Ọgba mbọ: Ọmịiko m nwere n’ebe onye ngwọrọ nọ mere m ji rụọ ‘electric wheel chair’ – Honesty Godwin

Aha onyonyo, Ọgba mbọ: Ọmịiko m nwere n’ebe onye ngwọrọ nọ mere m ji rụọ ‘electric wheel chair’ – Hones
Ọgba mbọ: Ọmịiko m nwere n’ebe onye ngwọrọ nọ mere m ji rụọ ‘electric wheel chair’ – Honesty Godwin

Honesty Godwin bụ nwata na-arụpụ akụrụngwa tekịnụzụ a kpọro ‘robotics’ akọwaala ihe mere o jiri rụpụta igwe latrrik ndị ngwọrọ ji eme njem a kpọrọ ‘electric wheel chair’.

Nwamadị a gwara BBC na ọ malitere ịrụ tekịnụzụ mgbe o dị na nwata mana ọ banyere na ngalaba a kpọro ‘robotics’ mgbe ọ dị afọ 16.

ọ bụ n’ihi obi ebere na ọmaiko o nwere n’ebe otu onye ngwọrọ ọ hụrụ n’okporoụzọ ka o jiri kpebie ịrụ igwe njem a.

O kwuru na ọ hụrụ onye ngwọrọ ahụ ka ọ tọọrọ n’ụzọ maka na ndị na-akwagharị ya apụtaghị ọsịsọ ị kpọrọ ya.

N’ihi nke a, Godwin sị na o chere echiche n’obi ya ma sị “ọ ga-adị mma ka m rụpụta igwe nke ji latrik arụ ọrụ a na-agaghị akwa aka.”

Honesty Godwin na-arụpụta akụrụngwa tekịnụzụ

O kwuru na ọ bụ mgbe ahụ ka ọ malitere ikpokọta akụrụngwa ndị o jiri rụọ igwe njem a nke latrik ya.

Godwin sị na o weere ya ọtụtụ ọnwa ịchọta ngwa o jiri rụọ igwe mana o furu izuụka atọ ịrụpụta ya etu a ọ dị.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọ na-arị ọtụtụ ihe dị iche iche gụnyere igwe e ji akwọ aka, igwe na-efe efe e ji ese foto n’elu bụ ‘drone’ na ndị ọzọ.

O kwuru na o nwere echiche ịrụpụta ọtụtụ ihe ndị ọzọ mana ihe na-ama ya aka n’ihu bụ inwete ụlọọrụ dị mma nakwa ego ọ ga-eji ehiwe ya ma rụpụta ihe ndị a.

Kirie ihe o kwuru n’uju;

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu & Okechukwu Omeire
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist
    • Onye dere ya, Okechukwu Omeire
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist