Peter Mbah: Ihe Ụlọikpe Kachasị kpebiri taa

Peter Mbah

Ebe foto si, Peter Mbah/Facebook

Ụlọikpe Kachasị ebiela ikpe ma kwuo na ọ bụ Peter Mbah nke PDP meriri na ntuliaka ọkwa Govanọ Enugwu e mere n'abalị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.

Na mkpebi nke ndị ọkaikpe ise nyere ụbọchị Fraide, ha kụpụrụ akwụkwọ nke onye feere otu 'Labour Party' ọkọlọtọ bụ Chijioke Edeoga gbara were agbagha mpụtara ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ntuliaka na Ụlọikpe Mkpegharị ekpeela ikpe ahụ ma nye Mba mmeri mana Eddeoga wegara ikpe ahụ Ụlọikpekachasị.

N'ọsịsa ya na mkpebi Ụlọikpe Kachasị, Mba kwuru dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu sị na mmeri ahụ bụ ''nkendị Enugwu".

“Ndi Enugu, ụnụ bụ ndị nwe mmeri n'ije iweta ikpe a"

" Ana m ekele ụnụ maka nkwado na ekpere ụnụ megide mbọ nile ịnapụ ihe ụnụ nyere anyị nke anyị agaghị echefu."

Forged NYSC Certificate: Peter Mba emeriela NYSC n'ụlọikpe
Governor Peter Mbah

Ebe foto si, Enugu Govt

Ụlọikpe Ukwu nke Abuja ekwuola na ngalaba na-ahụ maka ndị ji otu afọ efe ala nna ha bụ 'National Youth Service Corps' (NYSC),n'ịchafụ enwelighị ike gosi na Gọvanọị Enugwu steeti bụ Peter Mba kpụrụ asambodo adigboroja ụlọọrụ ahụ na-egosi na o ji otu afọ fee ala nna ya.

Mba kpụburu NYSC n'ụlọikpe na-ebo NYSC ebubo 'aghụghọ' nakwa 'ịtụ asị'.

Nke a na-eso ebubo nke Onyeisi NYSC bụ Yushua Dogara Ahmed boro na asambodo NYSC nke Mbah ji,bụghị ụlọọrụ NYSC nyere ya asambodo ahụ.

Na mkpebi o nyere ụbọchị Monde, ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ bụ Jọstis Inyang Ekwo, kwuru na ihe aka ebe e wetara n'ihu ya gosiri na Mbah sonyere n'atụmatụ iji otu afọ efe alala nna ma gosikwa na NYSC nyere ya asambodo oge o mechara.

Jọstis Ekwo katọrọ NYSC maka ikwu na asambodo Mba nyere Inec na ntuliaka gọvanọ afọ 2023 esighị ha n'aka nakwa ịgba ọnyụpa na iweta akwụkwọ gosiri na Mbah ferela ala nna ya n'ụlọikpe.

Ọkaikpe ahụ gara n'ihu nye NYSC ntuziaka ka ụlọọrụ ahụ kwụọ Mbah nde naira ise.

Forged certificate: Ụta dịịrị NYSC, ọ bụghị Peter Mbah - DSS
Peter Mbah

Ebe foto si, Getty Images/Peter Mbah

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ngalaba uweojii Naịjirịa zoro ezo bụ Department of State Security (DSS) akpụchapụla ebubo metụtara gọvanọ Peter Mbah nke Enugu steeti bụ nke sị na o ji asambodo ife ala Naịjirịa (NYSC) nke adịgboroja were zọọta ọkwa ahụ.

Ozi DSS na Wenezde nke onye nnọchịteanya ha bụ Yahaya Isa Mohammed binyereaka kọwara nke a n’ikpe mkpesa banyere mpụtara ntuliaka gọvanọ steeti ahụ na-aga n’ihu kemgbe e mechara ntuliaka steeti ahụ.

Dịka ụlọikpe nyere DSS iwu ịbịa mee nnyocha n’okwu a, ha kwuru na ha malitere inyocha akwụkwọ asambodo gọvanọ Mbah oge ọ wetere mkpesa maka okwu a n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Febụwarị 2023.

DSS kwuru na nnyocha ha gosiri na ụdịrị akara nọ n’asambodo Mbah bụ nke nọkwa n’asambodo ndị ogbo ya e nyere asambodo n’afọ ahụ - Nke a bụ ebubo dị iche na nke ụlọọrụ NYSC boro Mbah banyere asambodo ya.

