Kings Assembly Church: Ihe ọdachi ataala isi mmadụ 31 n'emume ụka na Rivas steeti

Akụkọ si Pọta Kọtụ apụta taa bụ ụbọchị Satọdee 28 Mee, 2022 na-ekwu na ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ n'emume ụka Kings Assembly hibere maka ndị na-enweghị ka ọ hara n'ebe ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rịvas steeti bụ Grace Iringe-Koko gbara BBC ama maka nke a ma kwuo na mmadụ 32 alaala mmụọ n'ihe a.

Dịka ndị nọ ebe ahụ ihe e mee sịrị kwuo, ụka a zigara ọtụtụ ndị na-enweghị ka ọ hara ha ozi banyere emume a nke e kwuru kwesịrị ịmalite n'elekere asatọ nke ụtụtụ.

Ndị nọ ebe ahụ kwuru na n'ebe elekere asaa, ọtụtụ ndị mmadụ agbakọtala ebe ahụ. Ya bụ emume e hibere n'ọdụ ahịa ukwuu nke Port Harcourt Polo Club kwesịrị inye ndị a ohere ịzụta ihe ọbụla ha chọrọ dịka ụlọụka ga-akwụ ụgwọ ya. Ndị nọ ebe ahụ ihe a mere gwara onye ntaakụkọ anyị na igwe mmadụ jupụtara ebe ahụ tupu ya bụ emume amalite nke mere nzugbu nzugbu jiri malite.
E kwuru na azụ bụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ebe ahụ dịka ọgbaghara dapụtara.

E kwuru na ebupụrụ ozu ọtụtụ ndị a gawa ụlọọgwụ ndị agha nke Military Hospital dị na Rumola ebe ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ ebe ahụ dịka e si kwuo. Agbachiela ọdụ ahịa ukwuu a dịka ndị nchekwa ewerela ọnọdụ iweghachite udo ebe ahụ. Mbọ BBC Igbo gbara ịnụ olu ụlọ ụka a amitabeghi mkpụrụ dịka ha ekweghị ịza ozi e zitere ha.




