Eke-Ụtụtụ attack: Ụka katọlịk etiela mkpu ka a kwụsị oke ogbugbu mmadụ n'Orsu

Bishop Augustine Ukwuoma

Ebe foto si, Orlu diocese.org

Ụka katọlịk dị n'Orlu Imo steeti etiela mkpu maka oke ogbugbu mmadụ na ịmebi ihe na-akpọtụ n'akụkụ Orsu, Imo steeti ọkachasị nke mere n'Eke-Ụtụtụ dị n'Orsu ụbọchị ụka ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Septemba afọ 2022.

Bishopụ ụka katọlịk n'Orlu bụ Austine Ukwuoma kwara arịrị maka ọtụtụ mmadụ nakwa ahịa Eke Ụtụtụ ọ ọsị gbara ọkụ.

N'akwụkwọ ozi o ziputara ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Septemba, Ukwuoma katọrọ ya bụ ajọ ihe nke a na-ebo ndị ọrụ nchekwa.

Ọ sị, "a na m akatọ ogbugbu mmadụ n'ụdị ọbụna, ọbụladị ndị agha maọbụ ndị agha nnupuisi ịme ya.

Ihe mere n'Ọsụ

Ebe foto si, Screengrab

A ka m na-ekwusi ike na ndụ mmadụ dị asọ, e kwesikwara ịdọwe ya asọ."

Ukwuoma na-akọwa na ọ bụ "ajọ ihe na-ebute ajọ ihe."

O kwuru na ya bụ ahịa ụtụtụ a gbara ọkụ ga-ebutere ndị mmadụ oke ụbịam.

Ọ sị na ọ bụ na ya bụ ahịa ka ndị ogbenye bi ebe ahụ na-ezere ndụ ha.

Ọ sị na ọtụtụ ajụjụ na-agbata ya n'isi maka ya bụ ahịa agbara ọkụ.

Ọ kpọkụrụ gọọmentị ka ha gbakwute ndị mmadụ ọsọ enyemaka ma kwụsị oke ogbugbu mmadụ na ịmebi akụnaụba ndị mmadụ.

Catholic Bishop of Orlu

Ebe foto si, Catholic Bishop of Orlu

Ihe mere ndị nchekwa gọọmentị Jiri wakpoo ahia Eke-Ụtụtụ dị n'Orsu, Imo Steeti - Hope Uzodinma

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma emeela mgbasa ozi ma kwuo okwu gbasara mwakpo mere n'ahịa Eke Ututu nke dị n'okpuruọchịchị Ọsụ dị n'Imo Steeti n'ụbọchị satọde.

O kwuru sị, "Ndị nchekwa nwuchiri otu n'ime ndị omekome na-enye nsogbu a, mgbe ha gbara ya ajụjụ ọnụ, ọ kpọrọ ndi nchekwa gaa n'ahị Eke Ụtụtụ bụ ebe ha na-emepụta ogbunigwe".

Uzodinma tụlara uche azụ ma sị ka echeta na otu onye ọchịagha nwụrụ nsonso a dịka ndị agha na-emebi ogbunigwe ndị omekome a hapụrụ ha.

O kwuru sị," Onye a gosiri ha ọnụ ahịa ano bụ ebe ha hụrụ 'Fertilizer', 'Amonium Sulphate' na akụrụngwa latrik ha ji emepụta ogbunigwe".

Ọ gara n'ihu kwuo," Otu onye kaptin ndị agha na otu onye agha ọzọ nọ n'ụlọ ọgwụ n'ọnọdụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma maka nke a. Ndị agha gbalịrị napụta ihe ndị a eji emepụta ogbunigwe".

O kwuru na dịka iwu ha siri dị, na ndị agha gbara ọnụ ahịa anọ ndịa ọkụ ma ha mere ya dịka ọkaibe na nchekwa nke mere na enweghị onye aka ya dị ọcha nwụrụ.

O kwuru sị, "N'otu ahịa Eke ụtụtụ a, ndị mmadụ enweghị ike ịzụ ahịa ma ọ bụrụ na ha enyeghị ndị 'Uknown Gunmen' a ụtụisi, ụtụisi a abụghị nke gọọmentị kwadoro'.

