Miss Universe 2022: Ihe mere m ji ahapụ Amerịka bịa turuugo ‘Miss Universe’ na Naịjirịa - Montana Onose

Aha onyonyo, Ọ ga-atụ ndị ụwa n'anyamgbe m ga-emeri asọmpị 'Miss Universe'.iss
Miss Universe 2022: Ihe mere m ji ahapụ Amerịka bịa turuugo ‘Miss Universe’ na Naịjirịa - Montana Onose
    • Onye dere ya, Makuochi Okafor, Chioma Nkemdilim Daramola & Okechukwu Omeire
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist, Senior Journalist & Video Journalist

Nwada Montana Onose Felix tuuru ugo ọkachamma na Naịjirịa a kpọrọ ‘Miss Universe’ nke afọ 2022 ekwuola ihe mere o jiri hapụ mba Amerịka bịa sonye n’emume ahụ.

Ọ sị na ọ bụ n’ihi ịhụnanya na mmasi o nwere n’ebe Naịjirịa nọ.

“etetere m n’ụra otu ụbọchị ma gwa nne m na m chọrọ ịlọta Naịjirịa bịa sonye n’asọmpi nwada kachasị mma na Naịjirịa.

Nwada a dị afọ iri abụọ na otu bụ onye Edo Steeti nke Naịjirịa.

Ọ sị na a mụrụ ya na Naịjirịa mana mgbe ọ dị afọ iri na itoolu ka nne na nna ya kwagara na mba Amerịka kpọrọ zie ya.

Montana sị na ọ bụ maka asọmpi ‘Most Beautiful Girl in Nigeria’ (MBGN) mere o jiri lọta Naịjirịa.

Ugbua ọ ga-anọchiteanya Naịjirịa n’asọmpi ‘Miss Universe’ nke ụwa n’ụbọchị iri na isii (16th) Jenụwarị, 2023.

Kirie ihe o kwuru.

Montana Onose, tuuruugbo 'Miss Universe' nke 2022

Ndị mere akụkọ a Makuochi Okafor, Chioma Nkemdilim Daramola, Okechukwu Omeire.