Salman Rushdie: Gịnị dị n'ime akwụkwọ o dere na-ese okwu?

Ebe foto si, Getty Images
Salman Rushdie, onye dere akwụkwọ ‘Satanic Verses’ nke nọbụ n’ọnọdụ ọ-dị-ndụ-ọnwụ-ka-mma ekwuwela okwu, ebe dịka ndị dọkịta wepụrụla igwe e ji eku ume akwụnyere ya kemgbe a wakporo ya ụbọchị Fraide..
Nwoke a kpọrọ Hadi Matar Rushie ebe ọkwụ na-ekwu okwu n’ọgbakọ ndị edemede e mere na New York dị n’ Amerika, sụkaziri n'afọ nakwa n'obi tupu ndị nọ nso na ndị ọrụ nchekwa egbobido ya.
N'ụbọchị Satode, ndị nọ ya nso kwuru na o merụụ nnukwu ahụ nke bụ na o nwere ike ọ gaghịkwa eji otu anya ya ahụ ụzọ ọzọ.
Rushdie bu na-ede akwụkwọ a ma ama edeela ọtụtụ akwụkwọ gụnyere "Grimus", "Shame", 'Midnight's Children bụ nke ritere ya nturuugo nwere agba bụ "Booker Prize" nn'afọ 1981.
Gịnị ka o dere na-ese?

Ebe foto si, Getty Images
Satanic Verses bụ akụkọ ifo banyere ndị ụka Alakụba abụọ bi n' Ingland.
Otu n'ime ihe na-ewe ndị okpukperechi Alakuba iwe n'akwụkwọ Satanic Verses bụ na Rushdie nyere akwụkụna abụọ nọ n'ime akwụkwọ ahụ aha nwunye Mohammadu abụọ.
Aha akwụwkọ ahụ sikwa na ama okwu abụọ e kwuru na Mohammed wepụrụ n'akwụkwọ Nso Koran bụ nke Mohammerd kwenyere si n'aka ekwensu.
Ihe Rushdie ji isi kote
Mana Rushdie kpara agụ nọ n'ụra aka n'ọdụ n'afọ 1988 oge o bipụtara akwụkwọ nke ọ kpọrọ, 'Satanic Verses," bụ akwụkwọ o .
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akwụkwọ ahụ wuru ewu na ụwa ma kpasuo ndị ụka Alakuba na mba ụwa iwe dịka ha hụtara akwụkwọ ahụ dịka mkparị nye okpukprechi chi ha na onye Amụma ha bụ Mohammed.
Ọtụtụ ha mere ngagharịiwe maka ya ma mebie ihe.
E gburu mmadụ 12 na obodo ya bụ Mumbai, tụọ ụlọnnochite anya mba Briten dị na Tehran okwute.
Iwe mere ka onyeisiala mba Iran oge ahụ bụ Ayatollah Ruhollah Khomeini, nyee ntuzi aka 'fatwa' n'isi n'afọ 1989, na-akpo oku onye hụrụ nwa amadi ahụ, ya gbuo ya bụ nwa amadị a mụnyere n'ezinaụlọ ndị ụka Alakụba.
Mana ndị ọkammụta na ndị gụwara isi kwuru na nke a megidere ikike dịịrị Rushdie ikwu uche ya
Iran jikwa iwe sị na ha na mba Briten agaghị enwekwa mmekọ ọzọ.
Rushdie malitere zọwa isi onwe ya ma na-ebigharị na nzuzo ihe karịrị afọ iri.
E nyekwarere ya nchekwa ndị uweojii mana Rushdie , onye ka na-ede akedemede malitere ịpụtawa n'ọha na nsonso a. na-ekwukwa maka ikike mmadụ nwere ikwu uche ya na enweghị mgbochi ọbụla.
Ọ dị ndị na-eme nka mana ụfọdụ ndị nyere ya aka tụgharịa akwụkwọ ya ahụ n'asụsụ ndị ọzọ tụnyere isi ha.
Ọ nọ n'ọnọdụ a rute nsonso a ọ malitere pụawa
A sugburu Hitoshi Igarashi, bụ onye tụgharịrị akwụkwọ Satani Verses n' asụsụ Japan na mahadun dị na Tokyo n;ọnwa Julai afọ 1991.
N'otu afọ ahụ, a sụrụ Ettore Capriolo, bụ onye tụgharịrị akwụkwọ ahụ n'asụsụ Italy mma na Milan mana a zọtara ndụ ya.
A gbara William Nygaard, bụ onye Norway egbe n'afọ 1993 na nso ụlọ ya dị n'Ohio mana ọ nwụghị.

Ebe foto si, Getty Images
Onye bụdị Salman Rushie?

Ebe foto si, Getty Images
Ahmed Salman Rushdie bụ onye India a mụrụ na Bombay nke a ma taa dịka Mumbai n'abalị 19 nke ọnwa Juun afọ 1947, ka ọ gachara ọnwa abụọ India jiri nwere onwe ha n'aka mba Briten.
Ọ gawara mba Briten ka ọ dị afọ 14 bụ ebe ọ nọ gawa akwụkwọ
Ọ gụrụ 'History; na 'Kings College' dị na Cambridge.
u.was forced into hiding after the publication of his 1988 novel, The Satanic Verses. It took nearly a decade for Rushdie to become more vocal and visible — though he continued to write stories. Today, Rushdie is widely known for being a vocal defender of artistic expression.