Ụlọọrụ DSS gbarụrụ ihu na NYSC tufuru asambodo mbụ Mbah ma nye ya ọzọ bụ nke nwa mgbe nta ma kwukwa na ụlọọrụ NYSC enweghi ike ịchọpụta ndị nakwa onye site steeti ndị enyere asambodo bu akara A808297 ruo akara A808308.

Ha gara n’ihu kwu “ịhụ na NYSC enweghiike dobe ma nyochapụta akwụkwọ ha nke ọma giosiri na ha agaghị enweike nyochapụta asambodo bụ nke Peter Ndubuisi Mbah”.

“Ọ ga-abụ ihe na-ezighi ezi ma ụta dịrị Peter Ndubuisi Mbah ebe ọ bụ NYSC bụ na na-enweghiike dobe ma nyochapụta akwụkwọ ha nke ọma”.

Mohammed kwukwara na “Nnyocha anyị gosiri na malite na mbido, Mbah na NYSC nwere mkparịtaụka oge niile nke gosiri na enweghi ihe o mere nke NYSC ebinyeghi aka”

Ikpe a ka na-aga n'ihu dịka a na-eche ka ụlọikpe mee mkpebi ikpeazụ na ya.

Ndị akaebe ka na-apụta banyere mkpesa otu Labour Party mere banyere okwu a.

Peter Mbah na Onyeisi NYSC bụ Brig-Gen Yushua Dogara Ahmed

Ebe foto si, BBC/NYSC

Ụfọdụ ihe ndị ọzọ so ikpe a

Cheta na n'ụbọchị 23 Juun 2023, ọkaiwu na-ekpechitere Gọvanọ Peter Mbah nke Enugwu ọnụ ya n'ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka gọvanọ bụ Anthoni Ani (SAN), kwuru na ihe kpatara na onye ọ na-anọchite abịaghị zara ọnụ ya n'ụlọikpe na ụbọchị Fraịde bụ makana e nyeghị ya akwụkwọ akwụkwọ akpọmoku Bekee kpọrọ, "subpoena" etu o kwesịrị."

Mbah apụtaghị n'ụlọikpe ịzara ọnụ ya n'ikpe n'akwụkwọ a gbara na-agbagha mmeri na ntuliaka nke gbadoro ụkwụ n'ebubo na asambodo iji otu afọ efe ala nna o nyere ụlọọrụ Inec bụ nke adigboroja.

Okaiwu ya bụ Ani gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Fraide ka ya bụ ụlọikpe ntuliaka(Election Tribunal) nọchara n'Enugwu na ndị gbaara Peter Mbah akwụkwọ esoghi usoro iwu wepụtara a ga-eji nye onye ahụ akwụkwọ.

Ọ sịrị, "Iwu a bụ na ha ga-erube isi n'Ọrder 3, Rule 4 nke Ụlọikpe Ukwu nke Etiti(Federal High Court), nke nyere iwu ka e nye mmadụ Subpoena ya na akwụkwọ Form 1A."

Dịka ọkaiwuAni siri kwuo, "ha gara n'ihu were naani akwụkwọ ha kpọrọ akpọmoku nye ya, wee ghara itinye akwụkwọ ya na ya so nke ga-akọwa ihe kpatara ya bụ akwụkwọ akpomoku ụlọikpe."

"Akwụkwọ ahụ ga-enyekwara onye agbaara akwụkwọ aka ịkwadobe ịgọrọ onwe ya na ebubo eboro ya."

Ani kwusiri ike na ọ bụghị maka okwu inwe nchedo(immunity) mere Peter Mbah abịaghị ụlọikpe kama na ọ bụ na ndị gbara ya akwụkwọ enyeghị"subpoena" ka iwu si kwado.

Ọkaikpe Jọstis K.M Akano bugara ya bụ ikpe gaa analị 24 nke ọnwa Juun afọ a.

'Agwara m Peter Mbah na asambodo o ji abụghị nke ezigbo' - Onyeisi NYSC

Peter Mbah, ọkọlọtọ NYSC, na ọchịagha Yushua Dogara Ahmed

Ebe foto si, Peter Mbah/NYSC

Onyeisi ngala na-elekọta ndị ji otu afọ efe ala Naịjirịa a na-akpọ 'National Youth Service Corps' (NYSC), ekwuola na asambodo NYSC nke Peter Mbah ji, ebụghị nke ezigbo ya, ọ bụghịkwanụ ụlọọrụ NYSC nyere ya asambodo ahụ.

