A tọhapụla Fada ụka Katọlịk a tọọrọ n’Ụmụnneochi nke Abịa steeti

Ebe foto si, Chikezie Nwadike
Akụkọ na-adapụta taa bụ Mọnde ụbọchị 15 nke ọnwa Ọgọst na-ekwu na a tọhapụla Fada Chinedu Nwadike nakwa onye Semịnerịan bụ Emmanuel Nwafor so ya nke a tọọrọ n’ụbọchị Fraịde.
Cheta na ndị tọọrọ Fada Nwadike zigaara ezinụlọ ya ozi na ha chọrọ Narịa nde iri ise maka mgbapụta ya.
Ugbua, enwebeghị ozi ịgba ama kwuru ma ha a kwụrụ ya bụ ụgwọ mgbapụta maọbụ na ha akwụghị ya.
Onye nọ nso ezinaụlọ Fada ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na “A tọhapụrụ mmadụ abụọ a n’akụkụ okporoụzọ Nnochi – Ihube n’ụbọchị ụka, nke bụ ebe a tọọrọ ha na Fraịdee”
O ji ọṅụ kwuo “Soronụ m ṅṅụrịa n’ihe ozi ntọhapụ a, enweghị ihe ọbụla e mere mmadụ abụọ, ahụ zuru ha oke”.
Nwanne nwoke Fada Nwadike bụ Chikezie Nwadike kwuru na obi dị ha ezigbo mma maka ntọhapụ a.
Cheta na ndị ojiegbe tọkwara onye uweojii Naịjirịa n'okpuruchọchị ahụ n'ụbọchị Satọdee mana enwebeghị ozi maka ntọhapụ ya ugbua.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abịa steeti bụ Geoffery Ogbonnaya gwara BBC Igbo na enweghị ozi e zitere ha banyere ntọọrọ maọbụ ntọhapụ Fada ahụ ruo ugbua.
Ọ gara n'ihu kwuo "Naanị kepụ kepụ ka m nụrụ nke sị na a tọọrọ Fada ahụ".

Ebe foto si, Getty Images
Etu e si tọrọ onye uweoji DCPO
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Kọmịshọna mgbasaozi n’Abia steeti bụ Eze Chikamnayo agbaala ama na ọ bụ eziokwu na ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n’obodo Mbala nke Isuochi dị n’okpuruọchịchị Umunneochi na steeti ahụ.
Chikamnayo kwuru “Ndị ojiegbe a tọọrọ nwoke a ọkwa ya n'ọrụ uweojii bụ Divisional Crime Police Officer (DCPO) na ngwụcha izu a”
Ọ kọwara na ihe a dị mwute ma kọwa na gọọmentị Abịa steeti ezigala ndị ọrụ mgbapụta maka ndị a tọọrọ (Anti-kidnapping squad) ebe ahụ ka e nweeike gbapụta nwoke a.
Chikamnayo kwukwara “Enwebeghị ozi anyị nụrụ n’aka ndị a ma ha a chọrọ ego mgbapụta ọbụla”.
Otu nwoke si obodo Mbala na-achọghị ka akpọọ aha ya kọwara na obodo ha nọ n’ezigbo ọnọdụ ụjọọ n’ihi ihe a mere. O kwuru “Ndị ojiegbe a wụbara n’ogige ndị uweojii a n’etiti ehihe”
“Anyị anaghịzị agagharị maka ụjọọ, ihe a na-emetụta azụmahịa anyị nakwa akụkụ ndụ anyị niile”.
E kwukwara ndị uweoji ndị ọzọ gbara ọsọ na mwakpo ahụ ebe ndị ojiegbe ahụ jidere nwoke ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Etu e si tọrọ ụkọchukwu ụka Katolik n’Umunneochi
Akụkọ si okpuruọchị Umunneochi na ngwụcha izu a gara aga kwuru na ndị ntọ tọọrọ otu ụkọchukwu ụka Katolik na-ekwu ka e nye ha nde naira iri ise iji gbara isi ụkọchukwu ahụ.
A tọọrọ Fada Chinedu Nwadike n’ Umunneochi dị n’Abia steeti dịka o si mahadum ‘Spiritan University’ dị na Nneochi ebe ọ na-arụ ọrụ na-aga Enugwu n’okporoụzọ awara awara si Okigwe gawa Enugwu ụbọchị Fraide.
Otu onye metụtara Fada Nwadike anyị achọghị ịkpọ aha ya kwupụtara na nke a bụ nke ugboro abụọ ụkọchukwu ahụ na-adanye n’aka ndị ntọ nso nso a.
Onye ahụ gbakwara ama na atọrọ nwoke Semịnarịan ya na Fada so aga njem a.
Nwanne Fada Nwadike gwara onye ntakụkọ a na ha na-ekpere Fada ahụ na onye Semịnarịan ahụ ezigbo ekpere ọma ka ha lọgachite n’udo.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abịa bụ Ogbonnaya kwuru n'ụbọchị Mọnde na ọ bụ eziokwu na a tọọrọ nwoke onye uweojii ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo "Anyị ga-ezịpụta ozi banyere nke a nakwa ọnọdụ etu ihe siri kwụrụ n'ụbọchị Tuzde".
Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Eze Chikamnayo kwuru na ya anụbeghị akụkọ ntọrọ Fada ahụ.

Ebe foto si, AFP
Ihe mere ọnọdụ nchekwa jiri dị njọọ n’okpuruọchịchị Umunneochi
Chikamnayo boro ebubo na ihe so na-etinye akụkụ okpuruọchịchị Umunneochi n’ọnọdụ ọjọọ ha nọ n’ime ya ugbua bụ ndị a na-eche na ha bụ ọchị ehi so awụbata mpaghara ahụ aghara aghara n’ihi ahịa ebe a na-ere ehi dị n’Umunneochi.
O kwuru “Etu ndị mbịarambịara a na-eche bụ ndị ọchị ehi siri awụbata ebe ahụ so akwanye ọkụ n’ọnọdụ enweghị nchekwa ebe ahụ, ọkachasị n’ọrụ ọjọọ nke ịtọọrọ ndị mmadụ”
“Ihe a abụrụla ụzọ ịkpa ego nye ndị a maka uru agbagba ego mgbapụta ndị mmadụ na-akwụ ha”.
“Cheta na ọ bụ n’akụkụ ebe ahụ ka a tọọrọ onyeisi ụka Metọdịstị bụ Samuel Kanu-Uche na nso nso a”
O kwukwara na ihe ọzọ dị mkpa bụ na okpuruọchịchị Umunneochi nọ n’etiti mpaghara ọwụwa anyanwa niile nke bụ na ha na Imo, Anambra, Ebonyi nakwa Enugu steeti nwere ebe ala jịkọrọ ha.
N’okwu ya, ọ sị “N’ihi etu ndị ọrụ nchekwa siri achụ ndị omekome nakwa otu ndị ojiegbe dị icheiche ọsọ ụkwụ eru ala n’akụkụ Anambra nakwa Imo steeti, ọtụtụ n’ime ha na-awụbatazị Umunneochi ezo”

Ebe foto si, Okezie Ikpeazu/Facebook
Gịnị ka Gọọmentị Abịa steeti na-eme maka nke a?
Dịka ọtụtụ ndị bi n’okpuruọchịchị Umunneochi zịgarala gọọmentị ozi iti mkpu maka ọnọdọ nchekwa ebe ahụ, Chikamnayo gwara BBC Igbo na gọọmentị Abịa steeti hibere kọmịtịị nchekwa ọhụrụ na nso nso a nke a kpọrọ ‘Umunneochi Special Security Committee’.
O kwuru “Gọọmentị Abịa enyela ndị a ikike ịrụ ọrụ ebe ahụ ọkachasị innyochapụta ndị ntọọ”
“Kọmịtịị a nwere ndị maa ala ebe ahụ nke ọma n'ime ha nke gụnyere ndị Eze, ndị ọchịchị na ndị isi otu obodo bụ ihe Bekee na-akpọọ ‘Town union’”.
O kwukwara na gọọmentị Abịa steeti nyere ndị a ụgbọala nakwa akụrụngwa ndị ọzọ ha ga-eji arụ ọrụ ha n’uju.










