Igbo Ancestry: Etu William E 'Kip Ward, Emmit McHenry, ndị Amerịka abụọ nwere agba si chọpụta na agbụrụ ha bụ Igbo

Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo
Ndị Amerịka abụọ bụ Emmitt McHenry na ọchịagha Williams E. Ward achọpụtala na nwere agbụrụ n'ala Igbo.
McHenry bụ onye chọpụtara akara (.com) e ji ezisa ozi n'ịntanetị ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ 'Defense Manufacturing", ebe Ward bụ onyeisiagha mbụ nke ndịagha mba Amerịka nọ ọrụ n'Afrịka (US.Africa Command) na Stuttgart nakwa Jamini n'afọ 2007.
Obi jụpụtara ụmụ Igbo ndị a n'ọṅụ dịka onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Emmanuel Iwuanyanwu nabatara ha n'emume e mere n'ụlọmmụta 'Smithsonian Institute of African Museum' dị na Washington DC nke mba Amerịka na nso nso a.
McHenry kwuru na nna ya gbaara ya na ụmụnne ya ama n'akwụkwọozi si n'aka ndị nna ha ochie rute ya aka gosiri na ha bụ ndị Igbo.
Ọ gara n'ihu kwuo na o meela nnyocha akụrụngwa ime a kpọrọ 'DNA' nke gosiri kpọmkwem na ọ bụ nwafọ Igbo akụghị mmiri.

Ebe foto si, Ohaneze
McHenry na Ward yicha akwa isiagụ jiri ọṅụ pụta n'ọgbọ n'emume nnabata nke Ohanaeze Ndigbo meere ha.
Dịka ọnụ na-ekwuru Ohaneze bụ Alex Ogbonnia si kwuo n'ozi o wepụtara, onyeisi Ohaneze bụ Iwuanyanwy gosiri obi ụtọ ya na ndị Amerịka si ala isiojii chọpụtara na ha si ala Igbo ma too ha maka mbọ ha na-agba n'Amerịka nke mere aha ji ada ụda.

Ebe foto si, Ohaneze
Ọ gara n'ihu mee ha ndị ndụmọdụ pụrụiche nke ya dịka onyeisi otu Ohanaeze.
Cheta na n'ihe karịrị afọ narị anọ, e rere ọtụtụ ndị si mpahara Afrịka gụnyere ụmụafọ Igbo n'ohu ma rega ha na mba Amerịka na mba ndị ọcha ndị ọzọ.
Ọtụtụ n'ime ha mụbara ma bụrụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Bekee ugbua.
Ndị a gụnyere onye ụkọchukwu Amerịka a ma ama na mbaụwa bụ T.D Jake, Forest Whitaker na-eme ihe ejije "Hollywood" na ndị ọzọ.
Onye bụdị William E kip Ward?

Ebe foto si, AFRICOM
WilliamE “Kip” Ward bụ Ọchiagha (three star general) mba Amerịka nakwa onyeisi mbụ nke ndịagha Amerịka n’Africa(US Africa Command).
Nwa amadị a a mụrụ n’afọ 1949 bara amị n’afọ 1971.
Ọ gụrụ ‘Political Sciience’ na mahadum “Morgan State University. US maka nzere nke mbụ. Ma gụo zere nke abụọ ya(Masters) na mahadum ‘Pennsylvania State University’.
Ọrụ dịka onye ndu ebugala ya ọrụ mba dị iche iche gụnyere Korea, Egypt, Israel, Somalia na Bosnia.
Ọ kuzikwara nkuzi n’ụlọmmụta ndịagha’US Military Academy’.
Onye bụdị Emmit McHenry?

Ebe foto si, Emmit Henry/Facebook
Emmit McHenry bụ onye hiwere ụlọọrụ 'NetCom Solutions ,ụlọọrụ teknụzụ nwere agba.
Nwa amadi a a mụrụ n'afọ 1943 bụ onye malitere ndụ ya dịka inginia igwe teknụzụ igwe kọpụta IBM doro anya nakwa onye nkuzi na mahadum 'Northwestern University'.
Ọ gụrụ akwụkwọ banyere mgbasaozi maka nzere nke abụọ ya n'otu mahadum ahụ.
A ma McHenry dịka onye chọpụtara akara kọpụta(computer code) e ji ezirita ozi n'ịntanet nke a ma dịka ".cọm"











