Ihe mere anyị ji ziga ndịọrụ nchekwa n'ụlọụka St Martin Ihiala - Diocese Nnewi

Bishop Jonas Benson Okoye

Ebe foto si, Nnewi Diocese/Anambra Govt.

Akụkọ pụtara n'ụtụtụ taa bụ Fraịde, Nọvemba 18, na-ekwu na a hụrụ ụmụ okorobịa bu egbe, kpuchie ihu ha, ka ha wakporo ụlọụka Katọlik St Martin of Tours dị n'Ihiala, Anambra Steeti.

Ndị bi na mpaghara ahụ kwuru na ọ bụ ndị ụkọchukwu abụọ ka ha hụrụ ebe ha kpọ ndị ọrụ nchekwa 'Anambra Vigilante Group' (AVG) bata n'ogige ụlọụka ahụ na mgbede abalị ụbọchị Tọzde, Nọvemba 17.

Akụkọ ahụ kwukwara na ndịọrụ nchekwa ahụ jidere ndị na-eche nche n'ụlọụka ahụ kee ha agbụ ma napụ ha akụrụngwa ha ji arụ ọrụ.

Mana ndị Diocese Nnewi agwala BBC Igbo na akụkọ ahụ na-efegharị abụghị eziokwu n'ihi na ọbụ ihe mere eme chaachaa.

Ilechukwu Chisom, bụ ụkọchukwu ji ọkwa osote 'chancellor' na Dayọsis Nnewi, kwuru na ọ bụ iji kwụsị etu ndị ohi si awakpo ụlọụka Katọlik dị icheiche kpatara Bishọp ji ziga ndị nche AVG na St Martin.

Ndị nche anaghị emekpa onye ọbụla ahụ

Fr Ilechukwu kwuru na ọ bụ eziokwu na ha zigara ndị nche AVG n'ụlọụka St Martin, mana ọ bụ iji chekwaa ebe ahụ, ọ bụghị imekpa ndị mmadụ maọbụ ndị Fada nọ ebe ahụ ahụ.

"N'ọdị nso a, ndị ohi awakpoola ụlọụka abụọ dị na Dayọsis Nnewi ma zuru 'Blessed Sacrament' dị ebe ahụ: St Christopher Ihiala na 'All Saints, Oraifite'," Fr Ilechukwu kwuru na mkparịtaụka ekwentị ya na BBC Igbo nwere.

"N'ihi nke a, nakwa n'ihi na anaghịzi aka ụka n'ụlọụka St Martins Ihiala, maka na Bishọp anapụla ndị ụkọchukwu nọ ebe ahụ ikike ịka Mass, ọ bụ ya mere anyi ji ziga ndịọrụ nchekwa ebe ahụ iji chekwaa ụlọụka ahụ."

Ilechukwu kwuru na onweghị onye ọbụla ndị ọrụ nchekwa ahụ mekpara ahụ chaachaa, onweghị onye ha tiri ihe ọbụla, n'ihi na Bishọp dọrọ ha aka na ntị ka ha ghara imekpa onye ọbụla ahụ.

"Ya mere akụkọ ahụ na-efegharị nke na-ekwu na ndị AVG kere ndị nche nọ n'ụlọụka ahụ agbụ, bụ nnukwu asị," Fr Ilechukwu kwuru.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ndị ụkọchukwu Spiritans ka bi n'ogige ụlọụka St Martins, mana ha enweghịzi ikike ịka ụka maọbụ ime sakramentị ọbụla.

Gịnị na-esere ndị Fada “spiritans” na Bishọpụ Diocese Nnewi

Cheta na Bishọp ụka Katọlik na Nnewi bụ Jonas Benson Okoye, na ndị ụkọchukwu 'Spiritans' na-arụ ọrụ na St Martin of Tours Ihiala na-enwe nghọtahie.

Nghọtahie a mere ka Bishọp Okoye gwa ndị ụkọchukwu Spiritan ka ha si n'ụlọụka St Martin pụọ, mana ha ekweghị dịka ha kwuru na Bishọp enweghị ikike inye ha iwu ihe ha ga-eme.

Nke a mere ka Bishop Okoye napụ ndị ụkọchukwu ahụ ikike ido maasị nakwa ịrụ ọrụ ndị ọzọ e ji mara ndị ụkọchukwu.

BBC Igbo kpọtụụrụ otu onye ụkọchukwu nọ n'otu ndị 'Spiritan', mana o kwuru na ha agaghị ekwu okwu ọbụla maka ya n'ihi na ya bụ okwu agaruola Rome bụ isi obodo ụka Katọlik.

Ụkọchukwu a na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ mgbe e kpebiri ya bụ ikpe na Rome ka ha nwereike ikwu okwu banyere ya.

Fada Chisom Ilechukwu, bụ osote Chancellor Nnewi Dayọsis, kwukwara na ọ bụ eziokwu na okwu ahụ dịzi na Rome ugbua.