Hon. Nelson Nnachebem: Etu ndị ikwu na ibe ya si mee ngagharịiwe maka ogbugbu ya
Otu jikọrọ ndị nnọchite anya wọọdụ Eha-Alumona n’okpuru ọchịchị Nsukka bụ ebe Hon. Nelson Nnachebem (Ofunwa) nọ na-anọchite dịka ‘Councillor’ n’ Enugwu steeti etiela mkpu maka ogbugbu e gburu onye otu ha.
Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ gbagburu nwaamadị a na be ya bụ Eha-Alumona n’izuụka olemaole gara aga.
Ndị otu ‘Councillor’ ahụ dị mmadụ 260 yichaa uwe ikwa ozu na-acha ojii ojii were ọkọlọtọ ma akwụkwọ ndụ ndụ mee ngagharịiwe n’ogige ama ọgbakọ Okpara Square, Enugu steeti iji gosi etu obi dị ha maka ọnwụ onye otu ha.
Onyeisi ha bụ Nnamdi Odoh rịọrọ gọọmentị na ndị uweojii ka ha ghara ịda mba n’ọrụ nkwalite nchekwa kama ka ha gbaa mbọ chọpụta ndị gburu nwaamadị Nnachebem.
Mmadụ abụọ ndị otu ahụ bụ Hon Sam Udeigwe na Ceceilia Ekwe kọwara na Maazị Ofunwa lara mmụọ dịka onye na-achọkarị udo ma nwekwaa obi inyere mmadụ ibe ya aka.
Ndị uweojii Enugu steeti kọwara na anwụchiela otu onye a na-enyo enyo n'okwu ọnwụ nwaamadị a dịka ha ka na-eme nnyocha imata ndị gburu ya kpọm kwem.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
'N'ihu m ka ndị ojiegbe nọ gbaa nwa m egbe gburu ya' - Nne Nnachebem
Nne mụrụ Nelson Nnachebem, bụ kanselọ na Nsukka, Enugwu steeti ndị ojiegbe gbagburu akwaala arịrị maka ọnwụ nwa ya.
Nwaanyị a kwuru na ọ nọ n'ihu ụlọ ha n'abalị ụbọchị Sọnde 16 Julaị, 2023 na-eche ka nwa ya nwoke lọta mgbe ndị a bu ụgbọala bịa kwuchie n'ihu ụlọ ha.
O kwuru na mgbe nwa ya lọtara, na o kelere ndị ahụ ma jụọ ha kedụ ihe na-eme? Mana tupu ọ mara ihe na-eme, onye ọzọ bu ọgbatumtum bịa ebe ma gbaa nwa ya egbe.
Ngwa ngwa ahụ nwa ya gbapụrụ ọsọ mana ndị ahụ chụụrụ ya bụ ebe ha nọzi gbaa ya egbe nke gburu ya.

Ebe foto si, BBC Sport
Ndị 'councilor' Enugwu mere ngagharịiwe maka ogbugbu Nelson
Ndị 'councilor' Enugwu steeti mere ngagharịiwe maka ogbugbu e gburu Nelson, onye otu ha.
Ndị a kwuru na ọ bụ ihe obi mgbawa nye ha maka na Nelson bụ ezigbo mmadụ maara nke a na-eme.
Ha katọrọ ọnọdụ nchekwa ọjọọ dị n'obodo ma kpọọ oku ka kpara arụ a gbaa onwe ha n'anwụ.
Etu ndị ojiegbe si gbagbuo Nelson Nnachebem na Nsukka, Enugwu Steeti

