Ihe nwere ike ime ka nwaanyị "lụọ nwaanyị" n'omenala Igbo

Ebe foto si, Getty Images
Nwaanyị ịlụ nwaanyị ibe ya abụghị ihe na-agba mmadụ gharịị n'omenala Igbo n'oge gboo.
Ọ bụ eziokwu na okwu alụmdi n'etiti ụmụnwaanyị abụọ na-ata arụ na ntị ugbua, mana n'oge gboo, ọ bụ ihe na-eme eme.
Mana ọ bụghịkwa etu ọ dị ugbua na mba ofesi dị iche iche nke bekee na-akpọ same-sex marriage ka ndị Igbo si eme nke ha n'oge gboo.
N'oge ahụ, tupu e kwuwe okwu nwaanyị ịga lụrụ nwaanyị, maọbụ ụmụnna ikwekọrịta ka a lụtara nwaanyị ọzọ nwaanyị, a ga-enwerịrị ihe kpatara ya.
Akụkọ a gbadoro ụkwụ na nnyocha nke ndị ọkachamara n'omenala Igbo mere, nakwa n'akụkọ nke ndị omenala Igbo doro anya kọọrọ BBC gbasara ọnọdụ a.
Ihe ndị nwereike ime ka nwaanyị lụwa nwaanyị ibe ya gụnyere:
Nwaanyị di ya nwụrụ ma ha amụtaghị nwa

Ebe foto si, Iwaria
Nze Duruagwu Ukaejuoha, onye ọdịnala na okpukperechi Igbo doro anya, gwara BBC Igbo na nwaanyị di ya nwụrụ na-amụtaghị nwa nwereike ịga lụta nwaanyị ọzọ, ka ọ mụta nwa n'aha di ya nwụrụ anwụ.
Duruagwu kwuru sị: "N'ọnọdu di otu a, nwaanyị ahụ ga-agakwuru ndị ezinụlọ di ya, ka ha soro ya gaa lụta nwaanyị onye ga-amụta nwa, ka aha di ya ghara ifu."

"Ọ bụrụ na alụbata nwaanyị ọhụrụ a, onye bụ di ya bụ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ. Ọ bụzi nwaanyị ahụ na-alụ ya ga-achọta onye ya na nwaanyị nke alụbatara alụbata ga na-enwe mmekọ iji mụta nwa. Mana onye ahụ ahụ ga-abụkwa onye si n'ime ezinụlọ ahụ pụta."
"Nke a bụ omenala Igbo."
Nwaanyị ya na di ya enweghị ike ịmụta nwa

Ebe foto si, Getty Images
Ọzọkwa yiri ya, dịka Duruagwu si kọwaa, ọ bụrụ na nwaanyị na di ya enweghị ike ịmụta nwa, ha abụọ nwere ike kwekọrịta ka nwaanyị ahụ gaa lụta nwaanyị ọzọ.
"Ọ bụrụ na e mezie ya emezie, nwaanyị nke abụọ ahụ ga-ebido mụwa nwa.
"Onye na-alụ nwaanyị nke abụọ ahụ bụ nwaanyị nke mbụ, na-agbanyeghị na di ya ka dị ndụ."
Nke a pụtara na otu ọkpụrụkpụ ihe nwere ike ime ka nwaanyị lụọ nwaanyị ibe ya bụ maka ịmụta nwa.
Nwaanyị e merela omenala ka ọ bụrụzie nwoke

