FAFT :Nani ndị na-etinye ego n'ihe megidere iwu na Cameroon,Vietnam na Croatia ka iwu CBN a ga-amapụ obi- Ndị ọkachamara

Ebe foto si, Boniface Chizeaa/Getty/Uju Ogubunka
Ndị ọkachamara n'ihe gbasaara ego na ụlọakụ ekwuola na atụmatụ inyocha n'ụzọ pụrụ iche n'ego si Cameroon, Vietnam na Croatia abata Naijiria maọbụ nke si Naijiria aga mba ndị a gosiri na o nwere ihe mere ede ji bee nwịị.
Ha rụtụrụ aka na o nwere ike ịbụ ndị na-etinye aka maọbụ ego ha n'azụmahịa adịghị ọcha dịka ibu ọịgwụike, ịsa ego(nke Bekee kpọrọ, 'money laundering' na itinye ego ịkwado iyi ndụ egwu na-arị elu na mba ndị a nke kpalitere atụmatụ ahụ.
Otu onye n'ime ha bụ Uju Ogubunka, onyeisi otu jọrọ ndị ahịa ụlọakụ na Naijiria'Bank Customers Association of Nigeria' kọwara na tupu e nye ụdị ntuziaka, ndịisi ụlọakụ ahụla "ụdị (nnukwu) ego si mba ndị a maọbụ na na ego adịghị ọcha na-arị elu nke mere ha jị chọọ ịdọ ụlọakụ aka na ntị ka ha chakesie anya ike n'ego si mba ndị a maọbụ ego na-aga ebe ndị a."
"Ọzọ, Ikekwe usoro nnyocha n'obodo ndị ahụ esighị ike, ha anaghị etinye uchu na-inyo ego na-abata mba ha nke nwere ike ịrapụta ụlọakkụ Naijiria."
N'otu aka ahụ, Boniface Chizea bụkwa onye ọkacharamara n'okwu ego sịrị,"Onye ọbụla ji ego achụ ego na-etinye aka n'ihe kwụ atọ enweghị nsogbu ọbụla e wezuga obere igbu oge."
'Ọ bụ iji gbochie ohere ndị agha nnupusisi Kamerun inweta nkwado ego maọbụ ngwaagha '
Otu nwaafọ Kamerun bi Naijiria arụtụla aka na ntuziaka nke ụlọakụ CBN nyere ụlọakụ ka ha tinyesie anya ike inyo ego si Naijiria aba mba Kamerun, Vietnam na Croatia mba maọbụ apụta nwere ike imetụta ndọrọndọrọ ọchịchị.
Nwaamadị ahụ achọghị ịkpọ aha ya kwuru na iwu ahụ ga-egbochie nkwado ego na ngwaagha site na Naijiria nye ndị na-alụ ọgụ na Kamerun kemgbe afọ anọ gara aga..
Ọ sịrị " Ihe Ụlọakụ Etiti bụ 'Central Bank' mere agbagwojughị m anya."
" Ọ bụ iji ikwụsị ndị na-alụ ọgụ na Ndị̄ Anyanwụ Kamerun na Northern Camerroon ohere inweta ngwaagha maọbụ ego n'ihi ọgụ na-ada na Kameroon kemgbe ihe karịrị afọ anọ."
Ọgbaghara dị n'etiti Ndịda Anyanwụ Kamerun bụ ebe a na-asụ Bekee ndị nọ n'ụgwu mba bụ ebe a na-asụ Frenchị dịka ndị Ndịda chọrọ obodo nke ha a na-akpọ "Ambazonia".
Money laundering: Gịnị mere CBN ji nye ndị ụlọakụ iwu inyo ego si Cameroon,Vietnam na Croatia abata?

Ebe foto si, Getty images/AP
Ụlọakụ Etiti bụ 'Central Bank of Nigeria' (CBN) agwala ụlọakụ ọbụla dị na Naijiria ka ha tinye anya na mmiri were na-enyocha ego na azụmahia si mba Cameroon, Croatia na Vietnam iji nyọpụta ndị na-asa ego, ndị na-etinye ego iji kwado iyi ndụ egwu nakwa itinye ego nrụpụta maọbụ nkesa ngwa agha nuklia,kemikal na nke dị ndu.
N'akwụkwọ ozi nwere akara FPR/AML/PUB/BOF/001/029, nke onyeisi na-ahụ maka iwu metụtara okwu ego n'ụlọakụ CBN bụ Mr Chibuzo Efobi binyere akara ma wepụta ụbọchị Tọzde kwuru sị, na nke a so na mkpebi nke otu 'Financial Action Task Force' FAFT) nwere n'ọgbakọ ha na nsonso a.
Otu 'Financial Action Task Force' bụ otu mba ụwa na-ahụ maka itinye atụmatụ nakwa usoro iji gbochie isa ego, iyi ndụ egwu nakwa itinye ego na ịrụ ngwa agha nuklia , nke kemikal maọbụ ndụ (nuclear, chemical or biological weapons.)

Ebe foto si, CBN
“Anya ụlọakụ na ụlọ ego ndị ọzọ rue na mpụtara ọgbakọ nke otu "Financial Action Task Force" nwere n'abalị 21 rue abalị 23 nke ọnwa Juun afọ 2023 nakwa ntinye e tinyere Cameroon, Croatia na Vietnam n'aha ebe ndị 'a ga-elesi anya ike'."
“Ọzọ, aha mba Korea, Iran na Myanmar ka nọkwa n'aakwụkwọ obodo ndị a 'kachasị elesi anya ike'.
“Ụlọakụ mụrụ anya maka nsogbu nwere ike ịdapụta dịka ndị mmadụ na-achọ ụzọ, ịgba iwu a mgba okpuru iji chekwa usoro nhazi ego na mbaụwa."
Cheta na n'ọnwa Febụwarị afọ 2023, Naijiria dabanyere n'akwụkwọ mba ndị FAFT na-enyo enyo.













