Ndị Igbo bi na Kano enweghị ụjọ ọbụla, obi ruru anyị ala - Eze ndị Igbo na Kano

Aha onyonyo, Ndị Igbo bi n'Ọwụwa Anyanwu enwere nchekwa karịa ndị nke bi na mpaghara Ugwu?
Ndị Igbo bi na Kano enweghị ụjọ ọbụla, obi ruru anyị ala - Eze ndị Igbo na Kano

Ụfọdụ oge, ndị Igbo bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria na-eche na ndị Igbo bi na mpaghara Ugwu, na-anọ n'ihe ize ndụ oge niile.

Nke a bụ maka ụfọdụ akụkọ gbasara mwakpo ndị ekperima bandits, maọbu ndị Boko Haram, maọbụ ọgbaaghara ihe gbasara okpukperechi nke a na-anụ na mpaghara Ugwu ugboro ugboro.

Mana nke bụ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị Igbo bi na Kano na-ekwu na ha enwghị ụjọ ọbụla n'ihi na obi zuru ha ike n'obodo ahụ n'agbanyeghị na ọ dị na mpaghara Ugwu.

Kano, nke bu otu nnukwu obodo mepere emepe na mpaghara Ugwu Naịjirịa, ọtụtụ ndị Igbo bi ebe ahụ ma na-eme ọfụma na ngalaba dị icheiche.

Ndị Igbo bi na Kano

Eze Boniface Ibekwe, bụ Eze ndị Igbo na Kano, gwara BBC Igbo na ọ karịala otu narị afọ ndị Igbo biara na Kano.

"E nwere ụfọdụ ndị Igbo dị afọ 80 maọbụ karịa, mana ọ bụ na Kano ebe a ka a mụrụ ha," Ibekwe kwuru.

Boniface Ibekwe
Nkọwa foto, Igwe Boniface Ibekwe bụ Eze ndị Igbo na Kano, o sokwa n'otu 'Kano Emirate Council'

O kwukwara na ndị Igbo azọkwaala ọkwa dị icheiche na gọọmenti Kano Steeti ma meri…

N'ọchịchị ọdịnala nke obodo Kano, Ibekwe kwukwara na ya onwe ya so n'otu 'Kano Emirates Council', ebe ọ na-anọchite anya ndị Igbo.

"Nke a pụtara na ha ma mkpa anyị dị nakwa uru anyị bụ ndị Igbo na-abara ha na steeti a bụ Kano," Ibekwe kwuru.

Ndị Igbo bu omenala ha bịa Kano - Igwe Ibekwe

Ndị egwu
Nkọwa foto, Ndị egwu ikpirikpeọgụ Ohafia na-agba egwu n'emume ọfala nke Igwe Boniface Ibekwe, Nọvemba 27, 2022

Igwe Boniface Ibekwe kọwara na ha bụ ndị Igbo bi na Kano echefughi omenala nakwa ọdịnala e ji mara ndị Igbo.

"Anyị na-akụziri ya ụmụ anyị, ka ha wee mata ebe ha si," ka o kwuru.

"Ọ bụ ya mere anyị ji ahazi asọmpi asụsụ Igbo, maọbụ ikuzi maka ịwa ọjị, maọbụ ịtụ ilu.

"Anyị na-emekwa omenala niile e ji mara ndị Igbo n'ala Kano ebe, maka omenala anyị agaghị anwụ.

"Anyị na-eti mmọnwụ dị icheiche, na-eme emume iri ji ọhụrụ, na-agba egwu ndị Igbo dị icheiche na Kano ebe a."

Igwe Ibekwe mere emume 'Ọfala' ya n'ụbọchị 27 nke ọnwa Nọvemba afọ 2022, iji cheta afọ iri na anọ kamgbe e chiri ya echichi dịka onyeisi omenala ndị Igbo na Kano Steeti.