Aga m anabata Nnamdi Kanu ka o biri n'obi ọchịchị Anambra Steeti ma a tọhapụ ya - Gọv. Soludo

Nnamdi Kanu na Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Soludo

Gọvanọ na-achị Anambra Steetị bụ Chukwuma Soludo ekwuola na ọ ga-anabata Nnamdi Kanu bụ onyendu Indigenous People of Biafra (IPOB) n'obi ọchịchị ya ma ọ bụrụ ma a tọhapụ ya.

O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ banyere oku ọ kpọrọ ka Onyeisiala Buhari tọhapụ Kanu na Channels TV n'ụbọchị Tọzde 19 Jenụwarị 2023.

A jụrụ ya ma edegarala ọkaiwu gọọmentị etiti akwụkwọ ka a tọhapụ Kanu, Soludo kwuru na o mebeghi nke a kama na oge na-adịghị anya na ha ga-anata akwụkwọ ozi ya.

Ọ sị na ọ na-ekele gọọmentị maka mbọ ha na-agba n'igbo nsogbu nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ kama na otu ihe ga-egbo nsogbu a kpam kpam bụ ma a tọhapụ Kanu maka na ọ dị mkpa n'okwu a kpụ n'ọnụ.

Ọ sị na ọ bụrụ mere o jiri na-akpọ oku a ma na-asị ka ndị ndu Igbo ndị ọzọ tinye ọnụ n'okwu ahụ.

Ọ sị na ọ di njere ịnabata Kanu n'obi ọchịchị gọọmentị Anambra steeti ka o biri ebe ahụ ruo mgbe okwu a ga-ebi.

Ihe ezinụlọ Nnamdi Kanu kwuru maka oku Soludo kpọrọ ka a tọhapụ ya

Ezinụlọ Mazi Nnamdi Kanu ekeleela gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo maka oku ọ kpọrọ ka gọọmentị etiti tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu.

Kanunta Kanu, bụ nwanne Nnamdi Kanu nke nta ji akara Twitter ya kwuo sị, "Ezinụlọ Kanu na-ekele".

Ihe nwanne Nnamdi Kanu dere gbasara oku Soludo kpọrọ ka a tọhapụ ya

Ebe foto si, Screengrab

BBC Igbo kpọtụụrụ Emmanuel Kanu, bụkwa nwanne Nnamdi Kanu nke nta, mana ọ zaghị ekwentị ya.

Emma Kanu bụ onye nke ọtụtụ mmadụ ma, maka na ọ bụ ya na-esokarị ndị ọkaiwu Mazi Kanu abịa ụlọikpe ụbọchị ọbụla e nwere ikpe gbasara Nnamdi Kanu.

O sokwa n'otu n'ime ndị ụlọikpe nyere ikike ị na-aga eleta Nnamdi kanu n'ụlọ mkpọrọ ndị uweojii nzuzo Naịjirịa bụ DSS, ebe e ji ya kamgbe ọnwa June afọ 2021.

Ihe Soludo kwuru maka ntọhapụ Nnamdi Kanu

Charles Soludo na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Anambra Govt/BBC

Onye ndụ otu ‘All Progressive Grand Alliance(APGA) ma bụrụkwa aka na-achị Anambara steeti bụ Ọkammụta Charles Soludo akpokuola Onyeisiala Muhammadụ Buhari ka ọ tọhapụ onye ndu Otu Ipob bu Nnamdi Kanu ka e were kpaa udoo ga-atọ atọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria.

Soludo kpọrọ oku a n’ọgbakọ achụmnta vootu onyeisiala nke pati ahụ mere n’Awka, bụ isi obodo Anambra steeti n'ụbọchị Satọde.

Nnamdi Kanu nọ na mkpọrọ DSS kemgbe ọnwa Juune afọ 2021 na- agbanyeghị mkpebi Ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja nyere ka a tọhapụ ya n' abalị 13 nke ọnwa Oktoba afọ 2022.

Charles Soludo

Ebe foto si, Anambra Government

N'ozi o ziri ndị otu pati ahụ na ndị na-akwado ha gbakọrọ, Soludo sịrị, "Anyị na-ekele Onyeisla Buhari maka akwammiri Naija nke abụọ."

"Anyị na-elekel Buharii maka aka ndị ọrụ nchekwa na-enye na-enye anyị na ibu agha megide nsogbu nchekwa."

"Mana anyị chọrọ ka ndị eji okwu ha agba izu n'okwu nchekwa kpaa ka udo na ndị anyị kwuru na otu onye dị mkpa isonye na nkata ịkpa udo ahụ bụ Nnamdi Kanu."

" Ya mere Ana m akpoku Gọọmentị Etiti ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu n'ihi na ọ dị anyị mkpa ka o sonye n'ọgbakọ ịkpa maka nsogbu nchekwa e nwere n'Ọwụwa Anyanwụ,"

"Tọhapụrụ m Nnamdi Kanu, ekwetara m ịgba akaebe nye ya ịkpọta ya ụbọchị ọbụla a chọrọ ya."

Soludo, onye kwuru na gọọmentị ya amalitela itinye mkpebi niile e nwere maka ịkwụsị nsogbu enweghị nchekwa n'Anambra Steeti, n'ọrụ.

"Mana ịtọhapụ Kanu dị oke mkpa maka iweta udo tọrọ atọ," Sludo kwuru.

O kwuru na nchekwa Ọwụwa Anyanwụ dị mkpa n'ihi na mpaghara ahụ so bụrụ Naijiria

I did not insult the tribe,