Sit at home: Anambra, Ebonyi, Abia na-ekwo ekwo ebe ụfọdụ mpaghara Enugwu jụrụ oyi

Ahịa Eke Awka, dị n'Anambra Steeti
Nkọwa foto, Ndị ahịa na-azụ ahịa dịịrị ha n'Eke Awka dị n'Anambra Steeti

Dịka taa bụ ụbọchị Mọnde, ma bụrụkwa ngwụcha ọnwa Julaị afọ 2023 ụfọdụ ụlọahịa, ụlọakụ nakwa nke azụmaahịa mepere n'ụfọdụ ebe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, dịka ha gbachiri agbachi n'ụfọdụ ebe.

Kedụ ka sit-at-home si gaa n'Awka Anambra steeti taata?

N'Awka bụ isiobodo Anambra Steeti, ndị mmadụ na-ekwo ekwo ma na-azụ ahịa na mkpa dịịrị ha.

Dịka onye ntaakụkọ BBC Igbo si gbaa ama, o kwuru na ndị mmadụ, ụgbọala na-akpagharị ebe ahịa n'azụ na Temporary site dị n'Awka.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị mmadụ na-azụahịa n'ahịa Eke Awka.

Ndị ahịa na-azụ n'Eke Awka dị n'Anambra.
Nkọwa foto, Ndị ahịa na-azụ n'Eke Awka dị n'Anambra.
Ahịa Eke Awka na-azụ n'ike n'ike
Nkọwa foto, Ahịa Eke Awka na-azụ n'ike n'ike
Ahịa Eke Awka

Kedụ ka sit-at-home si gaa n'Abakiliki, Ebonyi steeti taata?

Abakaliki, Ebonyi Steeti

N'ebe ndị ọzọ dịka Abakaliki nke Ebonyi Steeti, ndị mmadụ na-aga mkpa dịịrị ha dịka ụlọahịa, ụlọakụ nakwa azụmaahịa ndị ọzọ mepechara emepe.

Ndị ọrụ nchekwa nọkwa n'okporoụzọ ebe dị iche iche ịhụ na e chekwara ndị mmadụ na-agara mkpa ha.

Ndị na-azụ ahịa n'Abakiliki, Ebonyi Steeti
Nkọwa foto, Ndị na-azụ ahịa n'Abakiliki, Ebonyi Steeti
Ụfọdụ ụlọahịa mepere n'Enugwu

Kedụ ka sit-at-home si gaa n'Aba, Abia Steeti taata?

Aba
Nkọwa foto, Ebe a bụ 'Milverton Road' ebe ndị ụgbọala na-aga ahịa Arịarịa na-anọ

Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị na mpaghara dị icheiche n'Aba, Abia Steeti hụrụ na ọtụtụ ndị mmadụ pụtara ịzụ ahịa ha.

Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ụlọahịa kpọchiri akpọchi, mana ọtụtụ ndị mmadụ pụtara.

Lee etu mpaghara Aba dị icheiche dị taa:

Aba
Nkọwa foto, Ebe a bụ Ahia Umungasi dị n'okporoụzọ si Aba gawa Owerri
Aba
Nkọwa foto, Ọdọụgbọala a ma ama n'Aba, dịka ndị njem pụtara n'uju
Aba
Nkọwa foto, Mpaghara 'Park Road' ebe ndị ọgbatumtum ụkwụ atọ si eburu ndị mmadụ gawa Abayi-Osisioma
Aba

Kedụ ka sit-at-home si gaa n'Enugwu Steeti taata?

N'Enugwu Steeti n'ụtụtụ a, ọtụtụ ndị mmadụ apụtaghị gaa mkpa dịịrị ha, ebe ụfọdụ a na-ere mmanụ ụgbọala, ụlọakụ nakwa ebe oriri mechiri emechi.

N'aka nke ọzọ ụfọdụ ahịa, dịka ahịa Artisan mepere emepe, ebe ndị mmadụ ji nwayọ nwayọ na-apụta.

Ụzọ Enugu adịghị ka o si adị
Nkọwa foto, Ụzọ Enugu adịghị ka o si adị
Ebe oriri mechiri emechi n'Enugwu
Nkọwa foto, Ebe oriri mechiri emechi n'Enugwu

Nke a na-abịa dịka onye ndu otu alaka Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Simon Ekpa kpọrọ oku ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ na mpaghara ahụ ruo izuụka abụọ malite na Julaị 31 ruo Ọgọstụ 14 afọ 2023.

Na-agbanyeghi na Nnamdi Kanu bụ onye ndu kachasị n'otu Ipob degaara Ekpa akwụkwọ ozi site n'aka ọkaiwu ya nke pụtara ihe n'ụbọchị Fraịde Julaị 28, ma sị ya ka ọ kagbuo ihe ọbụla a kpọrọ 'sit at home' mana Ekpa kpọrọ ekwe nkụ sị na ozi ahụ bụ asị ọcha na o sighi n'aka Kanu.

Ekpa gara n'ihu kwuo ọ gaghị ege onye ọbụla nọ n'aka ndị DSS ntị, ma ọ bụrụ ka Kanu ga-apụta n'ihi n'ihu tupu ọ ṅaa ya ntị.

Ụgbọala adịghị n'okporoụzọ ka ọ na-adịbu n'Enugwu
Nkọwa foto, Ụgbọala adịghị n'okporoụzọ ka ọ na-adịbu n'Enugwu