Prelate Samuel Kanu Uche: Onyeisi ụka Methodist ga-akọwara anyị etu aka ndịagha sị dị n'ihe mere ya - Ndịagha Naijiria

Onyeisi Ụka Methodist Dr Samuel Kanu Uche na ndịagha Naijiria

Ebe foto si, Methodist Church/Nigeria Army

Ndịagha Naijiria agọrọla onwe ha n'ebubo na-efegharị nke na-ekwu na aka ndịagha Naijiria dị na ntọrọ onyeisi ụka Methodist na Naijiria bụ Dr Samuel Kanu Uche.

Ndị omekome tọọrọ onyeisi ụka Methodist na Naijiria bụ Dr Samuel Kanu Uche, Bishopụ Dennis Mark na Rev Jeremiah Shittu, Ụbọchịụka, abalị 29 nke ọnwa Mee, afọ 2022 n'ụzọ Leru ndị n'ụmụnneochi dị n'Abia steeti, dịka ha si Abia aga ọdọụgbọelu Owere.

Onye gwara ndị ntaakụkọ na mkparịtaụka ka a tọhapụrụ ha ka ha kwụchara (nde narị N100m) iji gbara isi nwere onwe ha, Uche sị na ndịagha nọ nso ebe ndị a na-enyo na ha bụ ndị uweojii wakporo ha, mana ha agbataraghị ha ọsọ enyemaka.

N'akwụkwọ mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ndị agha Naijiria bụ Nwachukwu Onyema binyere aka ma wepụta ụbọchị Wenezde, Juun 1, 2022, ndị agha kwuru na aka ha adịghị ya.

Ha kwuru na "ndị agha Naijiria anaghị agbado ụkwụ n'agbụrụ onye si ezipụ ndị otu ha n'ihu ọrụ, ya bụ na izipụ ndị agha bụ Fulani dịka Prelate si bo n'ebubo abụghị omenala anyị.".

"Aka a na-atụ na aka ndịagha dị n'ihe mere agbadoghị ụkwụ na nnyocha, ya bụ na ọ bụghị ihe a ga-ewere kpọmkwem na ọ bụ ihe mere."

"E kwesịrị inyocha ebubo nke nwere ọtụtụ ajụjụ asaghị asa."

Ajụjụ ha gụnyere "dịka e nwere ndakpọ nchekwa na mpaghara ahụ, e wegaara ndị agha nọ na mpaghara ahụ mkpesa? Ụka Methodist agara gbanyere ndịagha Naijiria izu oge ha na ndị ntọ ahụ na-adọ ndọrọ ndọrọ ego ole ha ga-akwụ n'isi ndị ha ji?"

"O nweghị mkpesa ọbụla ngalaba ndịagha ebe ahụ nwetara. Nke kachasị njọ bụ na akwụrụ ego mgbara isi na-erughị awa 24."

"Ọ bụ ndịagha ka a kwụrụ ego mgbara isi a?"

Ha kwuru na ndịagha nọ na Forward Operating Base (FOB) dị n'Okigwe nakwa ndị nọ n'ihu mahadum Abia State University Uturu enwetaghị mkpesa ọbụla, nke ndị nọ n'ogige 14 Brigade, kama ọ bụ akụkọ na-efegharị na soshal midia.

Ihe ndị uweojii kwuru maka onyeisi ụka Methodist atọhapụrụ

Ndị uweojii Naịjirịa asaala Samuel Kanu Uche

Ebe foto si, AFP/NPF/Facebook

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffery Ogbonna sara okwu onyeisi ụka Methodist n'Imo steeti bụ Samuel Kanu-Uche kwuru banyere ndị ọrụ nchekwa dịka atọhapụrụ ya.

Kanu-Uche onye gwara ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọhị Tuzde banyere ihe ọ gabigara mgbe atọọrọ ya tụrụ ndị ọrụ nchekwa aka ma kwuo na na ọ na-eche na ndị agha Naịjirịa na ndị ntọọ ahụ na-arụkọ ọrụ.

