Rabiu Kwankwaso and Peter Obi: Ihe anyị chọpụtara gbasara onye nwereike ịbụ Osote Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi na Kwankwaso
Otu onye nwere agba na Labour party na-achịghí ka anyị kpọọ aha ya takwunyere BBC Igbo na ntị na-ezigbo mkparịtaụka na-aga n'etiti ndị otu Rabiu Kwankwaso na ndị otu Peter Obi maka ijikọ ọnụ na ndọrọndọrọ ọchịhị onyeisiala Naịjirịa nke 2023.
Njikọ ọnụ a dị oke mkpa maka mmadụ abụọ na-ehi odo na mpaghara ha abụọ dị icheiche.
A ma Peter Obi ama nke ukwu na ndịda anyanwụ otu e siri mara Rabiu Kwankwaso na ugwuawụsa.
Ndí mmadú na-ekwu na soshal Midia na ọ ga-ahịa otu n'ime ha ahụ ịnweta mmeri n'onwe ha maọbụrụ na ha ejikọghị aka ọnụ maka na ọtụtụ mmadụ amaghị Kwankwaso na ndịda dịka ka e sighị mara Peter Obi na Ugwuawụsa.
Ya mere ka ọtụtụ na-ekwu na njikọ aka ha dị oke mkpa.
Ya bụ nwaamadị Labour Party gbaara BBC Igbo ya bụ ma n'akọwa na, "e nwere ezigbo olile anya na ya bụ mkparịta ụka n'aga n'etiti mmadụ abụọ a. Ihe ji ugbua a bụ onye ga-arituru ibe ya".
Nwaamadị ahụ sịkwa na atụrụ anya mmadụ dịka Ibrahim Sekarau bụ onye si APC gafee NNPP ụbọchịa nwereịke ịzọpụta ya bụ ọnọdụ.
Nke a pụtara na Kwankwaso nwereike idunye Shakarau ka ọ bụrụ osote Peter Obi na ihe sikarịa ike.
Gịnị butere okwu a?
Ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ kemgbe otu izụụka ugbua ọkachasị na Soshal Midia bụ njịkọ ọnụ gbasara Peter Obi nke Labour Patị nakwa Rabui Kwankwaso nke New Nigeria Peoples Pati.
Ya bụ echiche ndị mmadụ kpụ ọkụ n'ọnụ maka etu ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa siri dewe ihu nke taa.
Kemgbe Peter Obi si People's Democratic Party gafeta Labour Party, ọ malitere iwu ewu, ọkachasị n'etiti ndị ntorobịa nke ndịda anyanwụ.
Ọtụtụ ndị ntorobia na-enweghị PVC ejirial maka ya sie ọnwụ na ha ga-agbata ya, agbanyeghị ọgbatauhie ya na ya so.
Nsogbu dịara Peter Obi, ọkachasị ugbua ọ fọrọ abalị olemaole ịhọpụta onye ga-abụ osote ya bụ ebee ka ọ ga-esi hụ nye nwere agba bụ ezigbo mmadụ n'ụgwụ awụsa ga-ekwe bụrụ osote ya.
Kedụ ụdị mmadụ ga-abụ Osote Peter Obi?
Onye nwere agba n'otu Labour Party a chọghị ka anyị kpọọ aha ya sị na Peter Obi n'achọ onye nwere ihe ndị a:
- Onye bụ onye ụka Alakụba bụ onye si na mpaghara Ugwu.
- Onye bụ ezigbo mmadụ kwenyesiri ike n'ọdịmma Naijirịa.
- Onye buwere Naịjirịa ụzọ na-abụghị onye jị ndọrọndọrọ ọchịchị achụ ego.
- Onye nwere agba ọtụtụ ndị ugwuawụsa tụkwasara obi ma na-esochi anya.
- Onye nwekwara ike ịgbọta ọtụtụ ndị mmadụ ga-eso ha ma tụnyere ha na-achọghị oke ego mmachị akpa.
N'otu aka ahụ, Rabiu Kwankwaso abụghị obere anụ n'Ugwuawụsa.

Ebe foto si, Rabiu Kwankwaso/Facebook
Onye bụ Rabiu Kwankwaso?
- A mụrụ Kwankwaso n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Okotoba n’afọ 1956. Ọ bụ onye ji ndọrọndọrọ ọchịchị mere akaọrụ.
- Ọ bụbu Gọvanọ Kano steeti site n’afọ 1999 ruo 2003. Sitekwa n’afọ 2011 ruo 2015.
- Ka ọ dachara na ntuliaka nke 2003, Obasanjo mere ya mịnịsta n’ahụ maka ndịagha site na’fọ 2003 ruo 2007.
- N’afọ 2011, o nwetere mmerị dịka Gọvanọ steeti Kanọ nke ugboro abụọ ya n’okpuru pati PDP.
- N’afọ 2013, ya na ndị gọvanọ ise ndị ọzọ a kpọrọ G-7 si na PDP banye na pati All Progressive Congress (APC).
- Na 2014, ya na Onyeisiala Muhammadụ Buhari kwakọrọ isi na ntuliaka ime ụlọ APC bụ ebe Buhari meriri ya.
- N'afọ 2015 o meriri dịka sịnetọ ga-anọchi anya Kano Central n'ụlọomeiwu bụ ebe ọ nọ ruo afọ 2019.
- Na 2018, ya na ndị sịnetọ iri na anọ ndị ọzọ hapụrụ APC ma laghachite PDP ebe ọ zọsara Atiku ọkwa onye ga-efe ọkọlọtọ ha na ntuliaka 2019 mana Atiku meriri ya.
- N'afọ 2022 ọ hapụrụ pati PDP ma gbakọta aka hiwe pati ọhụrụ bụ New Nigeria People’s Party (NNPP) bụ ndị o ji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa Onyeisiala ugbua.
- Kwankwaso gbara mgborogwu n'ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị na Kano nakwa ụfọdụ mpaghara Ugwu na Naịjirịa.
Ebe ọ gụru akwụkwọ
- Kwankwaso gụrụ akwụkwọ Praịmarị na Gwarzo Boarding Senior Primary School, Wudil Craft School nakwa Kano Technical College tupu ọ gawa Kaduna Polytechnic ebe ọ nwetere nzere National Diploma, nkwa Higher National Diploma.
- Ọ mechakwara gụọ akwụkwọ n’United Kingdom n’afọ 1982 ruo 1983 na Mahadum Middlesex Polytechnic; na Loughborough University of Technology ebe ọ nwetere nzere nke Masters dịka injinia gbasara ọrụ mmiri nkwa nzere dịka ọkammụta na Sharda University India, n’afọ 2022.









