Diphtheria outbreak: Mmadụ 798 ebutela ọrịa a na steeti asatọ na Naịjirịa - NCDC

Diphteria

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọọrụ mgbochi ọrịa na-efe efe bụ 'National Centre for Disease Control' ekwuola na ha ma maka nwatakịrị dị afọ anọ nwụrụ n'ụlọọgwụ n'Abuja n'ihi ọrịa Diphteria n'ime ọnwa Jun a.

Ifedayo Adetifa bụ onyeisi NCDC kwuru nke a n'ime akwụkwọ ozi o zipụrụ n'ụbọchị Tọzde, bụ ụbọchị nke isii nke ọnwa Jun afọ 2023.

O kwuru na kamgbe ọnwa Disemba afọ 2022, enweela mfesa ọrịa Diphteria ugboro ugboro na Naịjirịa na steeti asatọ ndị a: Kano, Legọs, Yobe. Kastịna, Cross River, Kaduna na Osun.

N'ime oge a, ọnụọgụgụ ndị buterela ya bụ ọrịa bụ 798 ebe mmadụ 80 ka ya bụ ọrịa gburula. nke bụ pasentị iri n'ime ndị niile butere ọrịa ahụ.

Dịka Ifedayo si kwuo, Diphteria bụ ọrịa e nwere ike iji ọgwụ mgbochi (vaccine) gbochie, mana ọ bụ ihe mwute na ọtụtụ ndị butere ọrịa anataghị ya bụ ọgwụ mgbochi n'agbanyeghi na ọ dị ọnụ ala ma dịkwa n'ọtụtụ ụlọọgwụ na Naịjirịa.

Onye nwere ike ibute ọrịa Diphteria?

Diphteria

Ebe foto si, NCDC

Dịka NCDC si kọwaa, ndị ka nwee ohere ibute ọrịa Diptheria gụnnyere:

  • Ụmụaka nakwa okenye agbabeghị ọgwụ mgbochi diphteria.
  • Ndị bi n'ụlọ kpara mkpa ma nwee ọtụtụ ndị bi ya
  • Ndị bi n'ebe anaghị edebe ọcha.
  • Ndị ọrụ ahụike na ndị nọ nso ebe onye butere ọrịa a nọ

Ihe i kwesịrị maka ọrịa Diphteria

Onye ọrịa
  • Ọ bụ nje 'bacteria' a kpọrọ 'Corynebacterium' na-akpta ya
  • Ọ na emetụta imi, akpịrị, nakwa oge ụfọdụ, akpụkpọ ahụ ọnye ọ na-arịa.
  • Ọrịa 'diphteria na-amalite igosi onwe ya bido n'ụbọchị abụọ ruo ụbọchị iri mmadụ ji bute ya.
  • Ihe ụfọdụ e ji ama onye nwere ọrịa a bụ: ahụọkụ, azụzụ, ọnya akpịrị (sore throat), ụkwara, anya ọbara ọbara nakwa akpịrị ịza aza.

Etu ọrịa Diphteria si efesa

Ahụọkụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nnukwu ahụ ọkụ , ụkwara, ọnya akpịrị, bụ ụfọdụ ihe nrụtụ aka maka ọrịa a bụ 'diphteria'

Ọrịa diphteria na-esi onye bu ya fere onye ọzọ ma ọ bụrụ na:

  • Mmadụ na onye bu ya metụta
  • Ọ bụ asọ si n'ụkwara maọbụ uzere onye nwere ọrịa ahụ ka o si efe
  • Ị metụta akwa maọbụ ihe onye nwere ọrịa metụtara o nwere ike ife gị

Ozi ịdọ aka na ntị

NCDC dọrọ ndị nne na nna aka na ntị ka ha gbaa mbọ hụ na ha gbara ụmụ ha ọgwụ mgbochi ọrịa diphtheria ugboro atọ dịka ọ dị n'usoro agbamụ ụmụaka ọgwụ mgbochi nke Naijiria.

Ụlọọrụ ahụ dụkwara ndị ọrụ ahụike ọdụ ka ha kee ngwụcha ma bere ebrer enyo ọrịa ọbụla yiri 'diphteria'.

Onye ọ bụla na-arịa ahụ nwere njiri mara ọrịa 'diphteria gddopụ onwe ya iche ma wegara ndị ọrụ ahụike n'okpuru ọchịchị ya ozi maọbụ bekuo ụlọrụ ha.