Ihe NUJ kwuru maka nnwụchi onye otu ha dere maka akụkọ ‘sit at home’ n'Enugwu

Ebe foto si, Tour Buddy
Onyeisi otu jịkọrọ ndị ntaakụkọ bụ Nigeria Union of Journalists (NUJ) n’Enugu ekwuola na ha na-ekele ndị uweojii maka etu e siri tọhapụ onye otu ha e boro ebubo ịkesa akụkọ ‘sit at home’ nwereike ịkpata ọgbaghara na steeti ahụ.
Sam Udekwe kwuru: “Anyị na-ebunye kọmịshọna ndị uweojii ụkpa eleke maka etu ha siri hụ na onye ntaakụkọ a ehighi ụra n’ime ụlọ nga ndị uweojii n’ụbọchị Satọde”
Nke a na-abịa dịka akụkọ pụtara na ndị uweojii nwụchịrị ụfọdụ ndị ntaakụkọ nakwa otu onye ọrụ ngo maka etu ozi ha gbasara banyere mwakpo so iwu nọrọ n’ụlọ nwereike isi kpata ọgbaghara na steeti ahụ.
Akụkọ a e bipụtara n’ụbọchị Wenezde nkle izuụka gara aga bụ ụbọchị ọtụtụ akụkọ mwakpo pụtara na steeti ahụ, bu isi akụkọ “ọgbaghara nọ n’ime Enugu” bụ ihe kpatara nwụchi a.
Na nnchọpụta BBC mere, akpọghị ndị a oku maọbụ nye ha akwụkwọ ikike nwuchi tupu a bịa nwụchie ha nke kwesịrị ịbụ usoro nwụchi mmadụ n’iwu Naijirịa.

Ebe foto si, Kefellerstudios
Ihe anyị chọpụtara maka nnwụchi onye ntaakụkọ a n'Enugwu
- A nwụchi a n’ụbọchị Satọde abalị asatọ nke ọnwa Jụlaị 2023 n’ebe elekere abụọ nke ehihe n'ụlọ ya.
- Akpọghị ha oku ọbụla tupu anwụchie ha.
- Ọ bụ ụmụnwoke atọ na-enyighi uwe ndị uweojii mere nnwụchi a
- A kpụrụ ha ụlọikpe Majistretị dị n'Enugwu
- E mechara tọhapụ ha ka ha ka ha na onye akaebe ha debanyere akwụkwọ
- Etighi ndị a nwụchiri ihe, ataghị ha ahụhụ ọbụla, ọkọ akọghi ha ma ncha n'aka ndị uweojii

