Sit at home: Ndị ekperima anọ anyị na ha kwara mgbọ alaala mmụọ - Ndị uweojii Enugwu Steeti

Ụgbọala ndị omekome na-amanye nọọụlọ hapụrụ gbaa ọsọatara

Ebe foto si, Enugu Police

Ndị uwe ojii Enugwu sị na ha egbuola ụfọdụ ndị ekperima so eyi ndị mmadụ egwu na steeti ahụ ma na-amanye ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ.

Ha wepụtara ozi a n'ime abalị ụbọchị Fraịde, abalị asaa nke ọnwa Julai afọ 2023, dịka ha kwuburu na ha na ndị ekperima ahụ kwara mgbọ mana ha bu mgbọ egbe tụrụ ha gbaa ọsọ gbabaa n'ime ọhịa.

"Dịka ndị ọrụ anyị na-akpagharị n'ime ọhịa ahụ iji jide ndị ekperima a, anyị butere ozu mmadụ anọ n'ime ha," ka Ahmed Ammani bụ Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu kwuru n'akwụkwọ ozi ahị.

Ahmed Ammani kọwara na ọ bụ na isi ụtụtụ Fraịde ka ndị uweojii nke mpaghara Awkụnanaw wakporo ndị omekome ahụ ebe ha na-achọ ịnapụ mmadụ ụgbọala ha chọrọ iji gaa kpaa ike.

Ndị uweojii busoro ha agha ha onwe ha agbwakwa ndị uweojii egbe, mana ike nke ndị uweojii karịrị nke ha nke mere ha jiri gbaa ọsọ.

Mana ndị uwe ojii gbatara ha egbe nke ọma n’ihi na ụgbọala ahụ niile nakwa gburu gburu ebe ahụ bụ sọ sọ ọbara mmadụ.

Ihe ndị uwe ojii chọpụtara n’ụgbọala ahụ gụnyere nke mbụ, Egbe AK-47, mgbọ egbe iri na itolu, ọtụtụ ololo “petrol bomb”, otu Hammer, otu Plier, na otu Jack knife.

Ihe akaebe

Ebe foto si, Enugwu Police Command

Ihe ndị ọzọ ha hụrụ gụnyere, ọgwụ agwọrọ agwọ na ngwongwo ya, ekwentị atọ nakwa akwa Jacket.

Kọmishịọna Ammani nyere ndị ndị niile nwere ụlọ ọgwụ na gburu gburu One day, Gariki, Topland, Achara Layout nakwa Awkunanaw ka ha gwa ndị uwe ojii ma onwee onye ọbụla bu mgbọ egbe bịa n’ụlọ ọgwụ ha ka ha ghara ịda iwụ.

O kwuru na ha ewepụtala anya ọbara ọbara ịkwụsị ndị omekome a na amanye sit-at-home.

Cheta na ụbọchị wenesde ka Enugwu niile gbara ọsọ n’ihi iyi egwu ndị a na amanye sit-at-home na eyi ndị mmadụ.

A nwuchiela mmadụ 15 na- amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ n'Ebonyi

Ndị a nwuchiri maka ịmanye ndị mmadụ nọọ n'ụlọ n'Ebonyi

Ebe foto si, Heart Ekeledo

Ndị uweojii Ebonyi steeti anwuchiela mmadụ 15 gunyere nwaanyị ku nwa na- amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ abalị ise n'Ebonyi steeti.

Kọmishona ndị uweojii steeti ahụ bụ Faleye Olaleye,gwara ndị ntakụkọ o kpụtara ndi a na-enyo onyo n'ọha n'isiụlọrụ ndịuweojii n'Abakaliki ụbọchị Fraide sị na aka ndị a dị n'egbe akwara n'ebe dị iche iche nna steeti n'abalị ole na ole gara aga.

Ihe ndị a natara ndị anwuchiri maka ịmanye 'sit at home

Ebe foto si, Heart Ekeledo

Simon Ekpa bụ onye ndu alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha 'autopilot' nọ ma mba Finland manye nọrọnụlọ otu izuụka n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria.

Ndị a nwuchiri maka ịmanye ndị mmadụ nọọ n'ụlọ n'Ebonyi

Ebe foto si, Heart Ekeledo

Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti si kwuo, ihe ndị a natara ndị ọchọnganoko ahụ gụnyere uwe ndịagha, nwaọgụ dị iche iche, ọgwụ,ikwikwu dị ndụ, akara efere ụgbọala abụọ na ihe akaebe ndị ọzọ

Ikwuikwu na ọgwụ

Ebe foto si, Heart Ekeledo

Ndị a nwuchiri maka ịmanye ndị mmadụ nọọ n'ụlọ n'Ebonyi

Ebe foto si, Heart Ekeledo

Etu Enugu si tọgbọrọ chakoo taaata bụ Fraide
Enugwu

Ọtụtụ okporoụzọ tọgboo chakoo,ebe ọdọahịa mechiri na mpaghara dị iche iche n'Enugwu ụbọchị Fraide, abalị asaa nke ọnwa Juun afọ 2023, n'ihi egwu ndị omekome na-amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ.