O kwukwara na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ TVC na "Ndị ntọ ahụ kwuru na ha nweere ọnọdụ n'akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n'ihi nchekwa adịghị n'ebe ndị a"

Ogbonna kọwara BBC Igbo na kemgbe atọhapụrụ Kanu-Uche na ọ bịabeghị gwaa ha okwu nke bụ na ha anatabeghị ozi dị mkpa ha kwesịrị iji rụọ ọrụ nnyocha ha n'okwu ntọrọ ahụ.

O kwuru "naanị ndị bi n'obodo ebe ndị a na-anọ nakwa ndị atọọrọla ma tọhapụ nwereike ịgbara anyị ama dị omimi banyere etu anyị ga-esi rụọ ọrụ nyocha anyị"

O kwukwara "Mgbe ndị uweojii Naịjirịa nụrụ akụkọ ntọrọ nwa a, anyị mere ngwa ngwa wụchịe akụkụ mpaghara steeti ahụ dịka ndị uweojii agbataobi anyị nke Imo mekwara otu ihe ahụ"

Ogbonna kọwara na ndị uweojii na-agbasi mbọ ike ịhụ na ha chekwara akụkụ ọwụwa anyanwụ Naịjiria niile.

Dịka nke a mechara, ndị ntorobịa n'obodo Umunneochi nke Abia steeti na-eme ngagharịiwe taa bụ Wenezde dịka ha na-ekwu na ha chọrọ ka gọọmentị na ndị ọrụ nchekwa teeta n'ụra ma buso ndị na-atọ ndị mmadụ na mpaghara ahụ agha.

N'ihe onyonyo pụtara na soshal media ha pụtara n'igwe kwuo ihe ndị ha chọrọ n'aka onyeisi obodo ahụ nke gụnyere:

  • Ịgbapee ụzọ ochie nke Isuochi
  • Mwepụ ọdụ nyocha ụgbọala ndị agha Naịjirịa tinyere n'ụzọ Alaoma
  • Mwepụ ọdụ ahịa ndị na-ere ehi

Ogbonna etinyebeghị ọnụ n'okwu a dịka ọ kweghị etinye ọnụ n'okwu ajụjụ banyere ụgwọ mgbapụta Kanu-Uche kwụrụ maka ntọhapụ ya dịka a jụrụ ya ma ọ dara iwu na nke a.

Cheta na ụlọomeiwu Naijirịa n'ọnwa Eprel wepụtara akwụkwọ iwu ọhụrụ kwuru na aga atụ ọnye ọbụla kwụrụ ndị ntọọ ụgwọ mgbapụta nga rụọ afọ iri na ise opekata mpe ma nye ndị ntọọ ọbụla ejidere ntaramahụhụ ikpe ọnwụ.

Ka ọ dị ugbua, a na-eche ka ndị ụlọomeiwu nta binye aka n'iwu a tupu ezigara ya onyeisiala ka o binye aka.

Premate Uche Kanu

Ebe foto si, Screan Grab

Bishọpụ ụka Metọdist bụ Prelate Samuel Uche kanu bụ onye ndị ntọ ji ya tọhapụrụ ụnyaahụ bụ Mọnde ka e jidechara ha ụbọchị ụka ekwuola ka ya na iji siri gaa.

N'ịchafụ, Kanu sị na ha si emume ụka ha gara n'Isochi na-aga ọdọụgbọelụ ịbanye ụgbọelụ lawa, ruo na Leru, Abịa steet, ndị Fulani na-achị ehi sị n'ọhịa pụta gbawa ụgbọala ha egbe.

Mgbe ha kwụsịrị, ọnye mgbasa ozi ụka ha na dụraịva gbapụ ọsọ, ndị ahụ jidezie ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ.

Ọ sị na "ndị ahụ ha jidere bụ Arch. Bishọpụ Owerri, otu ọnye ọrụ m na mụonwe m".

Ndị ahụ kpọọrụ ha bawa ọhịa na-eti ha ihe, "mgbe ahụ ka m meruru m ahụ n'anya aka nri m bụ nke gbawara ọbara, mana ụmụaka ahụ achọghịdị ịma".