Otu onye ọkwa ya gbalitere na gọọmentị Enugwu steeti gwara BBC Igbo na aka gọọmentị steeti ahụ adịghị n'okwu nnwụchi ndị ntaakụkọ ọbụla, mana ha nụrụ ozi banyere ya.
Nke a na-abịa dịka akụkọ putara n'izuụka gara aga gbasara etu ndị ekperima na-amanye iwu 'sit-at-home' si wakpo mpaghara dị icheiche n'Enugwu steeti na-eyi ndị mmadụ egwu, dịka ha kwuru na iwe ha bụ maka njide gọọmentị Naịjirịa jidere Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob.
Ụfọdụ ndị ntaakụkọ a anwụchiri bụ ndị dere akụkọ gbasara mwakpo ndị ekperima ahụ, bụ nke gọọmentị Enugwu steeti kwuru na ọ bụ akụkọ ụgha dịka ha gọrọ agọ na enweghị mwakpo ọbụla mere n'Enugwu.
Ọ bụ eziokwu na ndị ojiegbe kpara mkpamkpa na mpaghara Enugwu?
BBC Igbo chọpụtara na ndị ojiegbe wakporo mpaghara dị icheiche n'Enugwu n'ezie, gbaa egbe aghara aghara, ma chụsaa ndị mmadụ.
Otu onye ntaakụkọ sị na anwụchiri ya gwakwara BBC Igbo na ihe e ji nwuchie ya bụ n'ihi etu o siri bipụta akụkọ maka ọnọdụ 'sit-at-home' nakwa ụdịrị nkọwa na okwu o ji bipụta akụkọ ahụ'.
Onye ntaakụkọ kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Satọdee ka ndị ọrụnchekwa jichiri ya tọhapụrụ ya.
Otu onye ọzọ ọnụ na-eru n'okwu n'Enugwu steeti gwakwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndị ọrụ nchekwa nwụchiri ụfọdụ ndị ntaakụkọ. Onye a kwuru na ya ma ndị ntaakụkọ olemole so na ndị a nwụchiri.
"Nke a bụ nnukwu ihe mwute nye steeti anyị, mana ama m na n'oge eteghị aka, ndị okenye Enugwu ga-etinye ọnụ n'okwu a," ka onye ahụ kwuru.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ebe foto si, Screengrab
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Cheta na Gọọmentị Enugwu steeti kwuru hoo haa n’izuụka gara aga na ha ga-achọpụta ndị na-ekesa akụkọ nwereike iyi ọha egwu maọbụ kpata ọgbaghara ma nye ha ntaramahụhụ dịịrị ha.
N'ụbọchị e duru ya n'iyi ọrụ dịka gọvanọ ọhụrụ Enugwu Steeti, Peter Mbah kwuru na ọchịchị ya agaghị anabata ndị mmadụ na steeti ahụ irube isi n'iwu mmachi mkpagharị nke otu.
Gọọmentị Enugu gwara BBC Igbo n’izu gara aga na ọtụtụ akụkọ ndị mmadụ wepụtara n’ụbọchị Wenezde, abalị ise nke ọnwa Jụlaị, banyere ọnọdụ ‘sit at home’, bụ akụkọ ụgha iji ndị mmadụ egwu ka ha ghara ịpụta ezi na steeti ahụ.
Akụkọ pụtara aghara aghara n’akụkụ Enugu na Wenezde ahụ banyere mwakpo na mmaja ndị pụtara ịga mkpa ha bụ nke a sị ndị mmanye ‘sit at home’ mere.
Iji saa ajụjụ banyere ihe onyonyo gosiri ebe ndị ojiegbe na-apịa ndị nkuzi na ụmụakwụkwọ prịamarị ụtalị maka ịpụta gaa akwụkwọ na mpaghara 'Enugu West', ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe gwara BBC Igbo na “enweghi ebe a na-akpọ ‘Enugu West’ na steeti a".
Ndukwe gara n'ihu kwuo na "ndị mmadụ na-ekesa akụkọ ihe na-emeghi eme. Ọ ga-amasị m ịhụ ebe a a na-akpọ Enugu West, ka anyị gaa mee nnyocha ebe ahụ”.
Ruo ugbua, o dobeghi anya kpọm kwem akụkụ steeti ahụ ihe a mere, mana e nwere mpaghara a na-akpọ ‘Enugu West Senatorial District’ bụ mpaghara ebe okpuruọchịchị Aniniri, Awgu, Ezeagu, Oji River na Udi dị.
Mana n'ụbọchị Satọdee, bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Julaị, ndị uweojii Enugwu Steeti wepụtara akwụkwọ ozi ma kwuo na ha gburu ndị ekperima anọ bụ ndị so na-eyi ndị mmaọ̄ụ egwu ma na-amanyekwa iwu 'sit-at-home'.