Taata mere ya ụbọchi nke ise na oku nọrọnụlọ nke Simon Ekpa bụ onye ndu alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha 'autopilot' nọ ma mba Finland manye n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria.

Onye ntakụkọ anyị gagharịrị n'Enugwu kwuru na na Ogui Rd, Njemanze na Asata n’ehihie Fraide kwuru na ọ bụ mmadụ na ụgbọala ole na ole na-agagharị dịka ebe nile tọgbo chakoo.

Enugwu

Ndị ji egbe na nwaọgụ dị iche iche wakporo ma mmaja ndị pụtara ịga mkpa n’akụkụ Enugu steeti dị iche iche na mbido izụ a.

Enugwu

Nke a na-eme na-agbaghị na gọvanọ steeti ahụ bụ Peter Mbah machiri nọrọnụlọ ma sị ndị mmadụ gawa mkpa ha.

Ihe gọọmentị Enugu na-ekwu maka nchekwa steeti ahụ

Gọọmentị Enugu na-ebuso atụmatụ 'sit at home' agha na steeti ahụ kemgbe mbata gọvanọ Peter Mbah

Ebe foto si, Kefeller Studios

Nkọwa foto, Gọọmentị Enugu na-ebuso atụmatụ 'sit at home' agha na steeti ahụ kemgbe mbata gọvanọ Peter Mbah
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Gọọmentị Enugu na-ekwusiike na akụkọ ndị mmadụ wepụtara n’ụbọchị Wenezde abalị ise nke ọnwa Jụlaị banyere mmanye ‘sit at home’ bụ akụkọ nkonukọ iji yie ndị mmadụ egwu ka ha ghara ịga mkpa ha na steeti ahụ.

Akụkọ pụtara aghara aghara n’akụkụ Enugu banyere mwakpo na mmaja ndị pụtara ịga mkpa n’akụkụ Enugu steeti dị iche iche.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe n’ụbọchị Tọọzde gwara BBC Igbo na “enweghi ebe a na-akpọ ‘Enugu West’ na steeti a, ndị mmadụna-ekesa akụkọ ihe na-emeghi. Ọ ga-amasị ịhụ ebe a a na-akpọ Enugu West, ịga mee nnyocha ebe ahụ”.

Nke a so ajụjụ a jụrụ ya maka ihe onyonyo feghariri na soshal midia nke gosiri ụmụakwụkwọ prịmarị na ndị nkuzi ha ụfọdụ ndị nyere iwu ka ha dinara ala dịka a pịara ha ụtalị maka ịbịa ụlọakwụkwọ ha n’ụbọchị e hibere iwu ‘Sit at home’.

Olu ndị nọ n’ihe onyonyo kọwara na ya bụ ihe mere n’ụbọchị Wenezde, n’akụkụ ebe a sị bụ ‘Enugu West’.

Olu ndị kwuru okwu n'ihe onyonyo ahụ sị "Kedụ ihe mere unu jiri pụta taa? Unu anụghị na ehibere 'sit at home', anyị ga-eme unu ihe iji kuziere unu na ụbọchị ọbụla e tinyere iwu a, unu erubere ya isi. Anyị chọrọ ka obodo Bịafra dị mma."

Nwaanyị onye nkuzi nọ n'onyonyo ahụ kwuru dịka ọ nọ na-ebe akwa ma na-arịọ arịrịọ "Ha pụtara maka ule 'first school leaving certificate' biko, anyị ga-akwado Bịafra".

O dobeghi anya kpọm kwem akụkụ steeti ahụ ihe a mere, mana e nwere mpaghara a na-akpọ ‘Enugu West Senatorial District’ bụ mpaghara ebe okpuruọchịchị Aniniri, Awgu, Ezeagu, Oji River na Udi dị.

Ozi gọọmentị Enugu zipụtara nke ọkamụta Chidiebere Onyia binyereaka kwuru “anyị gara n’ihu na-ekwusiike na anyị agaghị anabata ‘sit at home’ na steeti a... Anyị ga-eji ikike iwu kwado mkpebi a”

“Ka ọha gaa n’ihu pụta na-aga mkpa ha na-atụghị egwu ọbụla... Gọọmentị anyị na ndị ọrụ nchekwa na-ama imi n’ala ijide ndị niile na-ekesa akụkọ ụgha ndị a.”