Ha sị anyị na anyị ruwera ha isi na nsogbu agaghị adị, mana ọ bụrụ na anyị mee isiike, ha agbagbuo anyị.

Ha sịkwa na ọ bụghị ndị mmadụ ka ha na-alụsa ọgụ kama na ọ bụ gọọmentị Naịjirịa bụ nke ha kọwara na ha naghị eme nke ọma.

Ha sị na "ụbọchị ọbụla ha hụrụ onyeisiala maọbụ onye ọbụla na-anọchite anya na, na ha ga-eri ha na ndụ maka na ọ meghị nke ọma".

Kanu Uche gwara ha na ya abụghị ọnye ọrụ gọọmentị ka na ya bụ ụkọ chukwu.

Ha sị ya na ọ bụ naanị nke ahụ ga-azọ ya ndụ, maka na ha kaara igbu ya n'otu ntabianya.

Ha kwuru na "ha asatọ bụ ndị Fulanị gbara afọ iri na asatọ na iri atọ na ise".

Ha sị ya banyewe ime ọhịa.

Ọ sị na "ha dugharịgidere anyị n'ime ọhịa rụọ elekere iri na otu nke abalị. Mgbe ahụ ka ha sị anyị weta nde Naịra iri ise (N50,000,000), otu n'ime anyị".

"E che m na ha na-egwu egwu mgbe ahụ. M were kwee ha ọnụ sị na Naịra nde iri (N10,000,000.00). Ha gbọchie m ọnụ sị m mechie ọnụ ọsọsọ tupu ha e memila m".

"Ọ sị na ha wepụtara nma ha ka ha gbuo m".

Kanu sị na ụmụaka ha mechere sị ha weta otụ puku nde narị Naịra (N100,000,000) sị ya ya ekwula okwu ọzọ, na okwuo okwu ọzọ, ha e gbuo ya chefuo ya bụ ego jide ndị ọzọ.

"Mgbe ahụ ka m malitere ịkpọ ndị mmadụ. Ha nọgide sị m, kedụkwanụ ego ọbụ?"

Ọ sị na ha na a na-eweta ya.

Ha gwara ya na "ha bụ ndị Fulani, na ha juru ebe niile, na Naịjirịa bụ be ha".

Na ụbọchị ha chọrọ ha achụpụ mmadụ niile were ala ha.

Ọ sị na ihe gbagwojuru ya anya bụ na ndị agha Naịjirịa nọ nso na-ebe e ji ha.

Ha kwukwara na ha agaghị e ji ekwentị ha kpọọ ndị be anyị maka ndị ọrụ nchekwa ga-esowe ha.

Ọ sị na onyeisi ha bụ onye dị ka afọ iri atọ na ise, na a mụrụ ya n'ala Igbo mana nne ya na nna ya anwụọla.

Na nna ya na-erebu ehi n'ala Igbo pupu ọ nwụọ.

Ha dọrọ ya aka na ntị sị na ọ nwaanwa kpọọ ndị uweoji, ha e gbuo ya tufuo ozu ya n'otu olulu dị ebe ahụ.

"Ebe ahụ na-esi ka ebe a tufuru ozu ndị mmadụ".

Mgbe e mechere ha sịrị ya na ka ọ tinye ego ndị ahụ n'akpa 'ghana must go" ise dowe ya otu ebe, ka ha bịa buru ya..

Mgbe ha butere ego ahụ, ha sị anyị na ha gụọ nke ọbụla ma o zughị ezu, ha gbagbuo anyị.

"Ha gụgide ya, gụchaa ya sị anyị bịa lawa na o zuru. Ha duru anyị rute na ụzọ ochie ebe e dere "welcome from Imo, Goodbye to Abia", sịzịa anya lawa.

Ihe kacha wute m bụ na nke kacha nta ebe ahụ sị m na "ọbụrụ na ha gochaa mgbo, na ha ga-akpọdata ụmụ nne ya achụrụ na Zamfara ka ha bịa biri ebe a mesie anyị ike".

