Gọọmentị Enugwu ịkpọchị ụlọahịa ndị mmadụ n'ihi 'sit-at-home' megidere ikike dịịrị ha - CSO

Peter Mba

Ebe foto si, Peter Mba/Twitter

Otu dị icheiche na-agba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ n'Enugwu Steeti akatọọla Gọvanọ steeti ahụ bụ Peter Mba maka ịgbachi ụlọahịa ndị mmadụ bụ ndị na-emepeghị ụlọahịa ha n'ụbọchị Mọnde.

Nke a na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na mmadụ abụọ nwụrụ oge ndị uweojii gbara egbe n'ahịa ebe ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe maka mkpọchị ụlọahịa ha n'ụbọchị Wenezde.

N'akwụkwọ ozi nke ndị otu a akpọrọ 'Enugu Network of Civil Society Organisations' (ENSNet), ha kwuru na "usoro nke gọọmentị Enugwu na=agbaso iji kwụsị ọnọdụ 'sit-at-home' na steeti ahụ abụghị usoro kwesịrị ekwesị maka na ọ dabaghị n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya".

"N'ọnọdụ ọchịchị onye kwuo uche ya, gọọmentị steeti enweghị ikike ọbụla imechi ụlọahịa mmadụ, onweghị iwu ọbụla kwadoro nke a," otu ENSNet dere.

"Ndị nwe ụlọahịa ahụ nwetara ha site n'aka ọchịchị okpuru ọchịchị n'usoro iwu kwadoro, onweghị onye maọbụ gọọmentị ọbụla nwere ikike imechi ụlọahịa ndị ahụ na-esoghị usoro iwu. Ime nke a bụ ọchịchị aka ike na mmegide."

Otu kpọkuru otu 'Amnesty International' nakwa Human Rights Commission' nke Naịjirịa ka ha leba anya n'ihe na-eme n'Enugwu nke buterela ọnwụ mmadụ ugbua.

Ha gara n'ihu gwa gọọmentị Enugwu Steeti ka ha chọta ezinụlọ ndị nwuụrụ n'ọgbaghara ahụ dapụtara n'etiti ndị ahịa na ndị uweojii, nakwa ndị merụrụ ahụ na ya, ma nye ha ihe iti aka n'obi.

Ndị ahịa ahụ kwesịrị ịkpụpụ gọọmentị Enugwu ụlọikpe

Felix Jonathan

Ebe foto si, Felix Jonathan

Ọkaiwu Felix Jonathan, onye ji ọkwa odeakwụkwọ nke otu jikọrọ ndị ọkaiwu Igbo n'Abuja, kwuru na Gọvanọ Peter Mba enweghị ikike ọbụla ịmanye onye ọbụla ka o mepee ụlọahịa ya maọbụ mechie ya ụbọchị ọbụla masịrị ya.

Felix kwuru na ndị ahụ kwesịrị ịbịakọta ọnụ gbaa gọọmentị Enugwu Steeti akwụkwọ n'ụlọ omeiwu ukwu gọọmentị etiti.

"Ọ bụrụ na ha gaa n'ụlọikpe steeti, ha nwereike ha agaghị enweta ikpe ziri ezi n'ihi na ụlọikpe steeti niile dị n'okpuru gọvanọ, mana ha gaa n'ụlọikpe gọọmentị etiti, ọkaikpe ma ihe ọ na-eme ga-enye iwu ka gọọmentị hapụ ndị niile ha mechiri ụlọahịa ha, maka na onweghị ikike ọbụla ime ihe dị etu ahụ," Ọkaiwu Felix Jonathan kwuru.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara nke a na soshal midia

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ụfọdụ ndị mmadụ na soshal midia katọrọ aka ike nke gọọmentị Enugwu ji agbaso ịkwụsị ọnọdụ 'sit-at-home' na steeti ahụ.

Ọtụtụ n'ime ha kwuru na aka ike gọọmentị emeela ọnọdụ dịbu njọ ka ọ kawanye njọ dịka ndị uweoji gbagburu otu onye ahịa n'ihi ngagharịiwe.

Frank Nweke Jr, onye zọrọ ọkwa gọvanọ Engwu steeti dere n'akara Twitter ya na "iwulite ntụkwasịobi ndị mmadụ n'ebe nchekwa dị abụghị ihe a ga-eji aka ike mee".

Ọ gwara gọọmentị Enugwu ka ha "lebagharịa anya n'usoro ha na-agbaso iji kwụsị ọnọdụ 'sit-at-home', ma hụ na ọdịmma ndị mmadụ bụ ihe kacha mkpa".

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2