Okwu 'zoning' na etu o si metụta onye ga-abụ gọvanọ n'Enugu Steeti

Chimaroke Nnamani, Sullivan Chime, Ifeanyi Ugwuanyi, Facebook

Ebe foto si, Chimaroke Nnamani/Sullivan Chime/Ifeanyi Ugwuanyi/Facebook

Ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n'Enugwu steeti n'ụbọchị Satọde, Maachị 18, 2023, abọlitekwala okwu nkewa nke ọtụtụ na-ekwu dị na steeti ahụ.

Nke a na-abịa dịka Inec kwuru na e nwere nsogbu na mpụtara ntuliaka si n'okpuru ọchịchị abụọ - Nsukka na Nkanu East.

Cheta na Nsukka dị na mpaghara Ugwu nke Enugwu (Enugu North) ebe Nkanụ dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Enugwu (Enugu East).

Dịka a kwụsịrị ngụkọ ntuliaka n'Enugwu, ụfọdụ ụmụ okorobịa malitere ịgụ egwu na-asị na "onweghị mgbe ike Nsukka ga-akarị ike Nkanu".

Nke a mere ọtụtụ ji ajụ ihe kpatara nkewa dị otu a na ndọrọndọrọ ọchịchị n'Enugwu Steeti.

Ọchịchị Enugwu bụ onye were ibe ya ewere - Okwesilieze Nwodo

Na mkparịtaụka nke BBC Igbo na aka chịburu Enugwu Steeti bụ Okwesilieze Nwodo nwere n'oge gara aga, ọ kọwara na "okwu zoning bụ ihe ha (bụ ndị isi na PDP Enugwu Steeti) kwekọrịtara n'ọgbakọ oge Sullivan Chime na-achọ iritu n'ọkwa Gọvanọ n'afọ 2015.

Okwesilieze kọwara na onweghị ihe dịka 'zoning' oge nke Jim Nwobodo maọbụ oge Christian Onoh chịrị, maọbụ n'oge ya onwe ya bụ Nwodo chịrị Enugwu.

"Ọbụladị oge Chimaroke Nnamani malitere ọchịchị, anyị enweghị 'zoning'. Nnamani - onye si Enugwu East chịchara, ọchịchị wee dabara Sullivan Chime, onye Enugwu West, n'oge ahụ anyị enweghị zoning."

"Mana oge ọchịchị Sullivan na-achọ ịkwụsị, ọ kpọrọ anyị ọgbakọ ka anyị kpaa ebe a ga-esi họpụta onye ọzọ ga-achịnụ. Ọ bụ ebe ahụ ka e kpebiri na ebe ọ bụ na ndị East agaala, ndị West agaa, o kwesịrị ka ọchịchị banye n'aka ndị Nọt."

"Onye tụtara aro a bụ Dubem Onyia, onye kwadoro ya bụ C.O.C Egumgbe bụ onye kwadoro ya, ebe Sịnetọ Ben Collins Ndu kwadokwara ya."

"Ọ bụ otu a ka anyị niile si kwekọrịta ya. Kamgbe ahụ obodo anyị bụ Enugwu ajụọla oyi n'ihi nkwekọrịta a."

"Ebe ọ bụ na gọvanọ anyị ugbu bụ onye Enugwu Nọt, o kwesịrị na onye ga-anọchi ya ga-abụ onye East," Nwodo kọwara.

Cheta na nkwekọrịta a abụghị ndị Enugwu niile nwere ya kama ọ bụ naanị ndị nọ n'otu 'Peoples Democratic Party' (PDP), bụ pati nọ n'ọchịchị n'Enugwu kamgbe afọ 1999 Naịjirịa lọghachiri n'ọchịchị onye kwuo uche ya.

Etu okwu 'zoning' si metụta ntuliaka nke 2023

Peter Mba na Chijioke Edeoga

Ebe foto si, Peter Mba/Chijioke Edeoga/Facebook

Nkọwa foto, Peter Mba nke PDP si mpaghara Enugwu East, ebe Chijioke Edeoga nke LP si mpaghara Enugwu North
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ka ọ dị ugbua, mmadụ abụọ nọ n'ihu ndọrọndọrọ ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti bụ Peter mba nke PDP na Chijioke Edeoga nke Labour Pati.

Mba si na mpaghara Enugwu East, ebe Edeoga si na mpaghara Enugwu North, nke bụkwa ebe gọvanọ nọ ugbua bụ Ifeanyi Ugwuanyi si.

Ọtụtụ na-ekwu na o kwesịghị ka Edeoga bụrụ gọvanọ n'ihi na ya na Ugwuanyi si otu ebe, mana ndị ọzọ na-ekwu na Edeoga anọghị na pati PDP bụ ndị nwere nkwekọrịta zoning, maka na ọ bụghị pati niile so nwee nkwekọrịta ahụ.

Otu onye okwu ndọrọndọrọ ọchịchị Enugwu Steeti doro anya gwara BBC Igbo ọ bụ eziokwu na-Edeoga na-azọ ọkwa n'otu LP, mana ọ bụ onye PDP kamgbe.

"Edeoga anọọla n'ọkwa dị icheiche na gọọmentị Enugwu steeti na pati PDP, ya bụ na ọ ma nke ọma maka atụmatụ 'zoning'," onye ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru.

"Ọ bụ ya mere o ji pụọ banye 'Labour Pati' dịka ọ hụrụ na PDP agaghị enye ya ohere ịzọ ọkwa gọvanọ."

Mana ụfọdụ ndị ọzọ na-ekwu na ebe onye si ekwesịghị ịbụ ihe dị mkpa n'ịhọpụta ndị ọchịchị, kama ihe ka mkpa bụ ụdị mmadụ onye ahụ bụ, ihe ndị o merela na mbụ, nakwa ịma ma ọ ga-ewetanwu mmepe na ọganihu n'obodo.

Ka ihe si kwụrụ ugbua

Ndị na-eme ngagharịiwe n'Enugwu
Nkọwa foto, Ma ndị nkwado Peter Mba ma ndị nke Edeoga na-eme ngagharịiwe na-ekwu ka Inec nye ndị nke ha mmeri

Ka ọ dị ugbua otu ndị ntorobịa abụọ nọ na-eme ngagharịiwe na nso isi ụlọọrụ Inec n'Enuwgu n'ihi mpụtara ntuliaka ọkwa Gọvanọ Steeti ahụ.

Ndị nkwado Peter Mba na-ekwu ka Inec kpọpụta mpụtara ntuliaka dịka ọ dị ugbua, maọbụ kagbuo mpụtara nke okpuru ọchịchị Nsukka na nke Nkanu East, ma kpọọ ndị ọzọ.

Ebe ndị nkwado Chijoke Edeoga nke Labour Party na-ekwu ka Inec kagbuo mpụtara ntuliaka si mpaghara Nkanu East ma kpọpụta ndị ọzọ.

Inec n'onwe ha kwuru na ha na-enyocha ntuliaka e mere n'okpuru ọchịchị abụọ ahụ bụ Nsukka na Nkanu East iji mara ebe aka enwe si banye n'ofe.