Etu ndị ọkpaọchị soshal midia abụọ si rite ube ụtalị 20, nha N10,000 maka ịkparị Ganduje

Ebe foto si, Mubarak Unique Pikin/TikTok
Ụlọikpe Majistrate dị na Kano enyela iwu ka a pịa mmadụ abụọ na-eme ihe ịkpaọchị n'ọbaozi Tiktok ọnụ ụtarị iri abụọ, nye ha ịda nha puku naira iri nakwa ntaramahụhụ ịzachasị ogige ụlọikpe abalị 30 maka ebubo ịkparị Gọvanọ steeti ahụ bụ Abdullahi Ganduje, taa bụ Monde, abalị asaa nke ọnwa Novemba afọ 2022.
Ọkaikpe Aminu Gabari nọ n'isi ikpe ahụ nyere mmadụ abụọ a bụ Mubarak Muhammad na Nazifi Muhammad mkpebi ahụ n'ikpe a.
Anwụchiri ha abụọ n'izuụka gara aga maka ihe onyonyo ha zipụtara n'ọbaozi Tiktok nke a sị boro Ganduje ebubo nrụrụaka.
N'ikpe ahụ, ọkaiwu Gambari kwuru na ntaramahụhụ ahụ ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị ọzọ.
Ngwangwa e nyere ya bụ mkpebi, onye ọrụ ụlọikpe rachara ndị ọkpachi ahụ ube ụtarị iri abụọ,i riabụọ ma gwa ha ka ha kwụọ ego nha ahụ ozigbo ozigbo.
N'otu aka ahụ, nha ịza ogige ụlọikpe ahụ ga-amalite ụbọchị Tuzde.
Ọkaiwu gọọmentị bụ Ọkaiwu Wada Wada kwuru na mkpebi ụlọikpe ahụ mere juru ya afọ, si na ọ ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị ọzọ.
Ebe okwu a si malite

Cheta na a kpụrụ mmadụ abụọ ahụ oku n'ụlọikpe n'izuụka gara aga maka ebubo "ịkpa nkata imetọ aha" onye ọrụ gọọmentị.
Oge a gụpụtachara ebubo e boro ha, Ọkaikpe ji ikpe ahụ bụ Gabari nyere iwu ka e tinye ha n'ụlọmkpọrọ Kurmawa dị n'Kano rue abalị 7 nke ọnwa Novemba, afọ 2022.
N'ihe onyonyo ahụ ha wepụtara, mmadụ abụọ ahụ mere ihe ejiji nke gosiri otu n'ime ha ebe o gbanwere onwe dịka onye fechara ala nna ya na nsonso a ma boo ebubo na ndị mmadụ enweghị ntụkwasaobi na otu nwoke a kporo Ganduje nke ha kwuru na ejighị anya ahụ ala ndị mmadụ, na ọ hụ ya, o ree ya.