Agbanyeghi na gọọmentị steeti ahụ na-ekwu na ọtụtụ akụkọ mwakpo ndị bụ akụkọ ụgha, BBC Igbo chọpụtara site n'ajụjụ nakwa ozi ịgba ama n'ụbọchị Wenezde na ndị ojiegbe na-amanye ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ wakporo akụkụ Asata, Trans Ekulu, New Haven na ebe ndị ọzọ n'Enugwu Steeti.
Otu onye bi na mpaghara ahụ kwuru na ndị ojiegbe a wakporo ụlọakwụkwọ St. Michael Praịmarị dị n'Asata Enugwu steeti n'ụbọchị ahụ gbaa egbe aghara aghara ma chụsasịa ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi.
N’ozi gọọmentị Enugu zipụtara na ngwụcha izuụka a gara aga, o kwusiri ike na o na-agba mbọ ịhụ na iwu nọrọ n’ụlọ na steeti ahụ agaghị adị ire ma ncha.

Ebe foto si, CENTRE FOR MEMORIES
Gọvanọ Mbah nyere ndị ntaakụkọ ozi pụrụiche sị:
“Ndị ntaakụkọ kwesịrị ịgwa ndị be anyi na ndị a na etinye iwu sit-at-home achọghị ọdịmma Mazi Nnamdị Kanu maọbụ ntohapụ ya.”
“Ndị Igbo niile ji otu olu na akpọ ka atọhapụ Mazị Nnamdi Kalu, mụ onwe m agaala hụ onyeisiala maka ya”
“Mana ndị a na akpọ sit-at-home bụ ndị ohi na ndị ama”
Ọ gara n’ihu kwuo: “Ọbụghị ndị ohi na ndị omekome ga na-agwa anyị ihe anyị ga-eme n’Enugwu steeti.”
Dịka akụkọ mwakpo pụtakwara n’akụkụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ndị ọzọ, gụnyere Abia, Ebonyi na Imo steeti, ndị gọvanọ Steeti ise dị ahụ kwuru na ha amachiela ọnọdụ 'sit-at-home' kpam kpam.

Press Freedom: Gbasara ịta ndị ntaakụkọ ahụhụ na Naịjirịa
Otu jikọrọ ndị welitere isi n'ọrụ ntaakụkọ na Naịjirịa, a kpọrọ Nigerian Guild of Editors (NGE) kpọrọ oku na 2022 ka gọọmentị kwụsị mmegbu na mkpagbu ha na-akpagbu ndị ntaakụkọ na Naịjirịa.
N'akwụkwọ ozi si n'aka Mustapha Isah na Iyobosa Uwugiaren, bụ onyeisi na odeakwụkwọ otu NGE, ha kwuru na mkpagbu ndị ntaakụkọ akarịala na Naịjirịa.
"Ndị ntaakụkọ bụ mgbọrọgwụ siri ike n'ọchịchị onye kwuo uche ya."
"Ọ bụ ha bụ ikuku ndụ nye obodo ọbụla, nke mere o ji dị nnukwu mkpa ka gọọmentị etiti tinye aka ka ọrụ ntaakụkọ ghara ịghasa."

Ebe foto si, Screengrab
Ụlọọrọ na-ahụ maka nnwereonwe ndị ntaakụkọ ịgbasa ozi n’ụwa bụ RSF international kwuru n’afọ 2022 na-ekwu na mwakpo na mgbagbu ndị ntaakụkọ n’akụkụ ụwa dị iche iche.
Naịjirịa so na mba ebe ndị nnyocha ha gosiri na a nwụchiri na tụọ ụfọdụ ndị ntaakụkọ nga maka ọru ha.
Eritrea na Egypt bụ mba Afrịka ebe akacha tụọ ndị ntaakụkọ nga na 2022.
N'afọ olemole gara aga, akụkụ Naịjirịa dị iche iche akụkọ pụtara etu e siri nwụchie ndị ntaakụkọ, nye ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ ntaramahụhụ ịda nha nakwa kpagbu ụfọdụ ndị mgbasaozi na soshal midia maka ịbipụta akụkọ ndị gọọmentị chee metọrọ aha ha maọbụ ndị ha kpọrọ akụkọ ụgha.












