Etu nwoke a si tigburu nwunye ya, si gbuo onwe ya

Ebe foto si, Ibeh's family
Ndị uweojii Niger steeti ekwuola na ha na-enyocha ọdachi metụtara otu nwoke a si tigburu nwaanyị ya ma gbuo onwe ya na Suleja dị na Niger steeti.
A na-ebo ebubo na Adeniyi Jose gbara afọ 45, onye Akure dị n'Ondo steeti tigburu nwunye ya bụ Chidịnma Gloria Jose (na-azabu Ibeh), gbara afo 39, Onye Imo steeti , n'ụlọ ha n'ụbọchị Monde abalị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2022 ma gbalia igbu onwe ya site n'ịṅụ nsi.
Ndị uweojii bugara ya na nwunye ya ụlọọgwụ 'General Hospital Suleja' ebe ndị dọkịnta nọ kwuo kpomkwem na nwaanyị ahụ anwụọla ma malite inye nwoke ahụ nleta.
Mana dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Niger steeti bụ Wasiu Abiodun si gwaa BBC Igbo n'ekwentị n'ehihie Wenezde, na nwoke ahụ nwụrụ dịka ọ na-anata nleta n'ụlọọgwụ.
Abiodun sịrị, "Anyị hụrụ ozu nwaanyị ahụ ka ụdọ dị ya n'olu, ebe di ya nọ n'ọnụ ọnwụ dịka a hụrụ ihe na-egbu egbu nke e chere nwoke ahụ ṅụrụ."
"Nwoke ahụ bụ di nwaanyị ahụ mechara nwụọ dịka ọ na-anata nleta n'ụlọgwụ.
Nwanne nwaanyị a nwụrụ anwụ bụ Brenda Ibeh gwara BBC Igbo na di nwanne ya nwaanyị, gburu nwanne ya nwaanyị , ma kpọtara nne ha nwa nwa ya n'ọdọahịa ya , gwa ha na nwunye ya pụrụ apụ.
Mana oge ha kpọgidere nwanne ha nwaanyị ọ zaghị ekwentị ya, ha gara n'ụlọ ya hụ na ụzọ kpochiri akpochi.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
"A kpogidere m nwanne m nwaanyị ọzaghhị ekwentị ya."
" Nwanne m nwaanyị abụghị onye na-eme etu a.
Ọ pụwa, ọ na-ekwu ebe ọ na-aga, ịkpọ ya n'ekwentị, ọ nọghị ya , ọ ga-akpọghachi gị."
" Ya mere m jiri gawa be ha ebe Elekere ise nke mgbede, ruo ebe ahụ ebe nile kpọchri akpọchi."
A dọkara m netị dị na windo ha were hụ td ya ebe ọ tọgbọ, "Akpọrọ m onye nyere m aka agbaka ọnụ imeụlọ ebe m hụrụ ozu nwanne m nwaanyị n'ọtọ .
Brenda onye kwuru na ọ bụ ya gbuchiri nwanne ya akwa kwuru na ha gara kpọ ndị uweojii bụ ndị bịara buga nwanne ya nwaanyị na di ya ụlọọgwụ.
Ọ kọwara nwanne ya nwaanyị bụ onye na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ 'General Hospital Suleja' dịka onye na-agba mbọ nakwa mmadụ ọha.
N'okwu ebubo na-efegharị na soshal midia na ọ bụ maka ịgba n'iro ka di ya ji gbuo nwanne ya nwaanyị, Brenda kwuru na ebubo ahụ bụ okpotokpo asị.
" Nwanne nwaanyị bụ onye ị ga-ama ebe ọ nọ mgbe ọbụla.
Brenda, onye kọwara na di Niyi gbalibuola igbu nwunye ya mbụ kwuru na ụfọdụ mgbe nwunye ya chọrọ ịhapụ ya na ọ majara ya kwuo na ọ hapụ ya, na ya ga-egbu onwe ya.

Ebe foto si, Ibeh's family
Ihe ndị ma maka di na nwunye a na-ekwu
Ụfọdụ ndị ma maka di na nwunye ahụ nwụrụ na-atụ arịrị ọnwụ nwunye ya.
Otu n'ime ha nyere aha ya dịka Pamela Nekky kọwara na ya na Chidinma gara akwụkwọ ọ na "Nasaarawa State Polytenic.'

Ebe foto si, Ibeh's Family