Ọ sị na ndị agha Naịjịrịa ma ebe ndị ahụ nọ ya mere ha ji ezochi ha.

Ha ma ihe ha na-eme.

Ya mere oge ndị obodo chjọrọ ịba ọhịa ga-achọwa ha, ha sị anyị " unu nwaanwa baa ebe ahụ, anyị ememila unu".

Ịhe ha na-eme bụ oru n'ụtụtụ ha chịrị ehi ha ha ji emegharị ndị mmadụ anya.

Mana mgbede ruwa, ha a chịrị egbe baa ọhịa, ịchọ ndị ha ga-atọ.

Prelate Samuel Kanu Uche: Gọọmenti Abia steeti amaghị ma a kwụrụ ndị ntọ ego ka a kwụghị - Onyebuchi Ememanka

Onyeisi ụka Metọdịst na Naijiria, nnukwu ụkọchukwu Samuel Kanu Uche

Ebe foto si, Methodist Church of Nigeria/Facebook

Onyebuchi Ememanka bụ ọnụ na-ekwuru gọvanọ Abia steeti ekwuola na gọọmenti Abia steeti amaghị ma o nwere ego e jiri gbapụta isi Prelate Samuel Kanu Uche na ndị ọzọ a tọrọ n'ụbọchị 29 Mee, 2022.

Nke a pụtara na mgbasaozi ụfọdụ na-efegharị na soshịal midịa na e jiri akatamkpo ego ji gbapụta ya bụ onye ụkọ Chukwu na ndị ọzọ a tọrọ.

Ememanka sị na gọvanọ na Prelate bụ ezigbo ọyị nakwa na ozi ntọọ ya wutere ya nke ukwuu mere o jiri nwaa ike ya ịhụ na atọhapụrụ ya ọsịịsọ.

Onye ntaakụkọ BBC mechara jụọ ya maka ihe Gọọmenti Abia steeti na-eme maka ụzọ Leru - Ihube dị n'okpruọchịchị Umunneochi, Emememanka sara na Gọvanọ Ikpeazu na-ekwu ka ndị steeti ndị ọzọ gbakọọ buzo ya bụị ndị agha ọgụ.

Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Okezie Ikpeazu

Nkọwa foto, Prelate Samuel Kanu Uche: Gọọmenti Abia steeti amaghị ma a kwụrụ ndị ntọ ego ka a kwụghị - Onyebuchi Ememanka

Gọọmenti Abia steeti ekwuola na a tọhapụla Ụkọchụkwụ Samuel Kanu Uche bụ onye nọ n'aka ndị ntọ kemgbe ụnyaahụ, 29 nke ọnwa Mee 2022.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abịa steetị bụ Godfrey Ogbonna, gwara BBC na a tọhapụla ya bụ ụkọchụkwụ n'ezie.

Ndị ụka Methodist achọghị ka a kpọọ aha ha, sị na Bishop Uche nọzị n'ụlọụka ya n'Ihube ebe ndị ụka ya nabatara ya.

Ha sị na a tọhapụru ya kemgbe ehihie taa n'Abịa steeti ebe e jidere ha, ma sizie ebe ahụ buru ya lọta ụlọụka ya dị n'Ihube, Okigwe, Imo steeti.

'Nto a tọọrọ Uche bụ nnukwu ihe ihere nye ụka Methodist na Naijiria'

Ụka Methọdist na Naijiria akatọọla ntọrọ a tọọrọ onyeisi bụ Samuel Kanu Uche sị na ọ bụ "nnukwu ihe ihere" nye ụka Methọdist na Naijiria nakwa na mbaụwa".

Dịka onyeisi ụka ahụ na Wesley Cathedral dị n'Umuahia, bụ Very Rev. Aaron Akabuokwu si gbara ama, ndị omekome tọọrọ Kanu Uche dịka o na-aga ọdọụgbọelu dị n'Owere ịbanye ụgbọelu dịka ọ kachara ụka."

