New Igbo wife: Etu e si anabata nwaanyị a lụrụ ọhụrụ n'omenala Igbo

Ebe foto si, Screengrab
- Onye dere ya, Chioma Nkemdilim
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist, Igbo Service
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
N'ọdị nso a ka onyonyo fesara etu ụmụnwaanyị Umueri si nabata Rita Dominic dịka ya na di ya bụ Fidelis Anosike mechara emume ịgba nkwụ ha.
N'ezie, n'ọtụtụ obodo n'ala Igbo, a na-anabata nwaanyị a lụrụ ọhụrụ n'ụzọ pụrụ iche.
Nnabata a ga-eme ka obi ruo nwaanyị ọhụrụ ahụ na ndị ezinụlọ ya ala n'ihi na ezinụlọ nwa ha banyere ji obi ọcha nabata ya.
Tupu a lụọ nwaanyị n'omenala Igbo, e nwere ihe dị iche iche a na-eme, nke gụnyere:
Ịjụ ese: Ọ bụghị naanị ndị chọrọ ịlụ onwe ha ga-ekwekọrịta ịlụ, ndị be nwoke na nke nwaanyị ga-ekwetakwa ma ụmụ ha a ga-alụ onwe ha.
Ọ bụkwa n'oge a ka a ga-eleba anya ebe nwoke na nwaanyị ahụ si, marakwa ma ndị be ha a bụ ezigbo mmadụ, maọbụ e nwere etu ọbụla ha siri bụ nwanne.
Maka n'ala Igbo, nwanne na nwanne anaghị alụ onwe ha, ọ bụ arụ.
Ụgwọ isi nwaanyị: N'ụfọdụ ebe, ego a na-akwụ n'isi nwaanyị dị oke ọnụ ahịa, mana n'ụfọdụ ebe, ọ dịghị etu ahụ.
Mana a na-akwụ ụgwọ n'isi nwaanyị maka etu be ndị nke nwaanyị siri zụlite ya ka ọ bụrụ ezigbo mmadụ dị mma ịlụ alụ.

Ebe foto si, Teyannasecret/Instagram
Ihe ndị ọzọ bụ: ịgba nkwụ, idu ụlọ, ịmata ụlọ di, dgz.
Mana ihe ọzọ dị mkpa, bụ nke ọtụtụ mmadụ amaghị maka ya bụ etu e si anabata nwunye ọhụrụ ahụ na be di ya.
Ọkammụta Chigozie Nnabuihe (Department of Linguistics, African and Asian Studies n'University of Lagos) kwuru na ịnabata nwunye ọhụrụ bụ omenaala, ọbụghị nso ala.
Kedụ etu e si anabata nwunye ọhụrụ?

Ebe foto si, Clarisbay/Instagram
BBC Igbo jụrụ Ọkammụta Chiagozie Nnabuihe, onye bụ ọkachamara n'asụsụ nakwa ọdịnala Igbo, bịakwa bụrụ onye nkuzi asụsụ na omenala Igbo na Mahadum Legọs, ka ọ kọwaara anyị.
Nnabuihe kwuru sị na mgbe elu bụ ala ọsa, n'ebe ụfọdụ, ọ na-abụ na alụbata nwaanyị ohụrụ, ndị nne, ndị alụbatara n'ezi ahụ, na ụmụagbọghọ na-agbakọ anabata nwaanyị ọhụrụ a.
"Oge ahụ bụ oge a na-atụ anya na nwaanyị na-abịa na di amabeghi nwoke," Nnabuihe kwuru.
"Ka di na nwunye na-abanye n'ọnụ ụlọ ha, a na-akwawara ha akwa ọcha."
"Ha bilie n'ụtụtụ, a ga-ele akwa ọcha ahụ, a hụ ọbara na ya, ha amara na ha nwetara ebele na-awaghi awa, nke pụtara na ha lụtara ezigbo nwaanyị."
"Mgbe ahụ ka egwu otito ga-amalite iji too nwaanyị ahụ."
"A na-ezighachiri ndị mụrụ nwaanyị ahụ ozi ito ha maka ịzụpụta ya. A na-akpọ ya 'nwaanyị di bịakwutere n'ụlọ'".
"Ọ bụrụ na ọ dịghị etu ahụ, ha ga-eziga ozi mkparị na nleda anya ma kwuo na nne na nna nwaanyị ahụ enweghi ike ijide maọbụ zụlite nwa ha n'ụzọ kwesịrị."

N'ọtụtụ ebe n'ala Igbo, ndị na-abịa eso bee akwa e ji edụla nwa agbọghọ na di bụ ụmụagbọghọ ibe ya ndị so ya too n'ebe a mụrụ ya.
Ọ bụ ha na-agụ egwu duru ya laa be di ya.
Mana ọ bụrụ na o nwere ndị nke ha bụ ụmụagbọghọ maọbụ ụmụọkpụ a mụrụ n'ezi ahụ bụ ndị ga-abịa nabata ya, nke bụ eziokwu bụ na ọ dị mkpa na a nabatara ya, ka ọ mara na ọlụlụ ka a lụrụ ya, ọ bụghị ntụtụta ka atụtụtara ya.
Cheta mgbe Rita Dominic bụ onye ejije a ma ama lụrụ nwoke si Anambra steetị, ụmụada gbakọrọ gụọrọ ya egwu, ọ gbara egwu bata n'ama di, gbara egwu banye n'ụlọ di ya.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ihe mere o jiri dị mkpa
Ihe mere ịnabata nwunye ọhụrụ jiri dị mkpa bụ ịgosi na a lụrụ ya, ọ bụghị nzụta ka azụtara ya.
Oge ahụ ka a na-egosi nwaanyị ụlọ ọhụrụ ya, ma gosi ya na a nabatara ya. O nwere ike isi ebe ahụ mara nwunye di ya ndị ọzọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










