A ga m eji “1st tenure” m gbanwee Enugwu n’ụdị pụrụ iche - Peter Mbah
Onye nwetara mmeri na pati PDP ịchị Enugwu steeti bụ Mazi Peter Mbah ezipula ozi ekene nye ndị Enugwu steeti maka ịtunyere ya aka n'akwụkwọ oge ntuliaka ka ọ bụrụ gọvanọ Enugwu steeti.
Mbah kọwapụtara obi ụtọ ya na mkparịtaụka ya na ndị ntakụkọ nwere n'Enugwu taata.
O kwuru na ebe izizi ya ga amalite ọrụ bụ site na ikewa okporo ụzọ Ugwogo-Nike ka ọ dị mkpị abụọ, irụpụta okporo ụgbọoloko nke ga-esi Udi gaa Awgu ma banye Nsukka.
O kwere okpuru ọchịchị iri na asaa enwere n'Enugwu nkwa na okporoụzọ ha ga a bụ tam tam oge adịghị anya.

Ebe foto si, Peter Ndubuisi Mbah/Facebook
Ọchịchị m agaghị enwe nkewa n'etiti Nkanu na Nsụkka

Ebe foto si, Peter Ndubuisi Mbah/Facebook
Peter Mbah dọrọ ndị ji maka ndọrọndọrọ ọchịchị Enugwu ebuta ọgbaagharị maka obodo onye si pụta aka na nti ka ha wepu aka enwe n'ofe.
O kwuru na esemokwu na ịkọ ọnụ niile pụtara na ntuliaka gọvanọ Enugwu ga abụ ihe edoziri edozi n'ihi na onye ọbụla bụ nwanne
Mbah kwuru na ihe gbasara mmiri, ọkụ na teknụzụ (IT) bụ ebe ndị ya ga eji ọkụ ọkụ mepee Enugwu.
Onye bụ Bar. Peter Ndubisi Mba

Ebe foto si, Peter Ndubuisi Mbah/facebook
Bar. Peter Ndubisi Mba bụ onye ọkaiwu ma bụrụ onye Owoh dị n'okpuru ọchịchị Nkanu East n'Enugwu Steeti.
Mba nwe ụlọọrụ Pinnacle Oil and Gas nke na-ere mmanụ agbịdị.
Ya bụ nwaamadị bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama n'Enugwu, n'ihi na o jibuola ọkwa dịka kọmishọna na-ahụ maka ego n'Enugwu ya nakwa "Chief of Staff" n'okpuru Gọvanọ Chimaroke Nnamani.