Akabuokwu, onye kpọrọ ihe mere, "arụ na mmerụ ala" kwuru na o gosiri etu ụdị mmadụ ndị mmadụ ghọọrọla na Naijiria.

"Ndị mmadụ anaghịkwa akwanyere ihe dị nso ugwu. Anyị nwere ntukwasa obi na Chineke ga-eji nke a kpọtee ndị ọchịchị n'ụra."

Buhari nye iwu ka atọhapụ Kanu Uche na-egbughị oge-CAN

Dr Samuel Kanu Uche na Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Methodist Church of Nigeria/Muhammadu Buhari

Otu jikọrọ ndị ụka Kraistị na Naijiria bụ Christian Association of Naijiria (CAN) akpọọla Buhari oku ka onye iwu ka ndị ọrụ nchekwa gbapụta Onyeisi ụka onyeisi ụka Methoduist Church bụ Samuel Kanu Uche ndị ntọ tọọrọ ụbọchịụka, ozigbo.

Ndị omekome tọrọ Kanu Uche na Bishọpụ Methodist na Dayosis nke Owerri bụ Rt. Rev. Dennis Mark nakwa Very Rev. Jeremiah Shittu oge ha si ebe ọ gara kara ụka na-ala.

N'ozi nke CAN wepụtara ụbọchị Monde nke onye enyemaka mgbasaozi onyeisi ha bụ Pastor Adebayo Oladeji binyere aka, otu ahụ sị, "Anyị na-akpọku Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o mee ihe n'ile dị n'ike ya ịhụ na-atọhapụrụ ndị odibo Chineke na-egbughị oge, na enweghị mmerụahụ ọbụla."

Anyị ga-agbapụta ya na enweghị ọkọ kọrọ ya- Ndị uweojii

Ndị uweojii Abia steeti ekwuola na ha agaghị ezu ike ganye na ha azọpụta onyeisi ụka Methodist Church bụ Samuel Kanu Uche a tọọrọ ụbọchịụka n'ụzọ Leru-Isuochi dị n'Okpuru Ọchịchị Umunneochi dị n'Abia steeti na enweghị ọkọ kọrọ ya.

A tọrọ Kanu Uche na otu Bishop ọzọ nke ụka ya bụ Rt. Rev. Dennis Mark, bụ Bishọpụ nakwa Very Rev Jeremiah Shittu oge ha si be ha kara ụka na-ala.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Geoffrey Ogbonna kwuru na ndị ọrụ ha amalitela ịma imi na-ala iji nweta ndị omekome kpara arụ ahụ.

Etu ndị ntọ si tọrọ onyeisi ụka Methodist na Naijiria na ndị ọzọ

His Eminence, Dr Samuel Kanu Uche

Ebe foto si, Methodist Church of Nigeria/Facebook

Akụkọ na-erụ anyị ntị na-ekwu na-ekwu na ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ atọrọla nnukwu ụkọchukwu bụ onyeisi ụka Metọdist na Naijiria bụ Samuel Kanu-Uche.

A tọrọ nnukwu ụkọchụkwụ ahụ n'okporoụzọ si Ihube gawa leru-Isuochi dị n'Okpuru Ọchịchị Umunneochi dị n'Abia steeti n'ụtụtụ ụbọchịụka, abalị 29 nke ọnwa Mee afọ 2022.

A tọrọ Kanu na otu Bishop ọzọ nke ụka bụ Rt. Rev. Dennis Mark, bụ Bishọpụ nke Owerri nakwa Very Rev Jeremiah Shittu oge ha si emume ha gara na-ala.

O teela ndị ntọ wara ndị ụkọchukwu ụka dị iche iche na Naijiria mana nke a bụ mbụ a na-atọrọ nnukwu ụkọchukwu na Naijiria kemgbe Jenwụwarị 2021 bụ oge tigbuo-zogbuo malitere rịwa elu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria n'ụdị a hụbeghị kemgbe Agha Biafra.

O doghị anya ma ya bụ ntọ emere na mberede ka ọ bụ ihe a kpara akpa mana ya bụ akụkọ etinyerela egwu n'etiti ụka Methodist na Naijiria na-ofesi dịka ha na-atụ egwu maka ndụ.

