Omu of Okpanam: Ị hụtụla Ezenwaanyị na-alụ nwaanyị ibe ya?
Ezenwaanyị Obi Martha Onyemachi Dunkwu bụ onye nọ n'ọkwa pụrụiche n'Ọkpanam malitere afọ narị asaa gara aga bụ nke na-elekọta ụmụnwaanyị ma bụrụkwa onye ji ọfọ agbara ha.
Onye nọ na-ọkwa dị otu a ka ha na-akpọ Ọmụ.
Ihe iwu kwuru bụ na nwaanyị ọbụla nọ n'ọkwa "Omu" agaghị alụ dị.
Ọ lụgodi dị, ọ ga-esi be di ya pụta nọrọ onwe ya.
Echicha ya echiche Omu, a ga na-ewezi onye ahụ ka nwoke nke bụ na ọ nwere ịwa ọji ma lụkwaa nwaanyị.
Ọrụ ya bụ ilekọta ụmụnwaanyị na ịkpere obodo ekpere.
Lee ihe ndị ọzọ dị omimi ọ gwara BBC Igbo maka ọkwa ya.
Ọrụ a si n'aka Chris Sanctus Okereke na Chiemela Peters Mgbeahuru.