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọkammụta Kenneth Chukwuemeka Nwoko kọwara nke a n'akwụkwọ nchọcha o dere gbasara ụmụnwaanyị ịlụ di n'ala Igbo.
Nwoko bụ onye nkuzi na ngalaba 'History and International Relations' n'ụlọakwụkwọ Redeemer's University dị na Mowe, Ogun Steeti.
N'omenala Igbo, ọ bụ nwa nwoke mmadụ na-anọchi aha nna ya, nwa nwaanyị enweghị ike ime nke a maka na ọ ga-alụ di zawa aha onye ọzọ na-abụghị nna ya.
Mana dịka omenala si dị, ọ bụrụ na nwoke amụtaghị nwa nwoke, ọ ga-ahọpụta otu n'ime ụmụ ya ndị nwaanyị ma meere ya omenala nke ga-eme ka "ọ bụrụzie nwoke".
"Ọ na-abụkarị nwa nwaanyị nke mbụ ka a na-emere omenala a, ọ ga-anọrọzi n'ezinụlọ ahụ (na-alụghị di) ma na-amụta ụmụ iji mee ka ezinụlọ ha ghara imechi," Nwoko kọwara.
"Nwaanyị dị otu a nwekwara ike iketa oke ala na osisi dị icheiche n'aka nna ya dịka o kwesịrị nwa nwoke."
Nwoko kọwara na ọ bụrụ na nwa nwaanyị ahụ chọọ, o nwereike ịga lụta nwaagbọghọ ọzọ, kwụọ ụgwọ isi ya, mee omenala niile e ji alụ nwaanyị, ma bụrụ di ya.
Mana n'oge a na-eme omenala alụmdinanwunye a, ọ bụ nwoke si n'ezinụlọ ahụ ga na-ekwuchitere nwaanyị ahụ na-achọ ịlụ nwaanyị.
Nwoko kọwakwara na ụmụ nwaanyị otu nwoke mụrụ nwereike ịgbakọ aka lụtara adanne ha nwaanyị, ma ọ bụrụ na nna ha nwụọ na-amụtaghị nwoke.
"A na-ahụkarị ụdị ihe dị otu a n'obodo Mbaise," Nwoko kwuru.
Nwaanyị a alụtara, ga-esi n'ụmụnna ahụ họrọ otu onye ya na ya ga na-enwe mmekọ iji mụtara nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwa.
Nwaanyị chiri echichi pụrụ iche

Na mpaghara ụfọdụ n'ala Igbo enwere echiche pụrụ iche nwaanyị ga-echi, ọ ga-alụ nwaanyị iji gosi na ọnọdụ ya agbanweela.
Mgbe ụfọdụ, onye dị otu a nwereike ịlụ ụmụnwaanyị abụọ.
Echichi dị otu a gụnyere "Ọmụ", nke bụ onye na-achị mpaghara obodo ya, ma na-elekọtakwa ahịa niile dị na mpaghara ahụ.
N'obodo Osumari (Osomala), Ahaba (Asaba), na Okpanam ka ụdị omenala a kacha pụta ihe.
Obi Martha Dunkwu, bụ Ọmụ nke Okpanam, gwara BBC Igbo na nke a bụ omenala.
"Ọmụ nwere ike ịlụ nwaanyị, ma họpụta nwoke ọ chọrọ ka ya na nwaanyị ahụ na-enwe mmekọ ma na-amụ ụmụaka.
"Onye nwe ụmụaka ahụ a mụtara bụ Ọmụ n'onwe ya, maka na ọ bụ Ọmụ kwụrụ ụgwọ isi nwaanyị ahụ.
"N'omenala Igbo, ihe e ji ama onye nwe nwa bụ onye kwụrụ ụgwọ isi nwaanyị mụrụ nwa, ọ bụghị DNA," ka Ọmụ Martha Dunkwu kwuru.
Dịka alụmdinanwunye n'etiti nwoke na nwaanyị si dị, nwaanyị na-alụ nwaanyị ibe ya bụ ya bụ nna ụmụaka ọbụla a mụrụ n'alụmdinanwunye ahụ, ọ bụghị nwoke tụnyere ime ụmụaka ahụ, Dkt Nwoko kọwara.
"Ọ bụ nwaanyị a lụrụ nwaanyị ibe ya ga na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka ahụ."
Nwaanyị lụrụ ibe ya, ha aga na-enwe mmekọ ahụ?
Nze Duruagwu Ukaejuoha kọwara na alụmdinanwunye n'etiti ụmụnwaanyị abụọ, n'omenala Igbo, apụtaghị na ha abụọ ga na-enwe mmekọ ahụ maọbụ aramara n'ụdị ọbụla. Mba!
"Ụmụnwaanyị abụọ inwe mmekọ, n'omenala Igbo, bụ nnukwu arụ. Ndị ọbụla mere ya ga-achụ aja pụrụ iche iji hichaa ala, maka na ha merụrụ ala," Duruagwu kwuru.
Ọkammụta Kenneth Nwoko kwukwara ihe yitere nke a.
O kwuru sị: "Nwaanyị ịlụ nwaanyị abụghị ihe ọhụrụ n'ala Igbo. Mana usoro nke a enweghị mmekọ ahụ ọbụla na-adị n'etiti 'di na nwunye' ahụ."
"Ọ bụ n'ụzọ dị otu a ka o ji pụọ iche na 'Lesbianism' nke bụ mmekọ dị n'etiti ụmụnwaanyị abụọ na-enwe mmekọ ahụ n'etiti onwe ha."