O kwukwara na Gọọmentị Imo steeti ga-arụgharị ahịa Eke Ụtụtụ ma nye ndị ngwa ahịa ha mebiri ego iti aka n'obi.

Uzodinma kwuru sị, " Onye ọbụla nwere ihe ịgbaama maka ndị omekome a , gbalịa gwa gọọmentị, ọ bụ oku ka anyị na-akpọ maka ezi nchekwa n'Imo Steeti.

Ndị agha

Ebe foto si, Imo State New Media

Nkọwa foto, Otu Kaptịn ndi agha nọ n'ọnọdụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma - Uzodinma

Ihe anyị ma maka mwakpo Awo- Idemmili

Hope Uzodinma

Ebe foto si, Imo State New Media

Mkpu akwa nakwa ụjọ dara n'obodo Awo Idemmili, nke dị n'okpuru ọchịchị Orsu n'Imo Steeti, n'ụbọchị Sọnde abalị iri na asatọ nke ọnwa Sepụtemba 2022.

Nke a bụ maka mwakpo nke ndị ọrụ nchekwa wakporo obodo ahụ ma na-agba egbe aghara aghara.

Otu ihe onyonyo fesara na soshal midia gosiri ndị mmadụ ka ha mara afọ n'ala n'ime ụlọụka ebe ha gara ụka n'ụbọchị Sọnde, dịka ụda egbe na-ada ebe niile.

Onye na-ekwu okwu na onyonyo ahụ kwuru na ebe ha nọ bụ n'ụlọụka Anglịkan nke St Simon, n'Awọ-Idemmili.

Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụ n'ọnụ ndị ọrụ nchekwa gbasara ihe a merenụ amịtaghị mkpụrụ.

Michael Abattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti azaghị oku BBC kpọrọ ya, mana oge anyị kpọrọ ya ugboro ugboro, ọ zara ma were iwe kwuo na ya nọ n'ọgbakọ tupu ọ pịnyụọ ekwentị ya.

Ihe anyị ma maka mwakpo a

Onye mere onyonyo ahụ fesara na soshal midia gwara otu onye ntaakụkọ na ha nọ n'ụlọụka oge ha nụrụ nnukwu ụda dịka ogbunigwe, n'akụkụ ebe igwe 'generator' ha dị.

Mgbe ha nụrụ ụda, ụkọchukwu gwara onye ọbụla ka ha mado afọ n'ala, mana ka ha nọkwa n'ala ebe ahụ, ha nụkwara ka ụda egbe na-ada n'ike n'ike.

Mana ọbụghị ụlọụka ahụ kpọmkwem ka a wakporo.

Onye ahụ kwuru na ọ bụ etu a ka ha sị achịrị obi n'aka oge ọbụla n'obodo ha, maka na ụdị mwakpo a emeela ugboro ugboro.

Anyị ka na-agba mbọ ịnụ n'ọnụ ndị ọrụ nchekwa gbasara ihe a merenu.

Ọnọdụ nchekwa dị oke njọ na mpaghara Orsu

Mpaghara Orsu, Imo steeti, bụ otu ebe ọnọdụ nchekwa jọrọ oke njọ n'Imo Steeti.

Ọtụtụ ndị bi na mpaghara ahụ agbaala ọzọ ndụ gaa ebe ọzọ biri.

Otu onye bibu ebe ahụ gwara BBC Igbo n'oge gara aga na ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ tọgbọzi chakoo, ụfọdụ ụlọakwụkwọ anaghị emepezi.

Ihe kpatara nke a bụ maka ike ọjọọ ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ na-akpa na mpaghara ahụ.

Nke a na-eme ka ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa dịka ndị uweojii, ndị agha na ndị uweojii nzuzo bụ Department of State Services (DSS), na-awakpokwa mpaghara ahụ iji chụpụ ndị ekperima jizi ebe ahụ mere isi ụlọọrụ.

Ndị ọzọkwa na-eso ebuso ndị ekperima agha bụ ndị otu nche a na-akpọ Ebube Agu nke gọọmentị Imo steeti ji aka ha hibe iji wulite ọnọdụ nchekwa.

Mana ugboro ugboro ka ndị obodo na-ebo ebubo na ndị ọrụ nchekwa ndị a na-awakpozi ma ndị aka ha dị ọcha.