"Anyị ga-echewka ndụ na akụnụba ndị Enugu".

Ndị na-amanye iwu ịnọ n'ụlọ

Ndị mmanye 'sit at home' wakporo ụlọakwụkwọ dị n'Asata Enugwu steeti

BBC Igbo natara ọtụtụ ozi n'ụbọchị Wenezde na ndị ojiegbe na-amanye ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ (sit at home) wakporo akụkụ Asata, Trans Ekulu, New Haven na ebe ndị ọzọ n'Enugwu Steeti.

Otu onye bi na mpaghara ahụ kwuru na ndị ojiegbe a wakporo ụlọakwụkwọ St. Michael Praịmarị dị n'Asata Enugwu steeti n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde 5 Juun, 2023 ma malite ịgba egbe aghara aghara ma chụsasịa ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi.

Ebe ndị ọzọ ndị a wakporo gụnyere, Trans Ekulu, ụlọahịa dị na New Haven, ahịa Artisan, Coal Camp, Uwani nakwa ebe ndị ọzọ.

Mwakpo a na-abịa dịka Simon Ekpa bụ onyendu otu ngalaba Indigenous People of Biafra (Ipob) nyere iwu n'ụbọchị Juun 14, 2023 site n'akara Twitter ya, ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ ruo ụbọchị ise na steeti ndị dị n'Ọwụwa Anyanwu.

O kwuru na ọ bụ iji mee ka gọọmenti Naịjirịa tọhapụ onyendu ha bụ Nnamdi Kanu, e jichiri kamgbe ọnwa Juun afọ 2021 ma kwadoo maka ntuliaka nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'referendum'.

Ụlọakwụkwọ St. Michael dị n'Asata

Mgbe BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ Daniel Ndukwe, o kwuru na akụkọ ndị a bụ asị ọchị.

Mana onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'Enugwu kwuru na ọ hụrụ ebe ndị mmadụ na-agba ọsọ n'Asata n'ihi ụda egbe ndị na-amanye iwu ịnọ n'ụlọ na-agba.

O kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ gbara ọsọ merụchara ahụ. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ụgbọala na ụgbọelu helikọpta ndị ọrụ nchekwa na-akpagharị n'akụkụ Enugwu ugbua.

Nke a so akụkọ pụtara na ndị ojiegbe na-amanya ndị mmadụ iwu onye nọrọ n’ụlọ na steeti ahụ pụtara igosi ike ha.

Ụlọakwụkwọ St. Michaels dị n'Asata
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ St. Michaels dị n'Asata ebe a chụsara ụlọakwụkwọ

Cheta na gọvanọ ọhụrụ steeti ahụ bụ Peter Mbah kwuru na mmalite ọchịchị ya na ya agaghi anabata ndị mmadụ isonye iwu onye nọrọ n’ụlọ na steeti ahụ.

Gọọmentị steeti ahụ gara n’ihu maa ọkwa n’ụbọchị Tuzde 4 Juun, 2023 ka ụlọakwụkwọ, ụlọahịa nakwa ndị mmadụ ghara isonye ya bụ iwu dịka ha gwara ọha ka ha gaa mkpa ha na-atụghị ụjọ.

Gọọmentị steeti ahụ gara n'ihu wepụta ụgbọala ọhụrụ nye ndị uweojii steeti ahụ nke ha sị bụ “iji gosi mbọ ha na-agba n’ịchekwa ndụ na akụnaụba ndị Enugwu”.

Okporoụzọ dị n'Enugwu

A chụsara ndị na-azụ ahịa n'Ebonyi steeti

Ndị oji egbe na-amanye sit at home

Ebe foto si, Screen shot

N'ụbọchi Tuzde 4 Juun, 2023 ndị ojiegbe na-amanye iwu ịnọ n'ụlọ a wakporo ọtụtụ ebe dị n'Ebonyi steeti gụnyere ahịa Ishieke na Akaeze ma chụsasịa ndị na-azụ ahịa.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti bụ Onome Onovwakpoyeya kọwara na mwakpo ahụ mere n’ahia Ahiaofu, ahịa ndị dị n’Ishieke nakwa ahịa Akaeze “ataghị isi onye ọbụla”.

O kwuru na ndị uweojii wụchiri n'ahịa ndị ahụ ma buso ndị ojiegbe ahụ agha tụpụ ha agbapụ ọsọ ma sị na-agbasi mbọ ike ijide ndị mere mwakpo a.

A gbara ụgbọala ndị mmadụ ọkụ n'Aba

Ebe a gbara ọgbatumtum ndị mmadụ ọkụ n'Abia

N'otu aka ahụ ndị ọzọ na-amanye iwu ịnọ n’ụlọ a gbara ọtụtụ ụgbọala ndị mmadụ ọkụ n'Aba dị n'Abia Steeti n’ụbọchị Mọnde 3 Juun, 2023.