Akwụkwọ ozi ụka Methodist mba UK na Ireland zisara ndị ndu ụka ha ji kpọọ ndị Methodist oku ekpere ụbọchịụka (29/5/2022) maka ntọhapụ Kanu na ndị atọrọ ha na ya nke Odeakwụkwọ ha bụ Christene Fakeye binyere aka, nke BBC Igbo hụrụ gbara ama ihe mere.

Akwụkwọ ozi ahụ sịrị na-ekwu sị, "Chaplaincy Management Council ji ohere a akpọ oku ekpere n'ụwa niile maka ntọhapụ onyeisi ụka Methọdist na Naijiria bụ His Eminence, Dr Samuel Chukwemeka Kanu Uche, ụkọchukwu ya (Chaplain) bụ Jeremiah Shittu na Bishop Dennis Mark bụ ndị a tọrọ n'ụtụtụ taa n'Abia steeti."

Cheta na oge ịla ezumike nka nke Uche atụnyewala n'ụkwụ nke mere na ọ na-agazị njem nlenta ikpeazụ n'ebe dị iche iche tupu ọ pụọ.

Oge a kpọtụrụ ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Geofrey Ogbonna kwuru na o mere eme n'ezie.

O kwuru na ndị uweojii na-ama imi n'ala ịzọpụta ndị a tọọrọ ma nwụchie ndị tọọrọ ha.

Aha onyonyo, Maazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ.

" Mkpamkpa ọjọọ ahụ kpara n'ezie, Anyị na-agba mbọ ụzọ ịtọhapụ ndị a tọrọ na inwuchi ndị a na-enyo tọọrọ ha."

Kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021, ọnọdụ nchekwa malitere ndakpọ n'Ọwụwa Anyanwụ dịka oke ogbugbu mmadụ, ntọ na mwakpo ndị uweojii, ndị agha, ndị ọrụ gọọmentị na ndị nwere agba ọzọ na-arị ibe ya elu.

Mwakpo a gụnyere mwakpo ụlọ mkpọrọ Owere dị n'Imo steeti bụ nke nyere ohere ka ndị a tụrụ mkpọrọ gụnyere ndị omekome karịrị mmadụ 1000 gbalaga.

Gọọmenti Etiti na ndị ọrụ nchekwa ebola otu nwereonwe Biafra ebubo na ọ bụ ha nyụrụ ihe na-esi na Ọwụwa Anyanwụ.

Mana ugboro ugboro, Ipob agọrọla isi onwe ha.

Onye bụdi Samuel Kanu Uche?

His Eminence, Prelate of the Methodist Church in Nigeria

Ebe foto si, Methodist Church of Nigeria/Facebook

Samuel Emeka Kanu Uche bụ onyeisi ụka Metọdịst na Naijiria ugbua bụ onye banyere n'ọkwa ahụ n'afọ 2013.

Tupu ọ banye n'ọkwa ahụ, Kanu Uche bụbu 'archibishop nke ụka Methodist nke Enugwu Dayọsis.

Onye Amagu, Ihube, Okigwe dị n' Imo steeti.

O si n'ezinaụlọ ndị ụkọchukwu dịka nne na nna ya bụ Evangelist Thompson Kanu na Nneoma Janet Ebere Uche .

Ọ malitere ọrụ ịgara Chukwu ozi n'afọ 1979 bụ oge e mere ya 'Deacon n'afọ 1979.

E chiri ya 'bishọpụ n'afọ 1998 na Legos n'ọnwa Novemba afọ 1998.

Ọ rụọla ọrụ mgbasaọma n'obodo dị iche iche gụnyere; Aba (1979-1981),Umuokpara (1981-1984) dị na Dayọsisi Umuahịa, Amechi (1985-1989) ,Ngbo dị n' Abakaliki (Jan-March1990) nakwa Kano bụ ebe ọ bụbu "Presbyter"na-elekọta "Kano Circuit" malite n'ọnwa Maachị afọ 1990 rue Oktoba 1998.