A mara Peter bụ di Osinachi Nwachukwu ikpe ọnwụ? Lee nke bụ eziokwu

Osinachi na Peter Nwachukwu

Ebe foto si, Peter Nwachukwu/Facebook

Akụkọ na-efegharị ugbua bụ na ụlọikpe ukwu dị n’Abuja amaala Peter Nwachukwu bụ di Osinachi Nwachukwu ọnwụ maka ebubo na o tigburu onwe ya

Akụkọ a sị na a mara Nwachukwu ikpe ọnwụ nke bụ a ga-egbu ya site n’ịkwụ ya ụdọ.

Nke a na-abịa dịka gọọmentị etiti kpụpụrụ Peter Nwachukwu ụlọikpe n’ebubo ọnụ iri abụọ na atọ (23 count charge).

Ha gbakwasịrị ụkwụ na ngalaba (section) 104 na 379 nke iwu Naịjirịa aghazigharịrị n’afọ 2015 bụ ‘Administration of Criminal Justice Act’.

E boro ya ebubo igbu mmadụ nke a kpọrọ ‘culpable homicide’ na Bekee.

A mara Peter Nwachuwku ikpe ọnwụ n’ezie?

Akụkọ sị na a maala Peter Osinachi ikpe ọnwụ bụ asị

Ebe foto si, Screen shot

Otu onye ntaakụkọ na-arụ n’ụlọikpe ukwu dị n’Abuja gwara BBC Igbo na akụkọ ahụ bụ asị ọcha.

Ọ sị na bụ eziokwu na gọọmentị kpụrụ Nwachukwu n’ụlọikpe n’ọnụ ebubo iri abụọ na atọ (23 count charge) n’izu gara aga.

Mana ụlọikpe eyinyebeghi ụbọchị a ga-ekpe ikpe ahụ ka ọ fọdụzie ikpe ya nakwa ịma Nwachukwu ikpe ọnwụ.

Ọ gara n’ihu kwuo na mgbe ọbụla ụlọikpe mere nke a na ọ ga-edo ewu na ọkụkọ anya.

Onye bụ Osinachi Nwachukwu?

  • Osinachi Nwachukwu bụ onye otiegwu ụka ọtụtụ ndị mmadụ na gburugburu Naịjirịa ma agbanyeghị na ọ na-eji asụsụ Igbo agụrụ chi ya egwu.
  • Egwu bụpụtara ya ka ụwa mara ya bụ 'Ekwueme' nke ya na Prosper Ochimana gbakọrọ aka gụọ n'afọ 2019, ọdọ egwu.
  • Ya na ụkọchukwu Abuja a ma ama bụ Paul Enenche gụkọkwara "Nara Ekele" bụ egwu na-ewu ewu n'ụka.
  • Nwaada a na-ejikarị asụsụ Igbo agụ egwu ya dịka ọgụọla ọtụtụ egwu ndị ọzọ gụnyere nke o wepụtara ihe onyonyo ya nsonso a ọ kpọrọ 'Ike mo' .
  • Nwachukwu bụ ejima, ejima ya bụ Amarachi Eze na-agụkwa egwu
  • Ọ bụ onye Isuochi dị n'Abia Steetị ma lụọ Peter Osinachi bụ onye Nnewi South dị n'Anambra Steetị.
  • Ha mụtara ụmụ anọ.