa igbe ogbunigwe a hụrụ ebe ahụ, dịka ụlọntaakụkọ 'Guardian' siri kwuo.

Etu obodo siri kwụrụ ugbua

Nnyocha BBC Igbo mere n' ụtụtụ Fraide gosiri na okporoụzọ a ma ama dịka Amadu Bello Way, Gudu Road, Apo, Galadimawa/Jabi anaghị ekwo etu ha si ekwobu.

N'ụbọchị Tọzde, ụfọdụ ụlọọrụ na ụlọahịa dị n'Abuja mechiri emechi n'ihi egwu mwakpo.n

Ọ bụghị naanị ụlọọrụ, egwu ahụ metụtakwara ụlọakwụkwọ dịka ụfọdụ nne na nna ekweghị hapụ ụmụ ha gaa akwụkwọ.

Nnukwu ụlọahịa a ma ama n'Abuja bụ Jabi Lake Mall, mechiri n'ihi egwu mwakpo.

N'ozi ha wepụtara n'akara Instagram, Ndị nwe ụlọọahịa Jabi Lake Mall gwara ndị na-azụ ha ahịa na ha "ga-emechi taa bụ Tozde, abalị 27 nke Oktoba, afọ 2022."

"Mkpebi a bụ n'ihi nchekwa ndị ọrụ anyị nakwa ndị na-azụ anyị ahịa."

Ụlọahịa ahụ gara n'ihu kwuo na ha na-ele anya n'ọnọdụ nchekwa tupu ha ekwupụta oge ha ga-agbape ọzọ.

Otu onye bi Abuja bụ Obinna Ukaejiofor, gwara BBC Igbo na "Ụjọ ji onye ọbụla."

Ihe ndị Jabi Lake Mall dere n'Instagram ha

Ebe foto si, Screenshot

Ukaejiofor kwuru na "Onye ọbụla na-eke nkwụcha."

"Ọtụtụ ụlọnri, ebe a na-akwari ndụ na-eke nkwụcha. Ndị mmadụ anaghị apụtasi ebe ndị a etu ha si apụta kemgbe a mara ọkwa maka mgbapụ ogbunigwe."

Kpachi kpachi okporoụzọ belatakwara dịka ụfọdụ mmadụ na-ejizi ụkwụ aga mkpa ha, ebe ụfọdụ ndị ọrụ sizi n'ụlọ arụ ọrụ ha.

Ukaejiofor gara n'ihu sị, "Okporoụzọ niile ndị a ma ama kpachi kpachi na-erubu nkeji 45, ị bazie ugbua ị nọọ naanị nkeji 10, ị gafere."

Chikamdịnaka Ofoegbu gwara BBC Igbo na ya si n'ụlọ arụ ọrụ.

" Ndị mmadụ ka na aga mkpa ha mana ndị mmadụ ji nkwụcha aga."

Lai Mohammed

Ebe foto si, Ministry of Information

Ihe Gọọmenti, ndị ọrụ nchekwa na-ekwu

N'ozi ha, Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na Naijirịa bụ Lai Mohammed, ekwuola na Gọọmentị Naijirịa agaghị etinye onwe ha na gbagharịa maka ama mba Amerịka gbara na ndị oyindụegwu ga-awakpo Abuja.

Nke a bụ dịka mba Amerịka, Kanada, Ọstrelia na Briten bidoro ịkpọla ndị ọrụ nnọchiteanya ha nọ n'Abuja dịka ha gbara ma sị na e nwereike ịwakpo ụlọọrụ gọọmentị, ụlọụka, ụlọakwụkwọ na-ebe ọzọ ndị mmadụ na-agbakọ.

Ọdụ ndị njem ụgbọala n'Abuja
Nkọwa foto, Ọtụtụ ọdụ ndị njem ụgbọala n'Abuja mepere emepe

Kedụ ka Abuja dị?

Ndị mmadụ ka na-aga mkpa ha dịka onye ntaakụkọ BBC n'Abuja siri hụ. Ụlọahịa, ụlọakụ, ọdụ ndị njem mepechara emepe.

Otu nwoke na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ụjọ anaghị atụ ha

"Anyị na-ebi ndụ anyị etu anyị sibu ebi, anyị gara ọrụ taa"

Ọ gara n'ihu kwuo "Anyị jikwa anya anyị ahụ na ọtụtụ ndị nchekwa jupụtara ebe niile n'oge a mana ndụ anyị na-aga etu o sibu aga mana e keela nkwụcha dịka ozi gọọmentị siri kwuo."

