Ike Ekweremadu: Ihe m gwara ya maka mpụta ịzọ Gọvanọ Enugwu Steeti – Okwesilieze Nwodo
Aka chịbụrụ Enugwu Steeti bụ Okwesilieze Nwodo akọwaala etu e si malite ibugharị ọkwa Gọvanọ Enugwu Steeti si n’otu mpaghara gaa na mpaghara ọzọ.
Nwodo nyere nkọwa a dịka okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ọkwa gọvanọ na-arị elu ugbua n’Enugwu steeti nakwa na mpaghara ala Igbo dị icheiche.
Ihe kacha bụrụ isi okwu gbasara ndọrọndọrọ nke ugbu bụ mpaghara ebe onye ga-abụ gọvanọ na 2023 kwesịrị isi pụta, a na-akpọ ‘Zoning’ na bekee.

Gịnị bụ ‘Zoning’?
Zoning bụ atụmatụ mbugharị ọkwa ọchịchị site n’otu mpaghara gaa mpaghara ọzọ.
Ọtụtụ na-ekwu na atụmatụ a dị mkpa maka udo, ịdịnotu, nakwa iji zeere ọgbaaghara.
Mana ọtụtụ ndị ọzọ na-ekwu na ọ ka mma ịhọpụta onye kacha mara ọrụ kama ịbugharị ọkwa ọchịchị ebugharị.
Ka ọ dị ugbua, otu n’ime ndị chọrọ iwere ọkwa gọvanọ Enugu bụ Ike Ekweremadu, onye bụ Sinetọ na-anọchị anya Enugwu West n’ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa.
Mana ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ mpaghara Enugwu East ka ọkwa Gọvanọ ruru na 2023.
Etu atụmatụ ‘Zoning’ si malite
Okwesilieze Nwodo kọwara na ọ bụ n’ọgbakọ e nwere n’obi gọọmentị n’oge gara aga ka ndị ọnụ na-eru n’okwu n’Enugwu Steeti nọrọ kwekọrịta na a ga na-ebugharị ọkwa Gọvanọ steeti ahụ ebugharị.
“E nwere mpaghara atọ n’Enugwu steeti,” Nwodo kọwara, “Enugwu East, Enugwu West na Enugu North.”
“Anyị kwekọrịtara na ọ bụrụ na ndị mpaghara ‘East’ chịcha, o rute ndị ‘West’. Ha chịchaa afọ asatọ o rute ndị North.”
“Ọtụtụ ndị okenye na ndị ọnụ na-eru n’okwu nọ n’ọgbakọ ebe e nwere nkwekọrịta a, onye ọbụla binyere aka n’akwụkwọ iji gosi na ha kwadoro ya.”
“Chimaroke Nnamani (chịrị n’afọ 1999 ruo 2007) bụ onye Enugwu East; ọ chịchaa hafee n’aka Sullivan Chime (2007 ruo 2015) onye Enugwu West; Chime mechaa hafee ọchịchị n’aka Ifeanyi Ugwuanyi onye nke nọ ya ugbua, onye Enugwu ‘North’.”
“Nke a pụtara na ọchịchị kwesịrị ịlaghachi n’aka ndị Enugwu ‘East’.”
Ihe m gwara Ekweremadu gbasara ‘zoning’
