"M na-agwa ndị Ipob na a na-emegide anyị na Naịjirịa, ọ bụghị igbu onwe anyị bụ etu..." - Prelate Uche Kanu

Aha onyonyo, Prelate Uche Kanu: Ị na-asị ka m akwụla ndị ntọrị ụgwo ị chọrọ ka m nwụọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisi ụka Metọdist na Naịjirịa bụ Prelate Samuel Uche kanu bụ onye a tọọrọ ma tọhapụ na Mọnde 30 Mee, 2022 akọwaala ihe ọ hụrụ n'aka ha.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Kanu sị nke a mere n'obodo Leru dị n'Abia Steetị mgbe ha si emume ụka n'Isuochi na-aga ọdọụgbọelụ.

Na ndị Fulani na-achị ehi wakporo ma tọrọ ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ gụnyere Bishọpụ Owerri.

Ndị ahụ kpọọrọ ha gawa n'ọhịa na-eti ha ihe, "mgbe ahụ ka m meruru m ahụ n'anya aka nri m bụ nke gbawara ọbara, mana ụmụaka ahụ achọghịdị ịma".

| "M na-agwa ndị Ipob na a na-emegide anyị na Naịjirịa, ọ bụghị igbu onwe anyị bụ etu..." - Prelate Uche Kanu |

Prelate Kanu sị na ndị a sị ha kwụọ otu nde narị naịra na nde iri ise, mana ha mechara kwete ka ha kwụọ otu nde narị naịra.

Ndị a nwuchiri ha n'ime ọhịa ahụ ruo otu ụbọchị tupu ha akwụọ otu nde narị naịra ahụ.

Ọ sị na ọ bụ ndị ụka Metọdist tụkọtara ego e jiri tọhapụ ya.

Ọ gara n'ihu boo ebubo na ndịagha Naịjirịa nọ nso n'ebe a tọọrọ ha ma maka ndị ntọrị ha na arụ ha na-akpa.

Kedụ ihe ndịagha Naịjirịa kwuru?

Ndịagha Naijirịa gọọrọ onwe ha n'ebubo a Prelate Kanu boro ndị ọrụ ha ma sị na okwu ahụ abụghị eziokwu.

Nke a dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Onyema Nwachukwu wepụtara ma sị na nke ahụ abụhị ihe e ji maara ndịagha Naịjirịa.

Ha gara n'ihu kwuo na ha ga-akpọ Prelate Kanu oku ka ọ bịa kọwaa ihe o kwuru.