Anya hụrụ ka o si mee gwara BBC Igbo na ọ hụrụ ka ndị ekperima a gbara otu ụgbọala ọkụ n'okporoụzọ jikọrọ 'Ngwa road' na 'Port Harcourt road, Ngwa Road na Asa Road nakwa Cemetery road', n'elekere ise na ọkara nke ụtụtụ.

Ndị agha si na ngalaba 144 Battalion malitere ịgagharị n'ogbe dị icheiche nke mere ndị ekperima ahụ ji gbaa ọsọ.

Mgbe BBC Igbo kpọrọ ndị uweojii Abia Steeti, ọnụ na-ekwuru ha bụ Maureen Chinaka kwuru na ọ natabeghi ozi banyere akụkọ a.

Ndụrịtaụka n'etiti Ifeanyi Ubah na Simon Ekpa

Ifeanyi Ubah kwuru na o hibela usoro nchekwa na mpaghara ọ na-anọchite n'Anambra steeti

Ebe foto si, Ifeanyi Ubah

Nkọwa foto, Ifeanyi Ubah kwuru na o hiwela usoro nchekwa na mpaghara Nnewi ọ na-annọchite anya ha

Na mbido izuụka a dịka akụkọ iwu ịnọ n’ụlọ a pụtara, Ifeanyi Ubah na-annọchite mpaghara Anambra South n’ụlọomeiwu gwara Ekpa na ndị Anambra agaghị esonyezi n'iwu ahụ maka “etu o si emetụta akụnaụba ndị mmadụ ọkachasị akụkụ Nnewi” so n’ebe ọ na-anọchịteanya ya ma gwa ọha ka ha kwụsị irubeisi n'iwu ahụ.

O kwukwara na o zighi ezi etu Ekpa si nọrọ na mba ọzọ na-eze ndụ ya ebe ọ na-akpọ oku ka ndị mmadụ nọrọ n’ụlọ n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Simon Ekpa onye bi na Finland anọrọla na soshal midia na-aṅụ ọṅụ maka etu ‘ndị mmadụ si erubeisi n'iwu a', ọ gara n’ịhụ rụọ Sịnetọ Ifeanyi Ubah aka maka etu o siri gwaa ya ka ọ “gaa na steeti ya na-eme ‘sit at home’ ma hapụ Anambra aka”.

Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra steeti na mmalite ọchịchị ya n'afọ 2021 kwuru na agaghịzị akwado iwu ịnọ n'ụlọ mana a ka na-erubeisi n'iwu ahụ n'ụfọdụ ebe kwa ụbọchị Mọnde ọbụla.

N'ọnwa Nọvemba 2022, Ekpa kpọkwara oku ka ndị mmadụ nọrọ n’ụlọ ruo abalị ise. Ndị mmanye iwu a wakporo ọtụtụ akụkụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa dịka ya bụ tigbuo zọgbuo tara isi ụfọdụ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ n’oge ahụ.

Etu ọnọdụ 'sit at home' siri gaa n'ihu na-eme n'akụkụ Nkpor nke Anambra steeti

Ebe foto si, LEVITHEGRAPHER

Nkọwa foto, Etu ọnọdụ 'sit at home' siri gaa n'ihu na-eme n'akụkụ Nkpor nke Anambra steeti

Ihe ị kwesịrị ima maka ‘Sit at home’

Okporoụzọ Enugwu

Ọnọdụ 'sit-at-home' bụ iwu ndị otu nnwereonwe a na-akpọ 'Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa niile, kamgbe ọnwa Ọgọst afọ 2021, iji gosi iwe ha maka etu gọọmentị Naịjirịa si jide onyendu ha bụ Mazi Nnamdi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya n'ike na Naịjirịa.

Ipob mechara kwuo na ha ewepụla iwu ahụ, mana ọtụtụ ndị ekperima na ndị ojiegbe malitere ịgagharị na mpaghara dị icheiche na-amanye iwu a, site na iwakpo ndị mmadụ, na-agba ụgbọala ọkụ, na-awakpo ndị ọrụ gọọmentị, ụlọọrụ gọọmentị, ndị ọrụ nchekwa ma na-egbukwa ụfọdụ ndị mmadụ bụ ndị pụtara ịga ahịa, mkpa ha maọbụ ọrụ n'ụbọchị Mọnde ọbụla.

Kamgbe ahụ, ụbọchị Mọnde bụzi ụbọchị ‘ezumike’ nke gọọmentị etinyeghi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ maka na ụjọ anaghị ekwe ndị mmadụ pụta iro.