Ebe foto si, Nelson Sylvester Nnacheta/Facebook
Akụkọ apụtala gbasara etụ ndị ekperima amaghị ndị ha bụ si gbagbuo otu nwa okorobịa aha ya bụ Nelson Sylvester Nnachebem, bụ 'councillor' na-anọchite anya mpaghara Eha-Alumona nke dị n'okpuru ọchịchị Nsukka, n'Enugwu Steeti.
Dịka akụkọ si kwuo, a gbagburu nwaamadị a n'obodo Umualoji n’abalị Sọnde, ụbọchị 17 nke ọnwa Julaị.
Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti abụ Daniel Ndukwe gbara ama na ha anwụchiela otu nwoke a na-enyo na aka ya dị n’ọnwụ nwaamadị a.
Ndukwe kwuru na ha na-ama ima imi n’ala ugbua inyochapụta ihe niile so ọnwụ ya nakwa ịnwụchi ndị e chee mere ya bụ ihe.
Ugbua, ụmụ nwaanyị na mpaghara Eha-Alumona emeela ngagharịiwe iji gosipụta mwute ha n'ọnwụ nwa ha nwoke.
Ụmụnwaanyị obodo a buuguru ngagharịiwe ha gaa ụlọọrụ ndị uweojii, ihu ụka katọlịk nọ obodo ahụ nakwa ụka St Stephens Anglịkan

Ndị ma ya na-ezipụta ozi arịrị na soshal midia dịka a na-agbara ya ezi ama.
Dkt Chinwe Diara bụ nwunye Archịbịshọp ụka St. Stephen Anglịkan ji anya mmeri akwa kọọrọ BBC na “Anyị sị ka ụmụnwaanyị mee ngagharịiwe na ya bụ ihe akarịala”
Diara onye duru ụmụnwaanyị obodo mere ngagharị a kọwara na ihe dị etu a na-arizị elu n’obodo ha ma na-ekwu na ha agagharị anabata ya.
“Kemgbe ọnwa Jenụwarị ka anyị na-anụ akụkụ oke mgbagbu na ogbugbu ndị mmadụ n’obodo anyị”
Onyeisiioche okpuruọchịchị Nsukka bụ Walter Ozioko onye bịara mgbaru na be Nnachebem katọrọ ihe a merenụ.

Cheta na naanị ọnwa atọ garala ka ndị ojeigbe bịara gbagbuo otu onye ọkwọ ọgba tum tum n’obodo ahụ.
Enweela ọtụtụ akụkọ banyere etu ndị ojiegbe siri nwaa igbagbu ụfọdụ ndị n’obodo ahụ gụnyere onyeisi ndị ntorobịa obodo ahụ onye lara na nta.
Ndị uweojii Enugu akọwaala na ha amalitela nnyocha n’okwu mgbagbu otu nwaamadị aha ya bụ Nelson Sylvester Nnacheta (Ofunwa) bụ onye nnọchiteanya mpaghara Eha-Alumona nke okpuruọchịchị Nsukka.
Etu e siri gbagbuo nwaamadị a kpọm kwem
Ndị agbataobi Nnachebem kwuru na otu ụgbọala wụbatara ogige ụlọ ya n’abalị Sọnde ebe elekere 10 mgbe o si njem na-alọta.
E kwuru na ndị ahụ kwara ya mgbọ dịka o si n’elu ọgba tum tum ebe ọ nọ wụba ime mpaghara ya mana e kwuru na ndị ahụ chụụrụ ya ọsọ dịka o bu apa mgbọ egbe n-agba ọsọ.
Nna ya kọwara n’ụtụtụ Mọnde a na oge a nọ na-achụ ya ọsọ, na ọ nwara kpọkuo ndị nche obodo mana ya bụ atụmatụ amịtaghị mkpụrụ, ọ nwara kpọkuo ndị uweojii mana tupu ha abịruo na ndị ahụ agbagbuo ya.
Akụkọ enweghi nchekwa so n'ihe na-echere akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa aka mgba nke afọ olemole.
Ọtụtụ ndị ojiegbe na-ebugharị ngwa ọgụ na-awakpo ndị mmadụ, egbe, atọrọ ma na-emekpe ndị mmadụ ahụ.