Ihe Amerịka kwuburu

Ụlọnnọchiteanya Amerịka

Ebe foto si, AFP

N'abalị 23 nke ọnwa Ọktoba afọ 2022, ụlọnnochiteanya Amerịka na Naịjiria wepụtara ozi mgbaama na-ekwu na "e nwere ike inwe mwakpo na Naijiria, ọkachasị n'Abuja.

N'ụlọ gọọmentị, ebe okpukperechi, ụlọakwụkwọ, ahịa, ụlọahịa, ụlọnkwari, ụlọ mmanya, ọgbakọ asompi egwuregwu, ọdọụgbọala, ogige ndị ọrụ nchekwa nakwa ụlọọrụ mba ndị ọzọ."

Ha dọrọ aka na ntị ka "ndị mmadụ gbaara oke njem maọbụ ngagharị ọsọ, mụrụ anya ma kwụnye ekwentị ha n'ọkụ iji dị njikere."

Ozi ụlọnnọchiteanya Amerịka ziputere

Ebe foto si, screenshot

Ozi ụlọnnọchiteanya Amerịka ziputere

Ebe foto si, screenshot

Ka ndị mmadụ ka na-eche maka ya bụ ozi, ha wepụtara ọzọ n'abalị 26 nke ọnwa Ọktoba, afọ 2022, nke kwuru na ha enyela ndị ọrụ na ndị ezinaụlọ ha ndị chọrọ, ohere isi n'Abuja pụọ n'ihi ihe egwu nwere ike ime.

Mana egwu dagharịrị ụnyaahụ bụ abalị 27 nke ọnwa Ọktoba dịka ụlọọrụ ahụ nyere ndị ọrụ ha iwu isi Abuja pụọ ozugbo n'ihi ihe egwu a na-ele anya ya.

"Anyị na-adụ ọdụ ka ụmụamala Amerịka ghara ịga Abuja ugbua."

Briten, Kanada, ndị ọzọ esonyela na mba dị mara ọkwa mwakpo Abuja

E wezụga Amerika mmadụ ndị ọzọ gbarala nụmụamala ha ama ka ha zere Abuja n'ihi egwu mwakpo ndị oyinduegwu eruola ise.Mba Briten, Kanada, Ireland akwa Ostralia ezipụtala ozi na-ekwu na ndị oyindu egwu na-akpa nkata iwakpo Abuja.

Ha wepụtara ozi ụbọchị Wenezde na-adọ ụmụamala ha aka na ntị ka ha ghara ịga Abuja.

N'abali 26 nke ọnwa Oktoba,Briten sịrị, “Anyị na-adụ ndị mmadụ ọdụ megide ị ga Abuja belụsọ ma ọ dị n’ezi mkpa.”

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Ozi nke mba Kanada kwuru sị, " E nwere ike inwe mwakpo ndị oyindụ egwu n'Abuja.""Ebe ha na-ele anya ịwakpo gụnyere ụlọọrụ gọọmenti, ụlọ ahịa, ụlọ ndina, ụlọmmanya, ọgbakọ igwe mmadụ, ụlọọrụ mba ndị ọzọ, ụlọọrụ njem, ụlọakwụkwọ, ahịa, ebe okpukperechi, nakwa ogige ndị ọrụ nchekwa."

Ndị uweojii, Ndịagha sị na ha anaghị eme nkụja

N'agbanyeghị agụgọ Gọọmentị Etiti na onweghị ihe ga-eme, onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Usman Alkali Baba ekwuola na ndị isiọrụ ya nọ mpaghara dị iche iche ejikerela maka ihe ntụmadị ọbụla.

N'ozi nke ndị uweojii wepụtara n'akara Twir n'abalị Tọzde, Baba gara n'ihu gbaa n'anwụ akara ekwentị ọha ụmụ Naijiria nwere ike iji bekuo ndị uweojiii ma ọ bụrụ na e nwee nsogbu nchekwa dapụta ebe ha nọ.

Ozi si n'aka Onyeisi ndị uweojii NAijiria

Ebe foto si, NFP/Twitter

No'otu aka ahụ, ndị agha Naijiria kwuru na ha dị njikere maka ọdachị ọbụla ma gbaa aama ekwentị e nwere ike iji kpọtụrụ ha maa enwe nsogbu nchekwa.

Ozi ndịagha Naijria

Ebe foto si, Nigerian Army/Facebook