Ọchịagha Yusha'u Dogara Ahmed kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Arise TV n'ụbọchị Fraịde, dịka okwu ya bụ asambodo abanyela n'ụlọikpe.

Peter Mbah, bụ Gọvanọ ahọpụtara ọhụrụ ga-achị Enugwu steeti, gbara ndị ụlọ ọrụ NYSC akwụkwọ n'ụlọikpe dịka ọ na-ekwusi ike na ọ bụ ha nyere ya asambodo ahụ, bịazie ugbua na-agolahụ ya ma na-ekwu na ya bụ asambodo bụ adigboroja.

Mbah gbara ya bụ akwụkwọ ụbọchị Wenezde, bụ ụbọchị 17 nke ọnwa Eprel, dịka o kwuru ka NYSC na onye ji ọkwa 'Director corps certification' bụ Ibrahim Muhammad kwụọ ya ijeri naịra ikwu na asambodo nke NYSC nyere ya bụ adịgboroja.

Okwu ihe gbasara asambodo Peter Mbah na NYSC malitere oge a na azọ ndọrọndọrọ ọchịchị onye ga-abụ Gọvanọ na Febuwarị na Maachị 2023.

N'oge ahụ, ndị otu Labour Party' kpụpụrụ Peter Mbah ụlọikpe ma kwuo na asambodo NYSC ya abụghị nke oma ya.

Mazi Ibrahim Muhammadu bụ onye na enyocha akwụkwọ asambodo n'ụlọọrụ NYSC ziputara ozi na asambodo Peter Mbah ji esighi na aka NYSC.

Mana Mbah kọwara na asambodo ya nke nwere akara A808297 si n'aka NYSC dịka ha nyere ya asambodo ahụ n'ọnwa Jenuwarị afọ 2003.

Tupu ụbọchị ntuliaka, ikpe ahụ pụtara ọzọ n'ụlọikpe, ebe Labour pati na ndị ọzọ na ekwu ka INEC wepu aha Peter Mbah makana ọ kwuru okwu ụgha.

N'agbanyeghị ihe ndị a nile, Mazi Peter Mbah meriri na ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ n'agbanyeghị na ikpe ka na-aga n'ihu.

Ugbua ọ fọrọ nanị otu izuụka n'ụma ka e duo gọvanọ ọhụrụ n'iyi ọrụ, ya bụ okwu eselitekwala isi ọzọ.

Mazị Peter Mbah tinyere akwụkwọ n'ụlọikpe na-ekwu na NYSC na Ibrahim Muhammad kọwaa ihe ha ji tụọ asị na asambodo ha nyere ya bụ adịgboroja.

O kwuru na NYSC ga-akwụ ya ijeri nari iri abụọ maka imetọ aha ya ma kwaa ya emu.

Ihe NYSC kwuru

Yushua Dogara Ahmed

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Onyeisi NYSC bụ ọchịagha Yushua Dogara Ahmed

Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Arise TV, taa bụ Fraịde, onyeisi ngalaba NYSC bụ Ọchịagha Yusha'u Dogara Ahmed kwuru na n'ezie, asambodo ahụ Peter Mbah ji abụghị NYSC nyere ya.

Dogara kwuru sị, "Ha (Peter Mbah na ndị otu ya) bịakwutere anyị maka nnyocha, anyị wee gwa ha na asambodo a abụghị nke anyị."

"Kedu ka onye gụrụ akwụkwọ, gara mahadum ga-esi kwuo na asambodo e nyere ya bụ adigboroja? Ebee ka o si weta asambodo ahụ? Ọ bụ na ọ maghị usoro e si enweta asambodo NYSC?"

"Anaghị enweta asambodo n'okporoụzọ, maọbụ n'ime ụlọ gị, maọbụ n'ụlọ oriri na nkwari.

"Achọghị m ikwu nnukwu okwu banyere nke a. Gọvanọ ọhụrụ ahụ (Peter Mbah) bụ onye ọkaiwu, mụ onwe m abụghị onye ọkaiwu, mana ama m na asambodo ahụ abụghị NYSC nyere ya."

"Oge ọ bịakwutere m, akpọrọ m onyeisi na-ahụ maka inye asambodo na NYSC, anyị tulere asambodo ya ma gwa ya na nke ahụ o ji abụghị nke anyị.

"Egosiri m ya ụfọdụ ọmụmaatụ, mana ya onwe ya ghọọrọ ịga ụlọikpe, nsogbu adịghị. Ahụbeghị m akwụkwọ ikpe ọbụla, mgbe m hụrụ ya, aga m enye ọsịsa."