Ihe na-esere ndị Fada “spiritans” na Bishọpụ Diocese Nnewi gbasara ala St. Martin of Tour Parish

Ebe foto si, Catholic Diocese of Nnewi
Ndi ụka katọlịk ekwuola nke bụ eziokwu gbasara okwu na-ada n'etiti ndị fada "Spiritans" na Bishọpụ ụka katọlik nke Nnewi Diosis.
Rev. Fr. Martin Onwudiwe bụ onyeisi mgbasa ozi ụka katọlịk na Nnewi sị na ọnweghị mgbe Bishọpụ ha bụ Jonas Okoye chụpụrụ ndị ụkọchụkwu "Spritan" ahụ.
Kama na ihe mere bụ na Bishọpụ napụrụ ha ikike ido ụka massị maka mgba okpuru ọ sị na ha na-agba ụka.
Ọ sị na ọ bụ ihe abụọ butere nsogbu ha na Bishọpụ Okoye.
Nke mbụ bụ na ndị "Spiritan' fada na-ebo na Bishọpụ chọrọ ịnapụ ha ikike ido massị na ụka e nyere ha bụ St. Martin of Tours Parish, Ihiala.
Ọnụ na-ekwuru ụka Katọlịk na Nnenwi bụ Fr. Onwudiwe kọwaara BBC na Ihe mere Bishọpụ jiri napụ ndị Fada ahụ ikike ido massi bụ maka na ha na-enupuru ya isi.
O kwuru na nke ọzọ bụ na ndị fada ahụ ekweghị atụta ụtụ ego ala ndị obodo nwe ala ebe ụka dị na-ala.
Ọ sị na ndị obodo nwe aka na Bihọpụ kwekọrịtara na a ga-enye ha nde narị ịrị na ise (N15,000,000.00) bụ nke ndị fada "Spiritan" ahụ jụrụ ịtụta.
Nke abụọ bụ na mgbe Bishọpụ zitere fada ọzọ ga-anọ n'ụka St. Martin of Tours Parish, Ihiala ka ọ malite ụka ebe ahụ, "ndị fada Spiritan" kpọchipụrụ ya ụzọ chọchị", nke mere ya bụ fada jiri doo masị n'elu ụgbọala ya.
Ọ sị na, "ha dọkwara ya bụ fada aka na ntị ya abịakwala ọzọ, maọbụ ha apịa ya ihe"
Mana mgbe fada ahụ bịara ọzọ, o ji ndi nche nke mere na ha apịaghịzi ya ihe ka ha siri kwuo.
Ọ sịkwa na ha kwechikwaara jụ na Bishọpụ agaghị eme ụka ahụ parish nke ya.
Mgbe BBC kpọrọ ndị fada "Spiritan" ha enweghị ike iburu ekwentị ha, mana anyị ka na-agbalị iweta ha.









